Psalms 120 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Ana m akpọku ONYENWE ANYỊ nʼime nsogbu m,ọ na-azakwa m. 2 O ONYENWE ANYỊ, zọpụta msite nʼegbugbere ọnụ okwu ụghana ire na-ekwu okwu aghụghọ. 3 Gịnị ka a ga-eme gị,ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị,gị ire aghụghọ? 4 Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ,ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. 5 Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek,nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! 6 Ogologo ogeka m binyere ndị kpọrọ udo asị. 7 Abụ m onye udo;ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.