Obadiah 1 (BOICB)

1 Ọhụ nke Ọbadaya hụrụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu banyere Edọm.Anyị anụla ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị,e zipụla onyeozi ka ọ gaa mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,“Bilikwanụ ka anyị gaa buo agha megide ya.” 2 “Lee, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche;ị ga-abụ ihe a na-elelị anya nke ukwuu. 3 Nganga nke obi gị eduhiela gị,gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu,onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu.Gị onye na-ekwu nʼime obi ya,‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’ 4 A sịkwarị na i felie elu dịka ugo,ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando,aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 5 “Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị,e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị,lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị!Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru?Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole? 6 Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya,lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo! 7 Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị,ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala;ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu,ma ị gaghị achọpụta ya. 8 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya,“ọ bụ na mụ agaghị ala ndị oke amamihe niile nọ nʼEdọm nʼiyi,bụ ndị nwere mmụọ nghọta nọ nʼugwu Ịsọ? 9 Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,ka a ga-egbuda nʼagha. 10 Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.Ihere ga-ekpuchi gị;a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 11 Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafeefee nza iji kerie Jerusalem.Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 12 Ma ị garaghị eleda nwanne gị anyanʼụbọchị nsogbu ya,ị garaghị aṅụ ndị Judanʼụbọchị ahụ e bibiri ha.Ị garaghị anyara ha isinʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu. 13 I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ijenʼụbọchị ha nọ na nsogbu,o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha,nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ hanʼụbọchị nsogbu ha. 14 I kwesighị ịnọchi na ngalaba ụzọigbu ndị na-agbapụ ọsọ ndụ,maọbụ were ndị ha fọdụrụ ndụ nyefee ha nʼaka ndị iro ha,nʼụbọchị nsogbu ha. 15 “Ụbọchị nke Onyenwe anyị dị nsonye mba niile.Dịka i si mee ndị ọzọ, otu ahụ ka a ga-eme gị;ihe i metara ga-adị gị nʼisi. 16 Dịka i si site nʼugwu nsọ m ṅụọ ihe ọṅụṅụotu a ka mba niile gbara gị gburugburu ga-esi ṅụọ ma na-adagharị.Ha ga-aṅụ, ṅụọ,ma ọ gaghị adị ha ka o nwere ihe ha na-aṅụ. 17 Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ,ọ ga-adị nsọ,ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ. 18 Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ,ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ:ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka.Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya.Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụsite nʼụlọ Ịsọ.” ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. 19 Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichinʼugwu ugwu Ịsọ,ndị si na Shefelaga-enwekọta ala ndị Filistia.Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria.Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead. 20 Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala,ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat.Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad,ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb. 21 Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọnmaka ịchị ugwu Ịsọ niile.Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Obadiah 1 in the ANGEFD

