Psalms 133 (BOICB)
undefined Abụ nrigo, nke Devid. 1 Lee ka o si bụrụ ihe dị mmana ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu! 2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,ruokwa nʼolu uwe mwụda ya. 3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemonna-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.Nʼihi na nʼebe ahụ ka ONYENWE ANYỊ na-enye onyinye ngọzị ya,ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.