Proverbs 8 (BOICB)
1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda? 2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,nʼagbata ụzọ niile. 3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niilena nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu, 4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu. 5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta. 6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi, 7 Ọnụ m na-ekwu eziokwunʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị. 8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya. 9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi. 10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọchahọrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.” 11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya. 12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. 13 Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.Akpọrọ m nganga na mpako,omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. 14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;enwekwara m ọmụma ihe na ike. 15 Site na m ka ndị eze ji achị,ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. 16 Site na m ka ndị eze ji achịbụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. 17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. 18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,na ikpe ziri ezi na ezi omume. 19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,ọ karịkwara ọlaedo. 20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. 21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. 22 “ONYENWE ANYỊ kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. 23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;adịkwa m adị tupu e kee ụwa. 24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, 25 tupu e kee ugwu ukwuna ugwu nta. 26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwana osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. 27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; 28 mgbe o hiwere mbara eluigwe,mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, 29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya,mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. 30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ;ana m egwuri egwu nʼihu ya. 31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,ụwa niile na ụmụ mmadụ! 32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. 33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. 34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile,onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; 35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;ọ natakwala ihuọma nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
In Other Versions
Proverbs 8 in the ANGEFD
Proverbs 8 in the ANTPNG2D
Proverbs 8 in the AS21
Proverbs 8 in the BAGH
Proverbs 8 in the BBPNG
Proverbs 8 in the BBT1E
Proverbs 8 in the BDS
Proverbs 8 in the BEV
Proverbs 8 in the BHAD
Proverbs 8 in the BIB
Proverbs 8 in the BLPT
Proverbs 8 in the BNT
Proverbs 8 in the BNTABOOT
Proverbs 8 in the BNTLV
Proverbs 8 in the BOATCB
Proverbs 8 in the BOATCB2
Proverbs 8 in the BOBCV
Proverbs 8 in the BOCNT
Proverbs 8 in the BOECS
Proverbs 8 in the BOGWICC
Proverbs 8 in the BOHCB
Proverbs 8 in the BOHCV
Proverbs 8 in the BOHLNT
Proverbs 8 in the BOHNTLTAL
Proverbs 8 in the BOILNTAP
Proverbs 8 in the BOITCV
Proverbs 8 in the BOKCV
Proverbs 8 in the BOKCV2
Proverbs 8 in the BOKHWOG
Proverbs 8 in the BOKSSV
Proverbs 8 in the BOLCB
Proverbs 8 in the BOLCB2
Proverbs 8 in the BOMCV
Proverbs 8 in the BONAV
Proverbs 8 in the BONCB
Proverbs 8 in the BONLT
Proverbs 8 in the BONUT2
Proverbs 8 in the BOPLNT
Proverbs 8 in the BOSCB
Proverbs 8 in the BOSNC
Proverbs 8 in the BOTLNT
Proverbs 8 in the BOVCB
Proverbs 8 in the BOYCB
Proverbs 8 in the BPBB
Proverbs 8 in the BPH
Proverbs 8 in the BSB
Proverbs 8 in the CCB
Proverbs 8 in the CUV
Proverbs 8 in the CUVS
Proverbs 8 in the DBT
Proverbs 8 in the DGDNT
Proverbs 8 in the DHNT
Proverbs 8 in the DNT
Proverbs 8 in the ELBE
Proverbs 8 in the EMTV
Proverbs 8 in the ESV
Proverbs 8 in the FBV
Proverbs 8 in the FEB
Proverbs 8 in the GGMNT
Proverbs 8 in the GNT
Proverbs 8 in the HARY
Proverbs 8 in the HNT
Proverbs 8 in the IRVA
Proverbs 8 in the IRVB
Proverbs 8 in the IRVG
Proverbs 8 in the IRVH
Proverbs 8 in the IRVK
Proverbs 8 in the IRVM
Proverbs 8 in the IRVM2
Proverbs 8 in the IRVO
Proverbs 8 in the IRVP
Proverbs 8 in the IRVT
Proverbs 8 in the IRVT2
Proverbs 8 in the IRVU
Proverbs 8 in the ISVN
Proverbs 8 in the JSNT
Proverbs 8 in the KAPI
Proverbs 8 in the KBT1ETNIK
Proverbs 8 in the KBV
Proverbs 8 in the KJV
Proverbs 8 in the KNFD
Proverbs 8 in the LBA
Proverbs 8 in the LBLA
Proverbs 8 in the LNT
Proverbs 8 in the LSV
Proverbs 8 in the MAAL
Proverbs 8 in the MBV
Proverbs 8 in the MBV2
Proverbs 8 in the MHNT
Proverbs 8 in the MKNFD
Proverbs 8 in the MNG
Proverbs 8 in the MNT
Proverbs 8 in the MNT2
Proverbs 8 in the MRS1T
Proverbs 8 in the NAA
Proverbs 8 in the NASB
Proverbs 8 in the NBLA
Proverbs 8 in the NBS
Proverbs 8 in the NBVTP
Proverbs 8 in the NET2
Proverbs 8 in the NIV11
Proverbs 8 in the NNT
Proverbs 8 in the NNT2
Proverbs 8 in the NNT3
Proverbs 8 in the PDDPT
Proverbs 8 in the PFNT
Proverbs 8 in the RMNT
Proverbs 8 in the SBIAS
Proverbs 8 in the SBIBS
Proverbs 8 in the SBIBS2
Proverbs 8 in the SBICS
Proverbs 8 in the SBIDS
Proverbs 8 in the SBIGS
Proverbs 8 in the SBIHS
Proverbs 8 in the SBIIS
Proverbs 8 in the SBIIS2
Proverbs 8 in the SBIIS3
Proverbs 8 in the SBIKS
Proverbs 8 in the SBIKS2
Proverbs 8 in the SBIMS
Proverbs 8 in the SBIOS
Proverbs 8 in the SBIPS
Proverbs 8 in the SBISS
Proverbs 8 in the SBITS
Proverbs 8 in the SBITS2
Proverbs 8 in the SBITS3
Proverbs 8 in the SBITS4
Proverbs 8 in the SBIUS
Proverbs 8 in the SBIVS
Proverbs 8 in the SBT
Proverbs 8 in the SBT1E
Proverbs 8 in the SCHL
Proverbs 8 in the SNT
Proverbs 8 in the SUSU
Proverbs 8 in the SUSU2
Proverbs 8 in the SYNO
Proverbs 8 in the TBIAOTANT
Proverbs 8 in the TBT1E
Proverbs 8 in the TBT1E2
Proverbs 8 in the TFTIP
Proverbs 8 in the TFTU
Proverbs 8 in the TGNTATF3T
Proverbs 8 in the THAI
Proverbs 8 in the TNFD
Proverbs 8 in the TNT
Proverbs 8 in the TNTIK
Proverbs 8 in the TNTIL
Proverbs 8 in the TNTIN
Proverbs 8 in the TNTIP
Proverbs 8 in the TNTIZ
Proverbs 8 in the TOMA
Proverbs 8 in the TTENT
Proverbs 8 in the UBG
Proverbs 8 in the UGV
Proverbs 8 in the UGV2
Proverbs 8 in the UGV3
Proverbs 8 in the VBL
Proverbs 8 in the VDCC
Proverbs 8 in the YALU
Proverbs 8 in the YAPE
Proverbs 8 in the YBVTP
Proverbs 8 in the ZBP