Matthew 19 (BOICB)
1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan. 2 Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ. 3 Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?” 4 Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị. 5 Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. 6 Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.” 7 Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?” 8 Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ. 9 Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.” 10 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.” 11 Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya. 12 Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.” 13 Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba. 14 Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” 15 O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ. 16 Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 17 Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.” 18 Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?”Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. 19 Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’” 20 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” 21 Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” 22 Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya. 23 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. 24 Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 25 Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 26 Jisọs legidere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ.” 27 Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile soro gị, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?” 28 Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 29 Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. 30 Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”
In Other Versions
Matthew 19 in the ANGEFD
Matthew 19 in the ANTPNG2D
Matthew 19 in the AS21
Matthew 19 in the BAGH
Matthew 19 in the BBPNG
Matthew 19 in the BBT1E
Matthew 19 in the BDS
Matthew 19 in the BEV
Matthew 19 in the BHAD
Matthew 19 in the BIB
Matthew 19 in the BLPT
Matthew 19 in the BNT
Matthew 19 in the BNTABOOT
Matthew 19 in the BNTLV
Matthew 19 in the BOATCB
Matthew 19 in the BOATCB2
Matthew 19 in the BOBCV
Matthew 19 in the BOCNT
Matthew 19 in the BOECS
Matthew 19 in the BOGWICC
Matthew 19 in the BOHCB
Matthew 19 in the BOHCV
Matthew 19 in the BOHLNT
Matthew 19 in the BOHNTLTAL
Matthew 19 in the BOILNTAP
Matthew 19 in the BOITCV
Matthew 19 in the BOKCV
Matthew 19 in the BOKCV2
Matthew 19 in the BOKHWOG
Matthew 19 in the BOKSSV
Matthew 19 in the BOLCB
Matthew 19 in the BOLCB2
Matthew 19 in the BOMCV
Matthew 19 in the BONAV
Matthew 19 in the BONCB
Matthew 19 in the BONLT
Matthew 19 in the BONUT2
Matthew 19 in the BOPLNT
Matthew 19 in the BOSCB
Matthew 19 in the BOSNC
Matthew 19 in the BOTLNT
Matthew 19 in the BOVCB
Matthew 19 in the BOYCB
Matthew 19 in the BPBB
Matthew 19 in the BPH
Matthew 19 in the BSB
Matthew 19 in the CCB
Matthew 19 in the CUV
Matthew 19 in the CUVS
Matthew 19 in the DBT
Matthew 19 in the DGDNT
Matthew 19 in the DHNT
Matthew 19 in the DNT
Matthew 19 in the ELBE
Matthew 19 in the EMTV
Matthew 19 in the ESV
Matthew 19 in the FBV
Matthew 19 in the FEB
Matthew 19 in the GGMNT
Matthew 19 in the GNT
Matthew 19 in the HARY
Matthew 19 in the HNT
Matthew 19 in the IRVA
Matthew 19 in the IRVB
Matthew 19 in the IRVG
Matthew 19 in the IRVH
Matthew 19 in the IRVK
Matthew 19 in the IRVM
Matthew 19 in the IRVM2
Matthew 19 in the IRVO
Matthew 19 in the IRVP
Matthew 19 in the IRVT
Matthew 19 in the IRVT2
Matthew 19 in the IRVU
Matthew 19 in the ISVN
Matthew 19 in the JSNT
Matthew 19 in the KAPI
Matthew 19 in the KBT1ETNIK
Matthew 19 in the KBV
Matthew 19 in the KJV
Matthew 19 in the KNFD
Matthew 19 in the LBA
Matthew 19 in the LBLA
Matthew 19 in the LNT
Matthew 19 in the LSV
Matthew 19 in the MAAL
Matthew 19 in the MBV
Matthew 19 in the MBV2
Matthew 19 in the MHNT
Matthew 19 in the MKNFD
Matthew 19 in the MNG
Matthew 19 in the MNT
Matthew 19 in the MNT2
Matthew 19 in the MRS1T
Matthew 19 in the NAA
Matthew 19 in the NASB
Matthew 19 in the NBLA
Matthew 19 in the NBS
Matthew 19 in the NBVTP
Matthew 19 in the NET2
Matthew 19 in the NIV11
Matthew 19 in the NNT
Matthew 19 in the NNT2
Matthew 19 in the NNT3
Matthew 19 in the PDDPT
Matthew 19 in the PFNT
Matthew 19 in the RMNT
Matthew 19 in the SBIAS
Matthew 19 in the SBIBS
Matthew 19 in the SBIBS2
Matthew 19 in the SBICS
Matthew 19 in the SBIDS
Matthew 19 in the SBIGS
Matthew 19 in the SBIHS
Matthew 19 in the SBIIS
Matthew 19 in the SBIIS2
Matthew 19 in the SBIIS3
Matthew 19 in the SBIKS
Matthew 19 in the SBIKS2
Matthew 19 in the SBIMS
Matthew 19 in the SBIOS
Matthew 19 in the SBIPS
Matthew 19 in the SBISS
Matthew 19 in the SBITS
Matthew 19 in the SBITS2
Matthew 19 in the SBITS3
Matthew 19 in the SBITS4
Matthew 19 in the SBIUS
Matthew 19 in the SBIVS
Matthew 19 in the SBT
Matthew 19 in the SBT1E
Matthew 19 in the SCHL
Matthew 19 in the SNT
Matthew 19 in the SUSU
Matthew 19 in the SUSU2
Matthew 19 in the SYNO
Matthew 19 in the TBIAOTANT
Matthew 19 in the TBT1E
Matthew 19 in the TBT1E2
Matthew 19 in the TFTIP
Matthew 19 in the TFTU
Matthew 19 in the TGNTATF3T
Matthew 19 in the THAI
Matthew 19 in the TNFD
Matthew 19 in the TNT
Matthew 19 in the TNTIK
Matthew 19 in the TNTIL
Matthew 19 in the TNTIN
Matthew 19 in the TNTIP
Matthew 19 in the TNTIZ
Matthew 19 in the TOMA
Matthew 19 in the TTENT
Matthew 19 in the UBG
Matthew 19 in the UGV
Matthew 19 in the UGV2
Matthew 19 in the UGV3
Matthew 19 in the VBL
Matthew 19 in the VDCC
Matthew 19 in the YALU
Matthew 19 in the YAPE
Matthew 19 in the YBVTP
Matthew 19 in the ZBP