Revelation 21 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa. 2 Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya. 3 Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. 4 Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.” 5 Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” 6 Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye. 7 Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m. 8 Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” 9 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” 10 O buuru m nʼime Mmụọ buga m nʼotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. O gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. 11 O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal. 12 Mgbidi ya niile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel nʼọnụ ụzọ ama ndị a nʼotu nʼotu. 13 Ọnụ ụzọ ama atọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, atọ dị nʼakụkụ ugwu, atọ dị nʼakụkụ ndịda, ebe atọ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 14 Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala ya. Nʼelu nkume ndị a nʼotu nʼotu ka e dere aha ndị ozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ. 15 Onye ahụ na-agwa m okwu ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nʼaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ama ya, na mgbidi ya. 16 Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ. 17 Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta. 18 Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ. 19 E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ, 20 nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti. 21 Ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ bụ pieal iri na abụọ, ọnụ ụzọ ama ọbụla ka e ji otu nkume pieal rụọ nʼotu nʼotu. Ihe e ji rụọ okporoụzọ dị nʼobodo ahụ bụ naanị ọlaedo a nụchara anụcha ọbụla, nke dị ọcha dịka enyo e hichaziri nke ọma. 22 O nweghị ụlọnsọ ukwu ọbụla m hụrụ nʼime obodo ahụ nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na Nwa Atụrụ ahụ bụ ụlọnsọ ukwu obodo ahụ nwere. 23 Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ maọbụ ọnwa mụkwasị ya, nʼihi na ebube nke Chineke bụ ìhè ya, oriọna ya bụkwa Nwa atụrụ ahụ. 24 Mba niile ga-eji ìhè ya jegharịa. Ndị eze ụwa niile ga-abịakwa webata ebube ha nʼime ya. 25 A naghị emechi ọnụ ụzọ ama obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị niile nʼihi abalị ọbụla adịghịkwa nʼebe ahụ. 26 Ebube na nsọpụrụ nke mba niile ka a ga-ewebata nʼime ya. 27 Ọ dịkwaghị ihe ọbụla rụrụ arụ ga-abata nʼime ya. Otu a kwa, ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, maọbụ onye ụgha ga-abata nʼime ya, kama ọ bụ naanị ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ Nwa Atụrụ ahụ.

