Psalms 82 (BOICB)
undefined Abụ Ọma Asaf. 1 Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile. 2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela 3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha. 4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume. 5 Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji. 6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’ 7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.” 8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.