Revelation 4 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.” 2 Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya. 3 Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu. 4 Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nʼocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpueze e ji ọlaedo kpụọ nʼisi ha. 5 Mgbe ahụ, ụda dịka ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke sitere nʼocheeze ukwu ahụ na-ada na-achapụtakwa. Nʼihu ocheeze ukwu ahụ, e nwere oriọna asaa na-enwu ọkụ. Oriọna ndị a bụ mmụọ asaa nke Chineke. 6 Nʼihu ocheeze ahụ e nwere ihe dịka oke osimiri e ji enyo mee, nke na-enwu dịka kristal.Nʼetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ya, e nwere anụ anọ dị ndụ nwere anya nʼakụkụ ahụ ha niile, ihu na azụ. 7 Nke mbụ nʼime anụ ndị ahụ dị ndụ nwere oyiyi dịka ọdụm. Nke abụọ dịka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dịka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe. 8 Nke ọbụla nʼime ihe anọ ndị a dị ndụ nwere nku isii. Anya jupụtara nʼahụ ha niile na nʼime ha, ọ bụladị nʼokpuru nku ha. Ehihie na abalị niile, ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị,“ ‘Nsọ, Nsọ, Nsọka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile dị,’bụ onye ahụ dịkwaarị, onye ahụ na-adị, na onye ahụ na-aga ịbịa.” 9 Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, 10 iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, 11 “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị,kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike.Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile,ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha,ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”

In Other Versions

Revelation 4 in the ANGEFD

Revelation 4 in the ANTPNG2D

Revelation 4 in the AS21

Revelation 4 in the BAGH

Revelation 4 in the BBPNG

Revelation 4 in the BBT1E

Revelation 4 in the BDS

Revelation 4 in the BEV

Revelation 4 in the BHAD

Revelation 4 in the BIB

Revelation 4 in the BLPT

Revelation 4 in the BNT

Revelation 4 in the BNTABOOT

Revelation 4 in the BNTLV

Revelation 4 in the BOATCB

Revelation 4 in the BOATCB2

Revelation 4 in the BOBCV

Revelation 4 in the BOCNT

Revelation 4 in the BOECS

Revelation 4 in the BOGWICC

Revelation 4 in the BOHCB

Revelation 4 in the BOHCV

Revelation 4 in the BOHLNT

Revelation 4 in the BOHNTLTAL

Revelation 4 in the BOILNTAP

Revelation 4 in the BOITCV

Revelation 4 in the BOKCV

Revelation 4 in the BOKCV2

Revelation 4 in the BOKHWOG

Revelation 4 in the BOKSSV

Revelation 4 in the BOLCB

Revelation 4 in the BOLCB2

Revelation 4 in the BOMCV

Revelation 4 in the BONAV

Revelation 4 in the BONCB

Revelation 4 in the BONLT

Revelation 4 in the BONUT2

Revelation 4 in the BOPLNT

Revelation 4 in the BOSCB

Revelation 4 in the BOSNC

Revelation 4 in the BOTLNT

Revelation 4 in the BOVCB

Revelation 4 in the BOYCB

Revelation 4 in the BPBB

Revelation 4 in the BPH

Revelation 4 in the BSB

Revelation 4 in the CCB

Revelation 4 in the CUV

Revelation 4 in the CUVS

Revelation 4 in the DBT

Revelation 4 in the DGDNT

Revelation 4 in the DHNT

Revelation 4 in the DNT

Revelation 4 in the ELBE

Revelation 4 in the EMTV

Revelation 4 in the ESV

Revelation 4 in the FBV

Revelation 4 in the FEB

Revelation 4 in the GGMNT

Revelation 4 in the GNT

Revelation 4 in the HARY

Revelation 4 in the HNT

Revelation 4 in the IRVA

Revelation 4 in the IRVB

Revelation 4 in the IRVG

Revelation 4 in the IRVH

Revelation 4 in the IRVK

Revelation 4 in the IRVM

Revelation 4 in the IRVM2

Revelation 4 in the IRVO

Revelation 4 in the IRVP

Revelation 4 in the IRVT

Revelation 4 in the IRVT2

Revelation 4 in the IRVU

Revelation 4 in the ISVN

Revelation 4 in the JSNT

Revelation 4 in the KAPI

Revelation 4 in the KBT1ETNIK

Revelation 4 in the KBV

Revelation 4 in the KJV

Revelation 4 in the KNFD

Revelation 4 in the LBA

Revelation 4 in the LBLA

Revelation 4 in the LNT

Revelation 4 in the LSV

Revelation 4 in the MAAL

Revelation 4 in the MBV

Revelation 4 in the MBV2

Revelation 4 in the MHNT

Revelation 4 in the MKNFD

Revelation 4 in the MNG

Revelation 4 in the MNT

Revelation 4 in the MNT2

Revelation 4 in the MRS1T

Revelation 4 in the NAA

Revelation 4 in the NASB

Revelation 4 in the NBLA

Revelation 4 in the NBS

Revelation 4 in the NBVTP

Revelation 4 in the NET2

Revelation 4 in the NIV11

Revelation 4 in the NNT

Revelation 4 in the NNT2

Revelation 4 in the NNT3

Revelation 4 in the PDDPT

Revelation 4 in the PFNT

Revelation 4 in the RMNT

Revelation 4 in the SBIAS

Revelation 4 in the SBIBS

Revelation 4 in the SBIBS2

Revelation 4 in the SBICS

Revelation 4 in the SBIDS

Revelation 4 in the SBIGS

Revelation 4 in the SBIHS

Revelation 4 in the SBIIS

Revelation 4 in the SBIIS2

Revelation 4 in the SBIIS3

Revelation 4 in the SBIKS

Revelation 4 in the SBIKS2

Revelation 4 in the SBIMS

Revelation 4 in the SBIOS

Revelation 4 in the SBIPS

Revelation 4 in the SBISS

Revelation 4 in the SBITS

Revelation 4 in the SBITS2

Revelation 4 in the SBITS3

Revelation 4 in the SBITS4

Revelation 4 in the SBIUS

Revelation 4 in the SBIVS

Revelation 4 in the SBT

Revelation 4 in the SBT1E

Revelation 4 in the SCHL

Revelation 4 in the SNT

Revelation 4 in the SUSU

Revelation 4 in the SUSU2

Revelation 4 in the SYNO

Revelation 4 in the TBIAOTANT

Revelation 4 in the TBT1E

Revelation 4 in the TBT1E2

Revelation 4 in the TFTIP

Revelation 4 in the TFTU

Revelation 4 in the TGNTATF3T

Revelation 4 in the THAI

Revelation 4 in the TNFD

Revelation 4 in the TNT

Revelation 4 in the TNTIK

Revelation 4 in the TNTIL

Revelation 4 in the TNTIN

Revelation 4 in the TNTIP

Revelation 4 in the TNTIZ

Revelation 4 in the TOMA

Revelation 4 in the TTENT

Revelation 4 in the UBG

Revelation 4 in the UGV

Revelation 4 in the UGV2

Revelation 4 in the UGV3

Revelation 4 in the VBL

Revelation 4 in the VDCC

Revelation 4 in the YALU

Revelation 4 in the YAPE

Revelation 4 in the YBVTP

Revelation 4 in the ZBP