Proverbs 30 (BOICB)
1 Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa,Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chinekema a pụrụ imeri. 2 Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla;Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe. 3 Amụtabeghị m amamihe,maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ. 4 Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa?Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya?Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya?Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ?Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya?Gịnịkwa bụ aha nwa ya? 5 “Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 6 Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya,ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha. 7 “O ONYENWE ANYỊ, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ;ajụkwala imere m ha: 8 Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile. 9 Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke,ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka ONYENWE ANYỊ bụ?’Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi,site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere. 10 “Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu,ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11 “Ọ dị ndị na-akọcha nna ha,ha adịghị agọzikwa nne ha; 12 Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe hama asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru. 13 Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu,ndị ile anya ha jupụtara na nlelị. 14 Ndị eze ha niile bụ mma aghaịkịrị eze ha bụkwa mmamaka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwana ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ. 15 “Etu nwere ụmụ nwanyị abụọndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju.E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’ 16 Ala ili,akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime,ala nke mmiri na-adịghị eju afọ,na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ 17 “Onye ahụ na-akwa nna ya emo,nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,udele ga-erikwa anụ ahụ ya. 18 “Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha;mbaa, ha dị anọ! 19 Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe;otu agwọ si akpụ nʼelu nkume,otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri;na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ. 20 “Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko,Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya,na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’ 21 “Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji,nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide, 22 Ohu ghọrọ eze,onye nzuzu ihe na-agara nke ọma, 23 nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị,na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu. 24 “Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa,ma ha maa ihe nke ukwuu. 25 Ndanda bụ ndị na-enweghị ume,ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi. 26 Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike,ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume. 27 Igurube enweghị eze,ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị. 28 Ngwere dị mfe iji aka jide ya,ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze. 29 “Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube,mbaa, ha dị anọ: 30 Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu, 31 na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị,na mkpi,na eze ndị agha ya gbara gburugburu. 32 “Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elumaọbụ zube nzube ọjọọ,anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere. 33 A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi;iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara,otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
In Other Versions
