Proverbs 15 (BOICB)
1 Ọsịsa okwu dị nro na-eme ka iwe na ọnụma laa azụ;ma okwu ike na-akpali iwe. 2 Ire onye maara ihe na-eme ka ihe ọmụma mụbaa,ma ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu enweghị uche. 3 ONYENWE ANYỊ na-ahụzu ihe niile,anya ya dịkwa nʼahụ ndị ọma na ndị ọjọọ. 4 Okwu dị nwayọọ na-eweta ndụ na ume;ma nkwutọ na-eweta ịda mba. 5 Naanị onye nzuzu na-akpọ ndụmọdụ ndị mụrụ ya ihe efu;ma onye ọbụla na-ege ntị nye mgbanwe na-ezipụta ezi uche. 6 Ụlọ ndị ezi omume na-ejupụta nʼọtụtụ akụ,ma akụ ndị na-emebi iwu na-ewetara ha nsogbu. 7 Egbugbere ọnụ onye maara ihe na-agbasa ihe ọmụma,ma obi ndị nzuzu ezighị ezi. 8 ONYENWE ANYỊ na-akpọ aja ndị ajọ omume asị,ma ekpere ndị ndụ ha ziri ezi na-atọ ya ụtọ. 9 ONYENWE ANYỊ kpọrọ ụzọ ndị na-emebi iwu asị,ma ndị na-achụso ezi omume ka ọ na-ahụ nʼanya. 10 Oke ịdọ aka na ntị na-echere ndị na-ahapụ ụzọ.Onye kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ ọnwụ. 11 ONYENWE ANYỊ mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ;ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? 12 Ọ dịghị atọ onye na-akwa emo ụtọ ma a baara ya mba,ya mere ọ dịghị ejekwuru onye maara ihe. 13 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.Ihu gbarụrụ agbarụ na-egosi obi nwere ihe mwute. 14 Obi nwere nghọta na-achọ ịmata ihe,ma ọnụ onye nzuzu na-azụ onwe ya nʼokwu na-abaghị uru. 15 Ndụ onye ogbenye jupụtara nnọọ na mgbalị,ma ndị nwere udo nʼobi na-eri oriri mgbe niile. 16 Ọ dị mma inwe akụnụba dị nta ma bụrụ onye na-atụ egwu ONYENWE ANYỊ,karịa inwe akụ ma nọrọ na nsogbu. 17 Ọ ka mma bụ oke nri akwụkwọ nri nta nke nwere ịhụnanya,karịa ehi buru ibu a zụziri azụzi nke ịkpọ asị dị na ya. 18 Onye iwe ọkụ na-amalite ọgụ;ma onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ na-eme ka ịlụ ọgụ kwụsị. 19 Eji ogwu gbochie ụzọ onye umengwụ,ma ụzọ onye omume ya ziri ezi bụ ụzọ dị larịị. 20 Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya. 21 Onye na-enweghị uche na-aṅụrị ọṅụ nʼime amaghị ihe ya,ma onye nwere nghọta na-aga ije nʼụzọ ziri ezi. 22 Nzube na-enweghị ndụmọdụ na-ama afọ nʼala,ma ndị ndụmọdụ dịrị ọtụtụ ọganihu ga-adị. 23 Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma,okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma. 24 Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche,iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. 25 ONYENWE ANYỊ na-adọtu ma na-adọrisi ụlọ nke onye mpako,ma oke ala nke nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-elekọta. 26 Echiche ọjọọ niile nke ndị na-emebi iwu ka ONYENWE ANYỊ kpọrọ asịma okwu ebere niile dị ọcha nʼanya ya. 27 Onye anya ukwu na-ewetara ezinaụlọ ya nsogbu.Ma onye kpọrọ iri ngarị asị ga-adị ndụ. 28 Obi onye ezi omume na-atule ọsịsa yama ọnụ nke onye ajọ omume na-asọpụta ihe ọjọọ dị iche iche. 29 ONYENWE ANYỊ anọghị ndị na-emebi iwu nso;ma ọ na-anụ ekpere ndị ezi omume. 30 Ihu ọchị na-eweta obi ụtọ.Akụkọ ọma na-enyekwa ọkpụkpụ ndụ. 31 Onye na-ege ntị nye ịba mba nke na-enye ndụga-esoro ndị amamihe nọrọ. 32 Onye jụrụ ịdọ aka na ntị kpọrọ onwe ya asịma onye ọbụla naara ndụmọdụ nwere nghọta. 33 Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
In Other Versions
Proverbs 15 in the ANGEFD
Proverbs 15 in the ANTPNG2D
Proverbs 15 in the AS21
Proverbs 15 in the BAGH
Proverbs 15 in the BBPNG
Proverbs 15 in the BBT1E
Proverbs 15 in the BDS
Proverbs 15 in the BEV
Proverbs 15 in the BHAD
Proverbs 15 in the BIB
Proverbs 15 in the BLPT
Proverbs 15 in the BNT
Proverbs 15 in the BNTABOOT
Proverbs 15 in the BNTLV
Proverbs 15 in the BOATCB
Proverbs 15 in the BOATCB2
Proverbs 15 in the BOBCV
