Romans 15 (BOICB)

1 Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. 2 Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. 3 Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!” 4 Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya. 5 Ka Chineke ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka Kraịst Jisọs nwere. 6 Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye Chineke na Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto. 7 Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka Kraịst nabatara unu, iji wetara Chineke otuto. 8 Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. 9 Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya,“Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ,aga m abụ abụ nye aha gị.” 10 O kwukwara ọzọ sị,“Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.” 11 Ọzọkwa,“Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile,ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.” 12 Ọzọkwa, Aịzaya na-asị,“Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ,onye nke ga-ebili ịchị mba niile,ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.” 13 Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ. 14 Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. 15 Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara Chineke nyere m, 16 abụ m onyeozi Kraịst Jisọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma Chineke, ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja Chineke ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ. 17 Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime Kraịst Jisọs banyere ọrụ m na-arụrụ Chineke. 18 Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ Kraịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye Chineke, site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, 19 nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke Chineke. Ya mere, site na Jerusalem ruo Ilirikom, ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma Kraịst. 20 Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, 21 ma dịka e dere ya,“Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ,ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.” 22 Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. 23 Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. 24 Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. 25 Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. 26 Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka. 27 Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. 28 Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen. 29 Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst. 30 Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke. 31 Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata. 32 Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu. 33 Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.

In Other Versions

Romans 15 in the ANGEFD

Romans 15 in the ANTPNG2D

Romans 15 in the AS21

Romans 15 in the BAGH

Romans 15 in the BBPNG

Romans 15 in the BBT1E

Romans 15 in the BDS

Romans 15 in the BEV

Romans 15 in the BHAD

Romans 15 in the BIB

Romans 15 in the BLPT

Romans 15 in the BNT

Romans 15 in the BNTABOOT

Romans 15 in the BNTLV

Romans 15 in the BOATCB

Romans 15 in the BOATCB2

Romans 15 in the BOBCV

Romans 15 in the BOCNT

Romans 15 in the BOECS

Romans 15 in the BOGWICC

Romans 15 in the BOHCB

Romans 15 in the BOHCV

Romans 15 in the BOHLNT

Romans 15 in the BOHNTLTAL

Romans 15 in the BOILNTAP

Romans 15 in the BOITCV

Romans 15 in the BOKCV

Romans 15 in the BOKCV2

Romans 15 in the BOKHWOG

Romans 15 in the BOKSSV

Romans 15 in the BOLCB

Romans 15 in the BOLCB2

Romans 15 in the BOMCV

Romans 15 in the BONAV

Romans 15 in the BONCB

Romans 15 in the BONLT

Romans 15 in the BONUT2

Romans 15 in the BOPLNT

Romans 15 in the BOSCB

Romans 15 in the BOSNC

Romans 15 in the BOTLNT

Romans 15 in the BOVCB

Romans 15 in the BOYCB

Romans 15 in the BPBB

Romans 15 in the BPH

Romans 15 in the BSB

Romans 15 in the CCB

Romans 15 in the CUV

Romans 15 in the CUVS

Romans 15 in the DBT

Romans 15 in the DGDNT

Romans 15 in the DHNT

Romans 15 in the DNT

Romans 15 in the ELBE

Romans 15 in the EMTV

Romans 15 in the ESV

Romans 15 in the FBV

Romans 15 in the FEB

Romans 15 in the GGMNT

Romans 15 in the GNT

Romans 15 in the HARY

Romans 15 in the HNT

Romans 15 in the IRVA

Romans 15 in the IRVB

Romans 15 in the IRVG

Romans 15 in the IRVH

Romans 15 in the IRVK

Romans 15 in the IRVM

Romans 15 in the IRVM2

Romans 15 in the IRVO

Romans 15 in the IRVP

Romans 15 in the IRVT

Romans 15 in the IRVT2

Romans 15 in the IRVU

Romans 15 in the ISVN

Romans 15 in the JSNT

Romans 15 in the KAPI

Romans 15 in the KBT1ETNIK

Romans 15 in the KBV

Romans 15 in the KJV

Romans 15 in the KNFD

Romans 15 in the LBA

Romans 15 in the LBLA

Romans 15 in the LNT

Romans 15 in the LSV

Romans 15 in the MAAL

Romans 15 in the MBV

Romans 15 in the MBV2

Romans 15 in the MHNT

Romans 15 in the MKNFD

Romans 15 in the MNG

Romans 15 in the MNT

Romans 15 in the MNT2

Romans 15 in the MRS1T

Romans 15 in the NAA

Romans 15 in the NASB

Romans 15 in the NBLA

Romans 15 in the NBS

Romans 15 in the NBVTP

Romans 15 in the NET2

Romans 15 in the NIV11

Romans 15 in the NNT

Romans 15 in the NNT2

Romans 15 in the NNT3

Romans 15 in the PDDPT

Romans 15 in the PFNT

Romans 15 in the RMNT

Romans 15 in the SBIAS

Romans 15 in the SBIBS

Romans 15 in the SBIBS2

Romans 15 in the SBICS

Romans 15 in the SBIDS

Romans 15 in the SBIGS

Romans 15 in the SBIHS

Romans 15 in the SBIIS

Romans 15 in the SBIIS2

Romans 15 in the SBIIS3

Romans 15 in the SBIKS

Romans 15 in the SBIKS2

Romans 15 in the SBIMS

Romans 15 in the SBIOS

Romans 15 in the SBIPS

Romans 15 in the SBISS

Romans 15 in the SBITS

Romans 15 in the SBITS2

Romans 15 in the SBITS3

Romans 15 in the SBITS4

Romans 15 in the SBIUS

Romans 15 in the SBIVS

Romans 15 in the SBT

Romans 15 in the SBT1E

Romans 15 in the SCHL

Romans 15 in the SNT

Romans 15 in the SUSU

Romans 15 in the SUSU2

Romans 15 in the SYNO

Romans 15 in the TBIAOTANT

Romans 15 in the TBT1E

Romans 15 in the TBT1E2

Romans 15 in the TFTIP

Romans 15 in the TFTU

Romans 15 in the TGNTATF3T

Romans 15 in the THAI

Romans 15 in the TNFD

Romans 15 in the TNT

Romans 15 in the TNTIK

Romans 15 in the TNTIL

Romans 15 in the TNTIN

Romans 15 in the TNTIP

Romans 15 in the TNTIZ

Romans 15 in the TOMA

Romans 15 in the TTENT

Romans 15 in the UBG

Romans 15 in the UGV

Romans 15 in the UGV2

Romans 15 in the UGV3

Romans 15 in the VBL

Romans 15 in the VDCC

Romans 15 in the YALU

Romans 15 in the YAPE

Romans 15 in the YBVTP

Romans 15 in the ZBP