Revelation 16 (BOICB)
1 Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.” 2 Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala. 3 Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ. 4 Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara. 5 Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị,“I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ,na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a. 6 Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị.Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.” 7 Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị,“E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile,ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.” 8 Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ. 9 Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto. 10 Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ. 11 Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile. 12 Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe. 13 Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ. 14 Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 15 “Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.” 16 Ha kpọkọrọ ndị eze ahụ nʼotu ebe a na-akpọ Amagidọn nʼasụsụ Hibru. 17 Mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nʼefere nke ya nʼikuku, otu olu sitere nʼocheeze dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “Emezuola ya!” 18 Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nʼụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ. 19 Obodo ukwu ahụ kewara ụzọ atọ. Obodo niile dị na mba niile dakwara. Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O nyere ya iko jupụtara na mmanya nke nʼoke iwe nke ọnụma ya. 20 Mgbe ahụ, agwa etiti niile mikpuru, ugwu niile ghọrọ ala dị larịị. 21 Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nʼime ha ruru kilogram iri anọ na ọkara, sitere nʼeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nʼihi ihe ntaramahụhụ nke mkpụrụ mmiri ahụ, nʼihi na ihe ntaramahụhụ ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.
In Other Versions
Revelation 16 in the ANGEFD
Revelation 16 in the ANTPNG2D
Revelation 16 in the AS21
Revelation 16 in the BAGH
Revelation 16 in the BBPNG
Revelation 16 in the BBT1E
Revelation 16 in the BDS
Revelation 16 in the BEV
Revelation 16 in the BHAD
Revelation 16 in the BIB
Revelation 16 in the BLPT
Revelation 16 in the BNT
Revelation 16 in the BNTABOOT
Revelation 16 in the BNTLV
Revelation 16 in the BOATCB
Revelation 16 in the BOATCB2
Revelation 16 in the BOBCV
Revelation 16 in the BOCNT
Revelation 16 in the BOECS
Revelation 16 in the BOGWICC
Revelation 16 in the BOHCB
Revelation 16 in the BOHCV
Revelation 16 in the BOHLNT
Revelation 16 in the BOHNTLTAL
Revelation 16 in the BOILNTAP
Revelation 16 in the BOITCV
Revelation 16 in the BOKCV
Revelation 16 in the BOKCV2
Revelation 16 in the BOKHWOG
Revelation 16 in the BOKSSV
Revelation 16 in the BOLCB
Revelation 16 in the BOLCB2
Revelation 16 in the BOMCV
Revelation 16 in the BONAV
Revelation 16 in the BONCB
Revelation 16 in the BONLT
Revelation 16 in the BONUT2
Revelation 16 in the BOPLNT
Revelation 16 in the BOSCB
Revelation 16 in the BOSNC
Revelation 16 in the BOTLNT
Revelation 16 in the BOVCB
Revelation 16 in the BOYCB
Revelation 16 in the BPBB
Revelation 16 in the BPH
Revelation 16 in the BSB
Revelation 16 in the CCB
Revelation 16 in the CUV
Revelation 16 in the CUVS
Revelation 16 in the DBT
Revelation 16 in the DGDNT
Revelation 16 in the DHNT
Revelation 16 in the DNT
Revelation 16 in the ELBE
Revelation 16 in the EMTV
Revelation 16 in the ESV
Revelation 16 in the FBV
Revelation 16 in the FEB
Revelation 16 in the GGMNT
Revelation 16 in the GNT
Revelation 16 in the HARY
Revelation 16 in the HNT
Revelation 16 in the IRVA
Revelation 16 in the IRVB
Revelation 16 in the IRVG
Revelation 16 in the IRVH
Revelation 16 in the IRVK
Revelation 16 in the IRVM
Revelation 16 in the IRVM2
Revelation 16 in the IRVO
Revelation 16 in the IRVP
Revelation 16 in the IRVT
Revelation 16 in the IRVT2
Revelation 16 in the IRVU
Revelation 16 in the ISVN
Revelation 16 in the JSNT
Revelation 16 in the KAPI
Revelation 16 in the KBT1ETNIK
Revelation 16 in the KBV
Revelation 16 in the KJV
Revelation 16 in the KNFD
Revelation 16 in the LBA
Revelation 16 in the LBLA
Revelation 16 in the LNT
Revelation 16 in the LSV
Revelation 16 in the MAAL
Revelation 16 in the MBV
Revelation 16 in the MBV2
Revelation 16 in the MHNT
Revelation 16 in the MKNFD
Revelation 16 in the MNG
Revelation 16 in the MNT
Revelation 16 in the MNT2
Revelation 16 in the MRS1T
Revelation 16 in the NAA
Revelation 16 in the NASB
Revelation 16 in the NBLA
Revelation 16 in the NBS
Revelation 16 in the NBVTP
Revelation 16 in the NET2
Revelation 16 in the NIV11
Revelation 16 in the NNT
Revelation 16 in the NNT2
Revelation 16 in the NNT3
Revelation 16 in the PDDPT
Revelation 16 in the PFNT
Revelation 16 in the RMNT
Revelation 16 in the SBIAS
Revelation 16 in the SBIBS
Revelation 16 in the SBIBS2
Revelation 16 in the SBICS
Revelation 16 in the SBIDS
Revelation 16 in the SBIGS
Revelation 16 in the SBIHS
Revelation 16 in the SBIIS
Revelation 16 in the SBIIS2
Revelation 16 in the SBIIS3
Revelation 16 in the SBIKS
Revelation 16 in the SBIKS2
Revelation 16 in the SBIMS
Revelation 16 in the SBIOS
Revelation 16 in the SBIPS
Revelation 16 in the SBISS
Revelation 16 in the SBITS
Revelation 16 in the SBITS2
Revelation 16 in the SBITS3
Revelation 16 in the SBITS4
Revelation 16 in the SBIUS
Revelation 16 in the SBIVS
Revelation 16 in the SBT
Revelation 16 in the SBT1E
Revelation 16 in the SCHL
Revelation 16 in the SNT
Revelation 16 in the SUSU
Revelation 16 in the SUSU2
Revelation 16 in the SYNO
Revelation 16 in the TBIAOTANT
Revelation 16 in the TBT1E
Revelation 16 in the TBT1E2
Revelation 16 in the TFTIP
Revelation 16 in the TFTU
Revelation 16 in the TGNTATF3T
Revelation 16 in the THAI
Revelation 16 in the TNFD
Revelation 16 in the TNT
Revelation 16 in the TNTIK
Revelation 16 in the TNTIL
Revelation 16 in the TNTIN
Revelation 16 in the TNTIP
Revelation 16 in the TNTIZ
Revelation 16 in the TOMA
Revelation 16 in the TTENT
Revelation 16 in the UBG
Revelation 16 in the UGV
Revelation 16 in the UGV2
Revelation 16 in the UGV3
Revelation 16 in the VBL
Revelation 16 in the VDCC
Revelation 16 in the YALU
Revelation 16 in the YAPE
Revelation 16 in the YBVTP
Revelation 16 in the ZBP