Mark 1 (BOICB)

1 Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. 2 Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,“Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,onye ga-edozi ụzọ gị.” 3 “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị,‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4 Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5 Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6 Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 7 O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8 Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.” 9 Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10 Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11 Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” 12 Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara. 13 Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi. 14 Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15 Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.” 16 Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ. 17 Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 18 Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya. 19 Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha. 20 Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya. 21 Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe. 22 Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu. 23 Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, 24 sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” 25 Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” 26 Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. 27 Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.” 28 Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili. 29 Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru. 30 Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya. 31 Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa. 32 Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha. 33 Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ. 34 Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ. 35 Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. 36 Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. 37 Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!” 38 Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.” 39 Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ. 40 Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 41 Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” 42 Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. 43 Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, 44 ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” 45 Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.

In Other Versions

Mark 1 in the ANGEFD

Mark 1 in the ANTPNG2D

Mark 1 in the AS21

Mark 1 in the BAGH

Mark 1 in the BBPNG

Mark 1 in the BBT1E

Mark 1 in the BDS

Mark 1 in the BEV

Mark 1 in the BHAD

Mark 1 in the BIB

Mark 1 in the BLPT

Mark 1 in the BNT

Mark 1 in the BNTABOOT

Mark 1 in the BNTLV

Mark 1 in the BOATCB

Mark 1 in the BOATCB2

Mark 1 in the BOBCV

Mark 1 in the BOCNT

Mark 1 in the BOECS

Mark 1 in the BOGWICC

Mark 1 in the BOHCB

Mark 1 in the BOHCV

Mark 1 in the BOHLNT

Mark 1 in the BOHNTLTAL

Mark 1 in the BOILNTAP

Mark 1 in the BOITCV

Mark 1 in the BOKCV

Mark 1 in the BOKCV2

Mark 1 in the BOKHWOG

Mark 1 in the BOKSSV

Mark 1 in the BOLCB

Mark 1 in the BOLCB2

Mark 1 in the BOMCV

Mark 1 in the BONAV

Mark 1 in the BONCB

Mark 1 in the BONLT

Mark 1 in the BONUT2

Mark 1 in the BOPLNT

Mark 1 in the BOSCB

Mark 1 in the BOSNC

Mark 1 in the BOTLNT

Mark 1 in the BOVCB

Mark 1 in the BOYCB

Mark 1 in the BPBB

Mark 1 in the BPH

Mark 1 in the BSB

Mark 1 in the CCB

Mark 1 in the CUV

Mark 1 in the CUVS

Mark 1 in the DBT

Mark 1 in the DGDNT

Mark 1 in the DHNT

Mark 1 in the DNT

Mark 1 in the ELBE

Mark 1 in the EMTV

Mark 1 in the ESV

Mark 1 in the FBV

Mark 1 in the FEB

Mark 1 in the GGMNT

Mark 1 in the GNT

Mark 1 in the HARY

Mark 1 in the HNT

Mark 1 in the IRVA

Mark 1 in the IRVB

Mark 1 in the IRVG

Mark 1 in the IRVH

Mark 1 in the IRVK

Mark 1 in the IRVM

Mark 1 in the IRVM2

Mark 1 in the IRVO

Mark 1 in the IRVP

Mark 1 in the IRVT

Mark 1 in the IRVT2

Mark 1 in the IRVU

Mark 1 in the ISVN

Mark 1 in the JSNT

Mark 1 in the KAPI

Mark 1 in the KBT1ETNIK

Mark 1 in the KBV

Mark 1 in the KJV

Mark 1 in the KNFD

Mark 1 in the LBA

Mark 1 in the LBLA

Mark 1 in the LNT

Mark 1 in the LSV

Mark 1 in the MAAL

Mark 1 in the MBV

Mark 1 in the MBV2

Mark 1 in the MHNT

Mark 1 in the MKNFD

Mark 1 in the MNG

Mark 1 in the MNT

Mark 1 in the MNT2

Mark 1 in the MRS1T

Mark 1 in the NAA

Mark 1 in the NASB

Mark 1 in the NBLA

Mark 1 in the NBS

Mark 1 in the NBVTP

Mark 1 in the NET2

Mark 1 in the NIV11

Mark 1 in the NNT

Mark 1 in the NNT2

Mark 1 in the NNT3

Mark 1 in the PDDPT

Mark 1 in the PFNT

Mark 1 in the RMNT

Mark 1 in the SBIAS

Mark 1 in the SBIBS

Mark 1 in the SBIBS2

Mark 1 in the SBICS

Mark 1 in the SBIDS

Mark 1 in the SBIGS

Mark 1 in the SBIHS

Mark 1 in the SBIIS

Mark 1 in the SBIIS2

Mark 1 in the SBIIS3

Mark 1 in the SBIKS

Mark 1 in the SBIKS2

Mark 1 in the SBIMS

Mark 1 in the SBIOS

Mark 1 in the SBIPS

Mark 1 in the SBISS

Mark 1 in the SBITS

Mark 1 in the SBITS2

Mark 1 in the SBITS3

Mark 1 in the SBITS4

Mark 1 in the SBIUS

Mark 1 in the SBIVS

Mark 1 in the SBT

Mark 1 in the SBT1E

Mark 1 in the SCHL

Mark 1 in the SNT

Mark 1 in the SUSU

Mark 1 in the SUSU2

Mark 1 in the SYNO

Mark 1 in the TBIAOTANT

Mark 1 in the TBT1E

Mark 1 in the TBT1E2

Mark 1 in the TFTIP

Mark 1 in the TFTU

Mark 1 in the TGNTATF3T

Mark 1 in the THAI

Mark 1 in the TNFD

Mark 1 in the TNT

Mark 1 in the TNTIK

Mark 1 in the TNTIL

Mark 1 in the TNTIN

Mark 1 in the TNTIP

Mark 1 in the TNTIZ

Mark 1 in the TOMA

Mark 1 in the TTENT

Mark 1 in the UBG

Mark 1 in the UGV

Mark 1 in the UGV2

Mark 1 in the UGV3

Mark 1 in the VBL

Mark 1 in the VDCC

Mark 1 in the YALU

Mark 1 in the YAPE

Mark 1 in the YBVTP

Mark 1 in the ZBP