Psalms 131 (BOICB)
undefined Abụ nrigo, nke Devid. 1 O ONYENWE ANYỊ, nganga adịghị nʼobi m,ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị mmaọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m. 2 Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m. 3 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na ONYENWE ANYỊugbu a na mgbe niile ebighị ebi.