Psalms 101 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Devid. 1 Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi;o ONYENWE ANYỊ, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto. 2 Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla,olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụlajegharịa nʼime ụlọ m. 3 Agaghị m edo ihe jọgburu onwe yanʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị.Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. 4 Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso.Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. 5 Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo,onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ;agaghị m anabataonye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. 6 Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya,ka mụ na ha biri;onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụlaga-ejere m ozi. 7 Onye ọbụla na-aghọ aghụghọagaghị ebi nʼụlọ m;onye ọbụla na-ekwu okwu ụghaagaghị eguzokwa nʼihu m. 8 Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duubụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a;Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihesite nʼobodo ONYENWE ANYỊ.