In Other Versions

Revelation 21 in the ANGEFD

Revelation 21 in the ANTPNG2D

Revelation 21 in the AS21

Revelation 21 in the BAGH

Revelation 21 in the BBPNG

Revelation 21 in the BBT1E

Revelation 21 in the BDS

Revelation 21 in the BEV

Revelation 21 in the BHAD

Revelation 21 in the BIB

Revelation 21 in the BLPT

Revelation 21 in the BNT

Revelation 21 in the BNTABOOT

Revelation 21 in the BNTLV

Revelation 21 in the BOATCB

Revelation 21 in the BOATCB2

Revelation 21 in the BOBCV

Revelation 21 in the BOCNT

Revelation 21 in the BOECS

Revelation 21 in the BOGWICC

Revelation 21 in the BOHCB

Revelation 21 in the BOHCV

Revelation 21 in the BOHLNT

Revelation 21 in the BOHNTLTAL

Revelation 21 in the BOILNTAP

Revelation 21 in the BOITCV

Revelation 21 in the BOKCV

Revelation 21 in the BOKCV2

Revelation 21 in the BOKHWOG

Revelation 21 in the BOKSSV

Revelation 21 in the BOLCB

Revelation 21 in the BOLCB2

Revelation 21 in the BOMCV

Revelation 21 in the BONAV

Revelation 21 in the BONCB

Revelation 21 in the BONLT

Revelation 21 in the BONUT2

Revelation 21 in the BOPLNT

Revelation 21 in the BOSCB

Revelation 21 in the BOSNC

Revelation 21 in the BOTLNT

Revelation 21 in the BOVCB

Revelation 21 in the BOYCB

Revelation 21 in the BPBB

Revelation 21 in the BPH

Revelation 21 in the BSB

Revelation 21 in the CCB

Revelation 21 in the CUV

Revelation 21 in the CUVS

Revelation 21 in the DBT

Revelation 21 in the DGDNT

Revelation 21 in the DHNT

Revelation 21 in the DNT

Revelation 21 in the ELBE

Revelation 21 in the EMTV

Revelation 21 in the ESV

Revelation 21 in the FBV

Revelation 21 in the FEB

Revelation 21 in the GGMNT

Revelation 21 in the GNT

Revelation 21 in the HARY

Revelation 21 in the HNT

Revelation 21 in the IRVA

Revelation 21 in the IRVB

Revelation 21 in the IRVG

Revelation 21 in the IRVH

Revelation 21 in the IRVK

Revelation 21 in the IRVM

Revelation 21 in the IRVM2

Revelation 21 in the IRVO

Revelation 21 in the IRVP

Revelation 21 in the IRVT

Revelation 21 in the IRVT2

Revelation 21 in the IRVU

Revelation 21 in the ISVN

Revelation 21 in the JSNT

Revelation 21 in the KAPI

Revelation 21 in the KBT1ETNIK

Revelation 21 in the KBV

Revelation 21 in the KJV

Revelation 21 in the KNFD

Revelation 21 in the LBA

Revelation 21 in the LBLA

Revelation 21 in the LNT

Revelation 21 in the LSV

Revelation 21 in the MAAL

Revelation 21 in the MBV

Revelation 21 in the MBV2

Revelation 21 in the MHNT

Revelation 21 in the MKNFD

Revelation 21 in the MNG

Revelation 21 in the MNT

Revelation 21 in the MNT2

Revelation 21 in the MRS1T

Revelation 21 in the NAA

Revelation 21 in the NASB

Revelation 21 in the NBLA

Revelation 21 in the NBS

Revelation 21 in the NBVTP

Revelation 21 in the NET2

Revelation 21 in the NIV11

Revelation 21 in the NNT

Revelation 21 in the NNT2

Revelation 21 in the NNT3

Revelation 21 in the PDDPT

Revelation 21 in the PFNT

Revelation 21 in the RMNT

Revelation 21 in the SBIAS

Revelation 21 in the SBIBS

Revelation 21 in the SBIBS2

Revelation 21 in the SBICS

Revelation 21 in the SBIDS

Revelation 21 in the SBIGS

Revelation 21 in the SBIHS

Revelation 21 in the SBIIS

Revelation 21 in the SBIIS2

Revelation 21 in the SBIIS3

Revelation 21 in the SBIKS

Revelation 21 in the SBIKS2

Revelation 21 in the SBIMS

Revelation 21 in the SBIOS

Revelation 21 in the SBIPS

Revelation 21 in the SBISS

Revelation 21 in the SBITS

Revelation 21 in the SBITS2

Revelation 21 in the SBITS3

Revelation 21 in the SBITS4

Revelation 21 in the SBIUS

Revelation 21 in the SBIVS

Revelation 21 in the SBT

Revelation 21 in the SBT1E

Revelation 21 in the SCHL

Revelation 21 in the SNT

Revelation 21 in the SUSU

Revelation 21 in the SUSU2

Revelation 21 in the SYNO

Revelation 21 in the TBIAOTANT

Revelation 21 in the TBT1E

Revelation 21 in the TBT1E2

Revelation 21 in the TFTIP

Revelation 21 in the TFTU

Revelation 21 in the TGNTATF3T

Revelation 21 in the THAI

Revelation 21 in the TNFD

Revelation 21 in the TNT

Revelation 21 in the TNTIK

Revelation 21 in the TNTIL

Revelation 21 in the TNTIN

Revelation 21 in the TNTIP

Revelation 21 in the TNTIZ

Revelation 21 in the TOMA

Revelation 21 in the TTENT

Revelation 21 in the UBG

Revelation 21 in the UGV

Revelation 21 in the UGV2

Revelation 21 in the UGV3

Revelation 21 in the VBL

Revelation 21 in the VDCC

Revelation 21 in the YALU

Revelation 21 in the YAPE

Revelation 21 in the YBVTP

Revelation 21 in the ZBP