Psalms 104 (BOICB)

1 Mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYỊ. O ONYENWE ANYỊ na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu 3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ aghana-ejirikwa nku nke ifufe felie elu. 4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi. 5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya. 6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,mmiri tokpukwara ugwu niile. 7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ. 8 Ha sitere nʼelu ugwu niile,sọrọ gaa na ndagwurugwu,ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ. 9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ. 10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe. 11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụbụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ. 12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ. 13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya. 14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya,ime ka nri site nʼala pupụta; 15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma,na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi. 16 A na-agba osisi niile nke ONYENWE ANYỊ mmiri nke ọma,osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ. 17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya. 18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha. 19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa. 20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị. 21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. 22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha. 23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba. 24 ONYENWE ANYỊ, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha.Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi,anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta. 26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu. 27 Ha niile na-adabere na gị,ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 28 Ị na-enye ha nri;ha na-erikwa ya.Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri,afọ na-eju ha nke ọma. 29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,egwu na-eju ha obi.Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha,ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,a na-eke ha;ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 31 Ka ebube ONYENWE ANYỊ dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;ka ọrụ aka ONYENWE ANYỊ niile wetara ya ọṅụ, 32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ. 33 Aga m abụku ONYENWE ANYỊ abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ. 34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ. 35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too ONYENWE ANYỊ gị mkpụrụobi m! Toonu ONYENWE ANYỊ!

In Other Versions

Psalms 104 in the ANGEFD

Psalms 104 in the ANTPNG2D

Psalms 104 in the AS21

Psalms 104 in the BAGH

Psalms 104 in the BBPNG

Psalms 104 in the BBT1E

Psalms 104 in the BDS

Psalms 104 in the BEV

Psalms 104 in the BHAD

Psalms 104 in the BIB

Psalms 104 in the BLPT

Psalms 104 in the BNT

Psalms 104 in the BNTABOOT

Psalms 104 in the BNTLV

Psalms 104 in the BOATCB

Psalms 104 in the BOATCB2

Psalms 104 in the BOBCV

Psalms 104 in the BOCNT

Psalms 104 in the BOECS

Psalms 104 in the BOGWICC

Psalms 104 in the BOHCB

Psalms 104 in the BOHCV

Psalms 104 in the BOHLNT

Psalms 104 in the BOHNTLTAL

Psalms 104 in the BOILNTAP

Psalms 104 in the BOITCV

Psalms 104 in the BOKCV

Psalms 104 in the BOKCV2

Psalms 104 in the BOKHWOG

Psalms 104 in the BOKSSV

Psalms 104 in the BOLCB

Psalms 104 in the BOLCB2

Psalms 104 in the BOMCV

Psalms 104 in the BONAV

Psalms 104 in the BONCB

Psalms 104 in the BONLT

Psalms 104 in the BONUT2

Psalms 104 in the BOPLNT

Psalms 104 in the BOSCB

Psalms 104 in the BOSNC

Psalms 104 in the BOTLNT

Psalms 104 in the BOVCB

Psalms 104 in the BOYCB

Psalms 104 in the BPBB

Psalms 104 in the BPH

Psalms 104 in the BSB

Psalms 104 in the CCB

Psalms 104 in the CUV

Psalms 104 in the CUVS

Psalms 104 in the DBT

Psalms 104 in the DGDNT

Psalms 104 in the DHNT

Psalms 104 in the DNT

Psalms 104 in the ELBE

Psalms 104 in the EMTV

Psalms 104 in the ESV

Psalms 104 in the FBV

Psalms 104 in the FEB

Psalms 104 in the GGMNT

Psalms 104 in the GNT

Psalms 104 in the HARY

Psalms 104 in the HNT

Psalms 104 in the IRVA

Psalms 104 in the IRVB

Psalms 104 in the IRVG

Psalms 104 in the IRVH

Psalms 104 in the IRVK

Psalms 104 in the IRVM

Psalms 104 in the IRVM2

Psalms 104 in the IRVO

Psalms 104 in the IRVP

Psalms 104 in the IRVT

Psalms 104 in the IRVT2

Psalms 104 in the IRVU

Psalms 104 in the ISVN

Psalms 104 in the JSNT

Psalms 104 in the KAPI

Psalms 104 in the KBT1ETNIK

Psalms 104 in the KBV

Psalms 104 in the KJV

Psalms 104 in the KNFD

Psalms 104 in the LBA

Psalms 104 in the LBLA

Psalms 104 in the LNT

Psalms 104 in the LSV

Psalms 104 in the MAAL

Psalms 104 in the MBV

Psalms 104 in the MBV2

Psalms 104 in the MHNT

Psalms 104 in the MKNFD

Psalms 104 in the MNG

Psalms 104 in the MNT

Psalms 104 in the MNT2

Psalms 104 in the MRS1T

Psalms 104 in the NAA

Psalms 104 in the NASB

Psalms 104 in the NBLA

Psalms 104 in the NBS

Psalms 104 in the NBVTP

Psalms 104 in the NET2

Psalms 104 in the NIV11

Psalms 104 in the NNT

Psalms 104 in the NNT2

Psalms 104 in the NNT3

Psalms 104 in the PDDPT

Psalms 104 in the PFNT

Psalms 104 in the RMNT

Psalms 104 in the SBIAS

Psalms 104 in the SBIBS

Psalms 104 in the SBIBS2

Psalms 104 in the SBICS

Psalms 104 in the SBIDS

Psalms 104 in the SBIGS

Psalms 104 in the SBIHS

Psalms 104 in the SBIIS

Psalms 104 in the SBIIS2

Psalms 104 in the SBIIS3

Psalms 104 in the SBIKS

Psalms 104 in the SBIKS2

Psalms 104 in the SBIMS

Psalms 104 in the SBIOS

Psalms 104 in the SBIPS

Psalms 104 in the SBISS

Psalms 104 in the SBITS

Psalms 104 in the SBITS2

Psalms 104 in the SBITS3

Psalms 104 in the SBITS4

Psalms 104 in the SBIUS

Psalms 104 in the SBIVS

Psalms 104 in the SBT

Psalms 104 in the SBT1E

Psalms 104 in the SCHL

Psalms 104 in the SNT

Psalms 104 in the SUSU

Psalms 104 in the SUSU2

Psalms 104 in the SYNO

Psalms 104 in the TBIAOTANT

Psalms 104 in the TBT1E

Psalms 104 in the TBT1E2

Psalms 104 in the TFTIP

Psalms 104 in the TFTU

Psalms 104 in the TGNTATF3T

Psalms 104 in the THAI

Psalms 104 in the TNFD

Psalms 104 in the TNT

Psalms 104 in the TNTIK

Psalms 104 in the TNTIL

Psalms 104 in the TNTIN

Psalms 104 in the TNTIP

Psalms 104 in the TNTIZ

Psalms 104 in the TOMA

Psalms 104 in the TTENT

Psalms 104 in the UBG

Psalms 104 in the UGV

Psalms 104 in the UGV2

Psalms 104 in the UGV3

Psalms 104 in the VBL

Psalms 104 in the VDCC

Psalms 104 in the YALU

Psalms 104 in the YAPE

Psalms 104 in the YBVTP

Psalms 104 in the ZBP