Revelation 1 (BOICB)

1 Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn, 2 onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst. 3 Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso. 4 Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya, 5 sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. 6 O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 7 “Lee, ọ na-abịa ya na igwe ojii.Anya niile ga-ahụkwa ya,ọ bụladị ndị ahụ niile mapuru ya ahụ, ha ga-ahụ ya.”Mmadụ niile nọ nʼụwa “ga-erukwa ụjụ nʼihi ya.”Otu a ka ọ ga-adị! Amen. 8 Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.” 9 Mụ onwe m, Jọn, nwanne unu nwoke, onye unu na ya na-enwekọ ahụhụ na nʼalaeze, na ntachiobi nke bụ oke anyị nʼime Jisọs. Anọ m nʼogbe ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Patmọs nʼihi okwu Chineke na-agba ama banyere Kraịst. 10 Nʼụbọchị Onyenwe anyị, anọ m nʼime Mmụọ ma nụ otu oke olu dara ụda dị ka opi ike nʼazụ m, 11 na-ekwu, “Dee ihe ị na-ahụ ugbu a nʼakwụkwọ zigara ya nzukọ asaa dị nʼEfesọs na Smyrna na Pegamọm na Tiatira na Sardis, na Filadelfia na Laodisia.” 12 Mgbe m chigharịrị, lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo kpụọ. 13 Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya. 14 Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike. 15 Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị. 16 O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile. 17 Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ. 18 Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. 19 “Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya. 20 Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.

In Other Versions

Revelation 1 in the ANGEFD

Revelation 1 in the ANTPNG2D

Revelation 1 in the AS21

Revelation 1 in the BAGH

Revelation 1 in the BBPNG

Revelation 1 in the BBT1E

Revelation 1 in the BDS

Revelation 1 in the BEV

Revelation 1 in the BHAD

Revelation 1 in the BIB

Revelation 1 in the BLPT

Revelation 1 in the BNT

Revelation 1 in the BNTABOOT

Revelation 1 in the BNTLV

Revelation 1 in the BOATCB

Revelation 1 in the BOATCB2

Revelation 1 in the BOBCV

Revelation 1 in the BOCNT

Revelation 1 in the BOECS

Revelation 1 in the BOGWICC

Revelation 1 in the BOHCB

Revelation 1 in the BOHCV

Revelation 1 in the BOHLNT

Revelation 1 in the BOHNTLTAL

Revelation 1 in the BOILNTAP

Revelation 1 in the BOITCV

Revelation 1 in the BOKCV

Revelation 1 in the BOKCV2

Revelation 1 in the BOKHWOG

Revelation 1 in the BOKSSV

Revelation 1 in the BOLCB

Revelation 1 in the BOLCB2

Revelation 1 in the BOMCV

Revelation 1 in the BONAV

Revelation 1 in the BONCB

Revelation 1 in the BONLT

Revelation 1 in the BONUT2

Revelation 1 in the BOPLNT

Revelation 1 in the BOSCB

Revelation 1 in the BOSNC

Revelation 1 in the BOTLNT

Revelation 1 in the BOVCB

Revelation 1 in the BOYCB

Revelation 1 in the BPBB

Revelation 1 in the BPH

Revelation 1 in the BSB

Revelation 1 in the CCB

Revelation 1 in the CUV

Revelation 1 in the CUVS

Revelation 1 in the DBT

Revelation 1 in the DGDNT

Revelation 1 in the DHNT

Revelation 1 in the DNT

Revelation 1 in the ELBE

Revelation 1 in the EMTV

Revelation 1 in the ESV

Revelation 1 in the FBV

Revelation 1 in the FEB

Revelation 1 in the GGMNT

Revelation 1 in the GNT

Revelation 1 in the HARY

Revelation 1 in the HNT

Revelation 1 in the IRVA

Revelation 1 in the IRVB

Revelation 1 in the IRVG

Revelation 1 in the IRVH

Revelation 1 in the IRVK

Revelation 1 in the IRVM

Revelation 1 in the IRVM2

Revelation 1 in the IRVO

Revelation 1 in the IRVP

Revelation 1 in the IRVT

Revelation 1 in the IRVT2

Revelation 1 in the IRVU

Revelation 1 in the ISVN

Revelation 1 in the JSNT

Revelation 1 in the KAPI

Revelation 1 in the KBT1ETNIK

Revelation 1 in the KBV

Revelation 1 in the KJV

Revelation 1 in the KNFD

Revelation 1 in the LBA

Revelation 1 in the LBLA

Revelation 1 in the LNT

Revelation 1 in the LSV

Revelation 1 in the MAAL

Revelation 1 in the MBV

Revelation 1 in the MBV2

Revelation 1 in the MHNT

Revelation 1 in the MKNFD

Revelation 1 in the MNG

Revelation 1 in the MNT

Revelation 1 in the MNT2

Revelation 1 in the MRS1T

Revelation 1 in the NAA

Revelation 1 in the NASB

Revelation 1 in the NBLA

Revelation 1 in the NBS

Revelation 1 in the NBVTP

Revelation 1 in the NET2

Revelation 1 in the NIV11

Revelation 1 in the NNT

Revelation 1 in the NNT2

Revelation 1 in the NNT3

Revelation 1 in the PDDPT

Revelation 1 in the PFNT

Revelation 1 in the RMNT

Revelation 1 in the SBIAS

Revelation 1 in the SBIBS

Revelation 1 in the SBIBS2

Revelation 1 in the SBICS

Revelation 1 in the SBIDS

Revelation 1 in the SBIGS

Revelation 1 in the SBIHS

Revelation 1 in the SBIIS

Revelation 1 in the SBIIS2

Revelation 1 in the SBIIS3

Revelation 1 in the SBIKS

Revelation 1 in the SBIKS2

Revelation 1 in the SBIMS

Revelation 1 in the SBIOS

Revelation 1 in the SBIPS

Revelation 1 in the SBISS

Revelation 1 in the SBITS

Revelation 1 in the SBITS2

Revelation 1 in the SBITS3

Revelation 1 in the SBITS4

Revelation 1 in the SBIUS

Revelation 1 in the SBIVS

Revelation 1 in the SBT

Revelation 1 in the SBT1E

Revelation 1 in the SCHL

Revelation 1 in the SNT

Revelation 1 in the SUSU

Revelation 1 in the SUSU2

Revelation 1 in the SYNO

Revelation 1 in the TBIAOTANT

Revelation 1 in the TBT1E

Revelation 1 in the TBT1E2

Revelation 1 in the TFTIP

Revelation 1 in the TFTU

Revelation 1 in the TGNTATF3T

Revelation 1 in the THAI

Revelation 1 in the TNFD

Revelation 1 in the TNT

Revelation 1 in the TNTIK

Revelation 1 in the TNTIL

Revelation 1 in the TNTIN

Revelation 1 in the TNTIP

Revelation 1 in the TNTIZ

Revelation 1 in the TOMA

Revelation 1 in the TTENT

Revelation 1 in the UBG

Revelation 1 in the UGV

Revelation 1 in the UGV2

Revelation 1 in the UGV3

Revelation 1 in the VBL

Revelation 1 in the VDCC

Revelation 1 in the YALU

Revelation 1 in the YAPE

Revelation 1 in the YBVTP

Revelation 1 in the ZBP