Proverbs 15 in the BOCNT
Proverbs 15 in the BOECS
Proverbs 15 in the BOGWICC
Proverbs 15 in the BOHCB
Proverbs 15 in the BOHCV
Proverbs 15 in the BOHLNT
Proverbs 15 in the BOHNTLTAL
Proverbs 15 in the BOILNTAP
Proverbs 15 in the BOITCV
Proverbs 15 in the BOKCV
Proverbs 15 in the BOKCV2
Proverbs 15 in the BOKHWOG
Proverbs 15 in the BOKSSV
Proverbs 15 in the BOLCB
Proverbs 15 in the BOLCB2
Proverbs 15 in the BOMCV
Proverbs 15 in the BONAV
Proverbs 15 in the BONCB
Proverbs 15 in the BONLT
Proverbs 15 in the BONUT2
Proverbs 15 in the BOPLNT
Proverbs 15 in the BOSCB
Proverbs 15 in the BOSNC
Proverbs 15 in the BOTLNT
Proverbs 15 in the BOVCB
Proverbs 15 in the BOYCB
Proverbs 15 in the BPBB
Proverbs 15 in the BPH
Proverbs 15 in the BSB
Proverbs 15 in the CCB
Proverbs 15 in the CUV
Proverbs 15 in the CUVS
Proverbs 15 in the DBT
Proverbs 15 in the DGDNT
Proverbs 15 in the DHNT
Proverbs 15 in the DNT
Proverbs 15 in the ELBE
Proverbs 15 in the EMTV
Proverbs 15 in the ESV
Proverbs 15 in the FBV
Proverbs 15 in the FEB
Proverbs 15 in the GGMNT
Proverbs 15 in the GNT
Proverbs 15 in the HARY
Proverbs 15 in the HNT
Proverbs 15 in the IRVA
Proverbs 15 in the IRVB
Proverbs 15 in the IRVG
Proverbs 15 in the IRVH
Proverbs 15 in the IRVK
Proverbs 15 in the IRVM
Proverbs 15 in the IRVM2
Proverbs 15 in the IRVO
Proverbs 15 in the IRVP
Proverbs 15 in the IRVT
Proverbs 15 in the IRVT2
Proverbs 15 in the IRVU
Proverbs 15 in the ISVN
Proverbs 15 in the JSNT
Proverbs 15 in the KAPI
Proverbs 15 in the KBT1ETNIK
Proverbs 15 in the KBV
Proverbs 15 in the KJV
Proverbs 15 in the KNFD
Proverbs 15 in the LBA
Proverbs 15 in the LBLA
Proverbs 15 in the LNT
Proverbs 15 in the LSV
Proverbs 15 in the MAAL
Proverbs 15 in the MBV
Proverbs 15 in the MBV2
Proverbs 15 in the MHNT
Proverbs 15 in the MKNFD
Proverbs 15 in the MNG
Proverbs 15 in the MNT
Proverbs 15 in the MNT2
Proverbs 15 in the MRS1T
Proverbs 15 in the NAA
Proverbs 15 in the NASB
Proverbs 15 in the NBLA
Proverbs 15 in the NBS
Proverbs 15 in the NBVTP
Proverbs 15 in the NET2
Proverbs 15 in the NIV11
Proverbs 15 in the NNT
Proverbs 15 in the NNT2
Proverbs 15 in the NNT3
Proverbs 15 in the PDDPT
Proverbs 15 in the PFNT
Proverbs 15 in the RMNT
Proverbs 15 in the SBIAS
Proverbs 15 in the SBIBS
Proverbs 15 in the SBIBS2
Proverbs 15 in the SBICS
Proverbs 15 in the SBIDS
Proverbs 15 in the SBIGS
Proverbs 15 in the SBIHS
Proverbs 15 in the SBIIS
Proverbs 15 in the SBIIS2
Proverbs 15 in the SBIIS3
Proverbs 15 in the SBIKS
Proverbs 15 in the SBIKS2
Proverbs 15 in the SBIMS
Proverbs 15 in the SBIOS
Proverbs 15 in the SBIPS
Proverbs 15 in the SBISS
Proverbs 15 in the SBITS
Proverbs 15 in the SBITS2
Proverbs 15 in the SBITS3
Proverbs 15 in the SBITS4
Proverbs 15 in the SBIUS
Proverbs 15 in the SBIVS
Proverbs 15 in the SBT
Proverbs 15 in the SBT1E
Proverbs 15 in the SCHL
Proverbs 15 in the SNT
Proverbs 15 in the SUSU
Proverbs 15 in the SUSU2
Proverbs 15 in the SYNO
Proverbs 15 in the TBIAOTANT
Proverbs 15 in the TBT1E
Proverbs 15 in the TBT1E2
Proverbs 15 in the TFTIP
Proverbs 15 in the TFTU
Proverbs 15 in the TGNTATF3T
Proverbs 15 in the THAI
Proverbs 15 in the TNFD
Proverbs 15 in the TNT
Proverbs 15 in the TNTIK
Proverbs 15 in the TNTIL
Proverbs 15 in the TNTIN
Proverbs 15 in the TNTIP
Proverbs 15 in the TNTIZ
Proverbs 15 in the TOMA
Proverbs 15 in the TTENT
Proverbs 15 in the UBG
Proverbs 15 in the UGV
Proverbs 15 in the UGV2
Proverbs 15 in the UGV3
Proverbs 15 in the VBL
Proverbs 15 in the VDCC
Proverbs 15 in the YALU
Proverbs 15 in the YAPE
Proverbs 15 in the YBVTP
Proverbs 15 in the ZBP