Psalms 121 (BOICB)
undefined Abụ nrigo. 1 Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,olee ebe inyeaka ga-esi bịara m? 2 Inyeaka m na-esite nʼaka ONYENWE ANYỊ,onye kere eluigwe na ụwa bịa. 3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; 4 nʼezie onye na-eche Izrel ncheadịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. 5 ONYENWE ANYỊ na-eche gị nche, ONYENWE ANYỊ bụ ndo gị nʼaka nri gị; 6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. 7 ONYENWE ANYỊ ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. 8 ONYENWE ANYỊ ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.