Romans 4 (BOICB)
1 Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Ebraham, nna nna anyị na o nwetara ihe niile site nʼanụ ahụ? 2 A sị na a gụrụ Ebraham dịka onye ezi omume site nʼọrụ aka ya, ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji anya isi, ma na ọ bụghị nʼihu Chineke. 3 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.” 4 Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ. 5 Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. 6 Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya. 7 “Ngọzị na-adịrịndị a gbaghaara ajọ omume ha niile,ndị ekpuchikwara mmehie ha niile. 8 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.” 9 Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. 10 Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu. 11 Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. 12 Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu. 13 Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 14 Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla. 15 Nʼihi na iwu nʼonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Ma ebe iwu na-adịghị, mmehie adịghịkwa. 16 Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile. 17 Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị. 18 Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” 19 Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20 Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. 21 O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. 22 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume. 23 Okwu ndị a, “A gụrụ ya nye ya dịka onye ezi omume,” edeghị ya naanị maka ya. 24 Kama e dere ya nʼihi anyị bụ ndị kwere nʼonye ahụ mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie. 25 Onye a rara nye ka ọ nwụọ nʼihi mmehie anyị niile, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume.
In Other Versions
Romans 4 in the ANGEFD
Romans 4 in the ANTPNG2D
Romans 4 in the AS21
Romans 4 in the BAGH
Romans 4 in the BBPNG
Romans 4 in the BBT1E
Romans 4 in the BDS
Romans 4 in the BEV
Romans 4 in the BHAD
Romans 4 in the BIB
Romans 4 in the BLPT
Romans 4 in the BNT
Romans 4 in the BNTABOOT
Romans 4 in the BNTLV
Romans 4 in the BOATCB
Romans 4 in the BOATCB2
Romans 4 in the BOBCV
Romans 4 in the BOCNT
Romans 4 in the BOECS
Romans 4 in the BOGWICC
Romans 4 in the BOHCB
Romans 4 in the BOHCV
Romans 4 in the BOHLNT
Romans 4 in the BOHNTLTAL
Romans 4 in the BOILNTAP
Romans 4 in the BOITCV
Romans 4 in the BOKCV
Romans 4 in the BOKCV2
Romans 4 in the BOKHWOG
Romans 4 in the BOKSSV
Romans 4 in the BOLCB
Romans 4 in the BOLCB2
Romans 4 in the BOMCV
Romans 4 in the BONAV
Romans 4 in the BONCB
Romans 4 in the BONLT
Romans 4 in the BONUT2
Romans 4 in the BOPLNT
Romans 4 in the BOSCB
Romans 4 in the BOSNC
Romans 4 in the BOTLNT
Romans 4 in the BOVCB
Romans 4 in the BOYCB
Romans 4 in the BPBB
Romans 4 in the BPH
Romans 4 in the BSB
Romans 4 in the CCB
Romans 4 in the CUV
Romans 4 in the CUVS
Romans 4 in the DBT
Romans 4 in the DGDNT
Romans 4 in the DHNT
Romans 4 in the DNT
Romans 4 in the ELBE
Romans 4 in the EMTV
Romans 4 in the ESV
Romans 4 in the FBV
Romans 4 in the FEB
Romans 4 in the GGMNT
Romans 4 in the GNT
Romans 4 in the HARY
Romans 4 in the HNT
Romans 4 in the IRVA
Romans 4 in the IRVB
Romans 4 in the IRVG
Romans 4 in the IRVH
Romans 4 in the IRVK
Romans 4 in the IRVM
Romans 4 in the IRVM2
Romans 4 in the IRVO
Romans 4 in the IRVP
Romans 4 in the IRVT
Romans 4 in the IRVT2
Romans 4 in the IRVU
Romans 4 in the ISVN
Romans 4 in the JSNT
Romans 4 in the KAPI
Romans 4 in the KBT1ETNIK
Romans 4 in the KBV
Romans 4 in the KJV
Romans 4 in the KNFD
Romans 4 in the LBA
Romans 4 in the LBLA
Romans 4 in the LNT
Romans 4 in the LSV
Romans 4 in the MAAL
Romans 4 in the MBV
Romans 4 in the MBV2
Romans 4 in the MHNT
Romans 4 in the MKNFD
Romans 4 in the MNG
Romans 4 in the MNT
Romans 4 in the MNT2
Romans 4 in the MRS1T
Romans 4 in the NAA
Romans 4 in the NASB
Romans 4 in the NBLA
Romans 4 in the NBS
Romans 4 in the NBVTP
Romans 4 in the NET2
Romans 4 in the NIV11
Romans 4 in the NNT
Romans 4 in the NNT2
Romans 4 in the NNT3
Romans 4 in the PDDPT
Romans 4 in the PFNT
Romans 4 in the RMNT
Romans 4 in the SBIAS
Romans 4 in the SBIBS
Romans 4 in the SBIBS2
Romans 4 in the SBICS
Romans 4 in the SBIDS
Romans 4 in the SBIGS
Romans 4 in the SBIHS
Romans 4 in the SBIIS
Romans 4 in the SBIIS2
Romans 4 in the SBIIS3
Romans 4 in the SBIKS
Romans 4 in the SBIKS2
Romans 4 in the SBIMS
Romans 4 in the SBIOS
Romans 4 in the SBIPS
Romans 4 in the SBISS
Romans 4 in the SBITS
Romans 4 in the SBITS2
Romans 4 in the SBITS3
Romans 4 in the SBITS4
Romans 4 in the SBIUS
Romans 4 in the SBIVS
Romans 4 in the SBT
Romans 4 in the SBT1E
Romans 4 in the SCHL
Romans 4 in the SNT
Romans 4 in the SUSU
Romans 4 in the SUSU2
Romans 4 in the SYNO
Romans 4 in the TBIAOTANT
Romans 4 in the TBT1E
Romans 4 in the TBT1E2
Romans 4 in the TFTIP
Romans 4 in the TFTU
Romans 4 in the TGNTATF3T
Romans 4 in the THAI
Romans 4 in the TNFD
Romans 4 in the TNT
Romans 4 in the TNTIK
Romans 4 in the TNTIL
Romans 4 in the TNTIN
Romans 4 in the TNTIP
Romans 4 in the TNTIZ
Romans 4 in the TOMA
Romans 4 in the TTENT
Romans 4 in the UBG
Romans 4 in the UGV
Romans 4 in the UGV2
Romans 4 in the UGV3
Romans 4 in the VBL
Romans 4 in the VDCC
Romans 4 in the YALU
Romans 4 in the YAPE
Romans 4 in the YBVTP
Romans 4 in the ZBP