Psalms 142 (BOICB)
undefined Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. 1 Etikuru m ONYENWE ANYỊ mkpu akwa;ewelitara m olu m rịọ ONYENWE ANYỊ ka o meere m ebere. 2 Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya. 3 Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,ọ bụ gị maara ụzọ m.Nʼụzọ ebe m na-esi agaka ndị mmadụ siiri m ọnya. 4 Lee anya nʼaka nri m ma hụna ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.Enweghị m ebe mgbaba.Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi. 5 Ana m etiku gị mkpu akwa, o ONYENWE ANYỊ,na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,oke m nʼala ndị dị ndụ.” 6 Gee ntị na mkpu akwa m,nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,nʼihi na ha siri ike karịa m. 7 Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,ka m nwee ike too aha gị.Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburunʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.