Proverbs 30 in the ANGEFD
Proverbs 30 in the ANTPNG2D
Proverbs 30 in the AS21
Proverbs 30 in the BAGH
Proverbs 30 in the BBPNG
Proverbs 30 in the BBT1E
Proverbs 30 in the BDS
Proverbs 30 in the BEV
Proverbs 30 in the BHAD
Proverbs 30 in the BIB
Proverbs 30 in the BLPT
Proverbs 30 in the BNT
Proverbs 30 in the BNTABOOT
Proverbs 30 in the BNTLV
Proverbs 30 in the BOATCB
Proverbs 30 in the BOATCB2
Proverbs 30 in the BOBCV
Proverbs 30 in the BOCNT
Proverbs 30 in the BOECS
Proverbs 30 in the BOGWICC
Proverbs 30 in the BOHCB
Proverbs 30 in the BOHCV
Proverbs 30 in the BOHLNT
Proverbs 30 in the BOHNTLTAL
Proverbs 30 in the BOILNTAP
Proverbs 30 in the BOITCV
Proverbs 30 in the BOKCV
Proverbs 30 in the BOKCV2
Proverbs 30 in the BOKHWOG
Proverbs 30 in the BOKSSV
Proverbs 30 in the BOLCB
Proverbs 30 in the BOLCB2
Proverbs 30 in the BOMCV
Proverbs 30 in the BONAV
Proverbs 30 in the BONCB
Proverbs 30 in the BONLT
Proverbs 30 in the BONUT2
Proverbs 30 in the BOPLNT
Proverbs 30 in the BOSCB
Proverbs 30 in the BOSNC
Proverbs 30 in the BOTLNT
Proverbs 30 in the BOVCB
Proverbs 30 in the BOYCB
Proverbs 30 in the BPBB
Proverbs 30 in the BPH
Proverbs 30 in the BSB
Proverbs 30 in the CCB
Proverbs 30 in the CUV
Proverbs 30 in the CUVS
Proverbs 30 in the DBT
Proverbs 30 in the DGDNT
Proverbs 30 in the DHNT
Proverbs 30 in the DNT
Proverbs 30 in the ELBE
Proverbs 30 in the EMTV
Proverbs 30 in the ESV
Proverbs 30 in the FBV
Proverbs 30 in the FEB
Proverbs 30 in the GGMNT
Proverbs 30 in the GNT
Proverbs 30 in the HARY
Proverbs 30 in the HNT
Proverbs 30 in the IRVA
Proverbs 30 in the IRVB
Proverbs 30 in the IRVG
Proverbs 30 in the IRVH
Proverbs 30 in the IRVK
Proverbs 30 in the IRVM
Proverbs 30 in the IRVM2
Proverbs 30 in the IRVO
Proverbs 30 in the IRVP
Proverbs 30 in the IRVT
Proverbs 30 in the IRVT2
Proverbs 30 in the IRVU
Proverbs 30 in the ISVN
Proverbs 30 in the JSNT
Proverbs 30 in the KAPI
Proverbs 30 in the KBT1ETNIK
Proverbs 30 in the KBV
Proverbs 30 in the KJV
Proverbs 30 in the KNFD
Proverbs 30 in the LBA
Proverbs 30 in the LBLA
Proverbs 30 in the LNT
Proverbs 30 in the LSV
Proverbs 30 in the MAAL
Proverbs 30 in the MBV
Proverbs 30 in the MBV2
Proverbs 30 in the MHNT
Proverbs 30 in the MKNFD
Proverbs 30 in the MNG
Proverbs 30 in the MNT
Proverbs 30 in the MNT2
Proverbs 30 in the MRS1T
Proverbs 30 in the NAA
Proverbs 30 in the NASB
Proverbs 30 in the NBLA
Proverbs 30 in the NBS
Proverbs 30 in the NBVTP
Proverbs 30 in the NET2
Proverbs 30 in the NIV11
Proverbs 30 in the NNT
Proverbs 30 in the NNT2
Proverbs 30 in the NNT3
Proverbs 30 in the PDDPT
Proverbs 30 in the PFNT
Proverbs 30 in the RMNT
Proverbs 30 in the SBIAS
Proverbs 30 in the SBIBS
Proverbs 30 in the SBIBS2
Proverbs 30 in the SBICS
Proverbs 30 in the SBIDS
Proverbs 30 in the SBIGS
Proverbs 30 in the SBIHS
Proverbs 30 in the SBIIS
Proverbs 30 in the SBIIS2
Proverbs 30 in the SBIIS3
Proverbs 30 in the SBIKS
Proverbs 30 in the SBIKS2
Proverbs 30 in the SBIMS
Proverbs 30 in the SBIOS
Proverbs 30 in the SBIPS
Proverbs 30 in the SBISS
Proverbs 30 in the SBITS
Proverbs 30 in the SBITS2
Proverbs 30 in the SBITS3
Proverbs 30 in the SBITS4
Proverbs 30 in the SBIUS
Proverbs 30 in the SBIVS
Proverbs 30 in the SBT
Proverbs 30 in the SBT1E
Proverbs 30 in the SCHL
Proverbs 30 in the SNT
Proverbs 30 in the SUSU
Proverbs 30 in the SUSU2
Proverbs 30 in the SYNO
Proverbs 30 in the TBIAOTANT
Proverbs 30 in the TBT1E
Proverbs 30 in the TBT1E2
Proverbs 30 in the TFTIP
Proverbs 30 in the TFTU
Proverbs 30 in the TGNTATF3T
Proverbs 30 in the THAI
Proverbs 30 in the TNFD
Proverbs 30 in the TNT
Proverbs 30 in the TNTIK
Proverbs 30 in the TNTIL
Proverbs 30 in the TNTIN
Proverbs 30 in the TNTIP
Proverbs 30 in the TNTIZ
Proverbs 30 in the TOMA
Proverbs 30 in the TTENT
Proverbs 30 in the UBG
Proverbs 30 in the UGV
Proverbs 30 in the UGV2
Proverbs 30 in the UGV3
Proverbs 30 in the VBL
Proverbs 30 in the VDCC
Proverbs 30 in the YALU
Proverbs 30 in the YAPE
Proverbs 30 in the YBVTP
Proverbs 30 in the ZBP