Obadiah 1 in the ANTPNG2D

Obadiah 1 in the AS21

Obadiah 1 in the BAGH

Obadiah 1 in the BBPNG

Obadiah 1 in the BBT1E

Obadiah 1 in the BDS

Obadiah 1 in the BEV

Obadiah 1 in the BHAD

Obadiah 1 in the BIB

Obadiah 1 in the BLPT

Obadiah 1 in the BNT

Obadiah 1 in the BNTABOOT

Obadiah 1 in the BNTLV

Obadiah 1 in the BOATCB

Obadiah 1 in the BOATCB2

Obadiah 1 in the BOBCV

Obadiah 1 in the BOCNT

Obadiah 1 in the BOECS

Obadiah 1 in the BOGWICC

Obadiah 1 in the BOHCB

Obadiah 1 in the BOHCV

Obadiah 1 in the BOHLNT

Obadiah 1 in the BOHNTLTAL

Obadiah 1 in the BOILNTAP

Obadiah 1 in the BOITCV

Obadiah 1 in the BOKCV

Obadiah 1 in the BOKCV2

Obadiah 1 in the BOKHWOG

Obadiah 1 in the BOKSSV

Obadiah 1 in the BOLCB

Obadiah 1 in the BOLCB2

Obadiah 1 in the BOMCV

Obadiah 1 in the BONAV

Obadiah 1 in the BONCB

Obadiah 1 in the BONLT

Obadiah 1 in the BONUT2

Obadiah 1 in the BOPLNT

Obadiah 1 in the BOSCB

Obadiah 1 in the BOSNC

Obadiah 1 in the BOTLNT

Obadiah 1 in the BOVCB

Obadiah 1 in the BOYCB

Obadiah 1 in the BPBB

Obadiah 1 in the BPH

Obadiah 1 in the BSB

Obadiah 1 in the CCB

Obadiah 1 in the CUV

Obadiah 1 in the CUVS

Obadiah 1 in the DBT

Obadiah 1 in the DGDNT

Obadiah 1 in the DHNT

Obadiah 1 in the DNT

Obadiah 1 in the ELBE

Obadiah 1 in the EMTV

Obadiah 1 in the ESV

Obadiah 1 in the FBV

Obadiah 1 in the FEB

Obadiah 1 in the GGMNT

Obadiah 1 in the GNT

Obadiah 1 in the HARY

Obadiah 1 in the HNT

Obadiah 1 in the IRVA

Obadiah 1 in the IRVB

Obadiah 1 in the IRVG

Obadiah 1 in the IRVH

Obadiah 1 in the IRVK

Obadiah 1 in the IRVM

Obadiah 1 in the IRVM2

Obadiah 1 in the IRVO

Obadiah 1 in the IRVP

Obadiah 1 in the IRVT

Obadiah 1 in the IRVT2

Obadiah 1 in the IRVU

Obadiah 1 in the ISVN

Obadiah 1 in the JSNT

Obadiah 1 in the KAPI

Obadiah 1 in the KBT1ETNIK

Obadiah 1 in the KBV

Obadiah 1 in the KJV

Obadiah 1 in the KNFD

Obadiah 1 in the LBA

Obadiah 1 in the LBLA

Obadiah 1 in the LNT

Obadiah 1 in the LSV

Obadiah 1 in the MAAL

Obadiah 1 in the MBV

Obadiah 1 in the MBV2

Obadiah 1 in the MHNT

Obadiah 1 in the MKNFD

Obadiah 1 in the MNG

Obadiah 1 in the MNT

Obadiah 1 in the MNT2

Obadiah 1 in the MRS1T

Obadiah 1 in the NAA

Obadiah 1 in the NASB

Obadiah 1 in the NBLA

Obadiah 1 in the NBS

Obadiah 1 in the NBVTP

Obadiah 1 in the NET2

Obadiah 1 in the NIV11

Obadiah 1 in the NNT

Obadiah 1 in the NNT2

Obadiah 1 in the NNT3

Obadiah 1 in the PDDPT

Obadiah 1 in the PFNT

Obadiah 1 in the RMNT

Obadiah 1 in the SBIAS

Obadiah 1 in the SBIBS

Obadiah 1 in the SBIBS2

Obadiah 1 in the SBICS

Obadiah 1 in the SBIDS

Obadiah 1 in the SBIGS

Obadiah 1 in the SBIHS

Obadiah 1 in the SBIIS

Obadiah 1 in the SBIIS2

Obadiah 1 in the SBIIS3

Obadiah 1 in the SBIKS

Obadiah 1 in the SBIKS2

Obadiah 1 in the SBIMS

Obadiah 1 in the SBIOS

Obadiah 1 in the SBIPS

Obadiah 1 in the SBISS

Obadiah 1 in the SBITS

Obadiah 1 in the SBITS2

Obadiah 1 in the SBITS3

Obadiah 1 in the SBITS4

Obadiah 1 in the SBIUS

Obadiah 1 in the SBIVS

Obadiah 1 in the SBT

Obadiah 1 in the SBT1E

Obadiah 1 in the SCHL

Obadiah 1 in the SNT

Obadiah 1 in the SUSU

Obadiah 1 in the SUSU2

Obadiah 1 in the SYNO

Obadiah 1 in the TBIAOTANT

Obadiah 1 in the TBT1E

Obadiah 1 in the TBT1E2

Obadiah 1 in the TFTIP

Obadiah 1 in the TFTU

Obadiah 1 in the TGNTATF3T

Obadiah 1 in the THAI

Obadiah 1 in the TNFD

Obadiah 1 in the TNT

Obadiah 1 in the TNTIK

Obadiah 1 in the TNTIL

Obadiah 1 in the TNTIN

Obadiah 1 in the TNTIP

Obadiah 1 in the TNTIZ

Obadiah 1 in the TOMA

Obadiah 1 in the TTENT

Obadiah 1 in the UBG

Obadiah 1 in the UGV

Obadiah 1 in the UGV2

Obadiah 1 in the UGV3

Obadiah 1 in the VBL

Obadiah 1 in the VDCC

Obadiah 1 in the YALU

Obadiah 1 in the YAPE

Obadiah 1 in the YBVTP

Obadiah 1 in the ZBP