Mark 5 (BOICB)

1 Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin. 2 Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. 3 Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, ọ bụladị iji eriri igwe kee ya. 4 Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. 5 Ọ na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ. 6 Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7 O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” 8 Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” 9 Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?”Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn, nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” 10 Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ. 11 Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. 12 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, “Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha.” 13 Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile. 14 Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere. 15 Ha bịakwutere Jisọs, hụ nwoke ahụ nke igwe mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. O yi uwe, nọdụ ala, bụrụkwa onye uche ya zuruoke; egwu jidere ha. 16 Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ. 17 Mgbe ahụ, ha bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nʼakụkụ ala ha. 18 Dị ka ọ na-achọ ịbanye nʼime ụgbọ, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ bibu nʼime ya rịọrọ ya ka o soro ha. 19 Ma Jisọs ekweghị, kama ọ sịrị ya, “Laa nʼụlọ, lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Onyenwe anyị meere gị, na otu o si meere gị ebere.” 20 Ya mere, o si nʼebe ahụ pụọ, malitekwa ịkọsa nʼime mpaghara Dekapọlịs ihe ọma Jisọs meere ya. Ihe a juru mmadụ niile anya. 21 Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri. 22 Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, 23 rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.” 24 Ya mere, Jisọs soro ya gawa.Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. 25 Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. 26 Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. 27 Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. 28 Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” 29 Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya. 30 Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” 31 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ” 32 Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. 33 Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. 34 Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.” 35 Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?” 36 Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.” 37 O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. 38 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. 39 Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” 40 Ma ha chịrị ya ọchị.Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41 O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). 42 Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43 Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”

In Other Versions

Mark 5 in the ANGEFD

Mark 5 in the ANTPNG2D

Mark 5 in the AS21

Mark 5 in the BAGH

Mark 5 in the BBPNG

Mark 5 in the BBT1E

Mark 5 in the BDS

Mark 5 in the BEV

Mark 5 in the BHAD

Mark 5 in the BIB

Mark 5 in the BLPT

Mark 5 in the BNT

Mark 5 in the BNTABOOT

Mark 5 in the BNTLV

Mark 5 in the BOATCB

Mark 5 in the BOATCB2

Mark 5 in the BOBCV

Mark 5 in the BOCNT

Mark 5 in the BOECS

Mark 5 in the BOGWICC

Mark 5 in the BOHCB

Mark 5 in the BOHCV

Mark 5 in the BOHLNT

Mark 5 in the BOHNTLTAL

Mark 5 in the BOILNTAP

Mark 5 in the BOITCV

Mark 5 in the BOKCV

Mark 5 in the BOKCV2

Mark 5 in the BOKHWOG

Mark 5 in the BOKSSV

Mark 5 in the BOLCB

Mark 5 in the BOLCB2

Mark 5 in the BOMCV

Mark 5 in the BONAV

Mark 5 in the BONCB

Mark 5 in the BONLT

Mark 5 in the BONUT2

Mark 5 in the BOPLNT

Mark 5 in the BOSCB

Mark 5 in the BOSNC

Mark 5 in the BOTLNT

Mark 5 in the BOVCB

Mark 5 in the BOYCB

Mark 5 in the BPBB

Mark 5 in the BPH

Mark 5 in the BSB

Mark 5 in the CCB

Mark 5 in the CUV

Mark 5 in the CUVS

Mark 5 in the DBT

Mark 5 in the DGDNT

Mark 5 in the DHNT

Mark 5 in the DNT

Mark 5 in the ELBE

Mark 5 in the EMTV

Mark 5 in the ESV

Mark 5 in the FBV

Mark 5 in the FEB

Mark 5 in the GGMNT

Mark 5 in the GNT

Mark 5 in the HARY

Mark 5 in the HNT

Mark 5 in the IRVA

Mark 5 in the IRVB

Mark 5 in the IRVG

Mark 5 in the IRVH

Mark 5 in the IRVK

Mark 5 in the IRVM

Mark 5 in the IRVM2

Mark 5 in the IRVO

Mark 5 in the IRVP

Mark 5 in the IRVT

Mark 5 in the IRVT2

Mark 5 in the IRVU

Mark 5 in the ISVN

Mark 5 in the JSNT

Mark 5 in the KAPI

Mark 5 in the KBT1ETNIK

Mark 5 in the KBV

Mark 5 in the KJV

Mark 5 in the KNFD

Mark 5 in the LBA

Mark 5 in the LBLA

Mark 5 in the LNT

Mark 5 in the LSV

Mark 5 in the MAAL

Mark 5 in the MBV

Mark 5 in the MBV2

Mark 5 in the MHNT

Mark 5 in the MKNFD

Mark 5 in the MNG

Mark 5 in the MNT

Mark 5 in the MNT2

Mark 5 in the MRS1T

Mark 5 in the NAA

Mark 5 in the NASB

Mark 5 in the NBLA

Mark 5 in the NBS

Mark 5 in the NBVTP

Mark 5 in the NET2

Mark 5 in the NIV11

Mark 5 in the NNT

Mark 5 in the NNT2

Mark 5 in the NNT3

Mark 5 in the PDDPT

Mark 5 in the PFNT

Mark 5 in the RMNT

Mark 5 in the SBIAS

Mark 5 in the SBIBS

Mark 5 in the SBIBS2

Mark 5 in the SBICS

Mark 5 in the SBIDS

Mark 5 in the SBIGS

Mark 5 in the SBIHS

Mark 5 in the SBIIS

Mark 5 in the SBIIS2

Mark 5 in the SBIIS3

Mark 5 in the SBIKS

Mark 5 in the SBIKS2

Mark 5 in the SBIMS

Mark 5 in the SBIOS

Mark 5 in the SBIPS

Mark 5 in the SBISS

Mark 5 in the SBITS

Mark 5 in the SBITS2

Mark 5 in the SBITS3

Mark 5 in the SBITS4

Mark 5 in the SBIUS

Mark 5 in the SBIVS

Mark 5 in the SBT

Mark 5 in the SBT1E

Mark 5 in the SCHL

Mark 5 in the SNT

Mark 5 in the SUSU

Mark 5 in the SUSU2

Mark 5 in the SYNO

Mark 5 in the TBIAOTANT

Mark 5 in the TBT1E

Mark 5 in the TBT1E2

Mark 5 in the TFTIP

Mark 5 in the TFTU

Mark 5 in the TGNTATF3T

Mark 5 in the THAI

Mark 5 in the TNFD

Mark 5 in the TNT

Mark 5 in the TNTIK

Mark 5 in the TNTIL

Mark 5 in the TNTIN

Mark 5 in the TNTIP

Mark 5 in the TNTIZ

Mark 5 in the TOMA

Mark 5 in the TTENT

Mark 5 in the UBG

Mark 5 in the UGV

Mark 5 in the UGV2

Mark 5 in the UGV3

Mark 5 in the VBL

Mark 5 in the VDCC

Mark 5 in the YALU

Mark 5 in the YAPE

Mark 5 in the YBVTP

Mark 5 in the ZBP