1 Peter 3 (BOICB)

1 Unu ndị bụ nwunye na-eruberenụ di unu isi, ka ụfọdụ nʼime ha na-ekweghị nʼokwu Chineke, nwee ike isi nʼezi ndụ unu na-ebi chegharịa nʼekwughị okwu ọbụla, 2 mgbe ha na-ahụ ibi ndụ unu nke dị ọcha na nke inwe nsọpụrụ. 3 Ịchọ mma unu agaghị abụ ịchọ mma nke anụ ahụ, nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, maọbụ iyikwasị uwe mara mma. 4 Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. 5 Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha. 6 Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu. 7 Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu. 8 Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala. 9 Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu. 10 Nʼihi na,“Onye ọbụla nke na-achọ ndụ,nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma,ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọmeekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ. 11 Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe;ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya. 12 Nʼihi na anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,ntị ya gheekwa oghe nye ekpere ha,ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.” 13 Onye ga-emegide unu ma ọ bụrụ na unu na-anụ ọkụ nʼobi ime ezi ihe? 14 Ma a sịkwarị na unu ahụ ahụhụ nʼihi na unu mere ihe ziri ezi, ngọzị dịrị unu. “Unu atụla egwu ihe ha na-atụ egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.” 15 Na-edonụ Kraịst nsọ nʼime obi unu dịka Onyenwe anyị. Nọọkwanụ na njikere mgbe niile iguzo kọwaara onye ọbụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nʼime unu. Ma unu were obi dị nwayọọ na nsọpụrụ na-eme nke a. 16 Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu. 17 Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe. 18 Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya. 19 Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ. 20 Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ. 21 Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst, 22 onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.

In Other Versions

1 Peter 3 in the ANGEFD

1 Peter 3 in the ANTPNG2D

1 Peter 3 in the AS21

1 Peter 3 in the BAGH

1 Peter 3 in the BBPNG

1 Peter 3 in the BBT1E

1 Peter 3 in the BDS

1 Peter 3 in the BEV

1 Peter 3 in the BHAD

1 Peter 3 in the BIB

1 Peter 3 in the BLPT

1 Peter 3 in the BNT

1 Peter 3 in the BNTABOOT

1 Peter 3 in the BNTLV

1 Peter 3 in the BOATCB

1 Peter 3 in the BOATCB2

1 Peter 3 in the BOBCV

1 Peter 3 in the BOCNT

1 Peter 3 in the BOECS

1 Peter 3 in the BOGWICC

1 Peter 3 in the BOHCB

1 Peter 3 in the BOHCV

1 Peter 3 in the BOHLNT

1 Peter 3 in the BOHNTLTAL

1 Peter 3 in the BOILNTAP

1 Peter 3 in the BOITCV

1 Peter 3 in the BOKCV

1 Peter 3 in the BOKCV2

1 Peter 3 in the BOKHWOG

1 Peter 3 in the BOKSSV

1 Peter 3 in the BOLCB

1 Peter 3 in the BOLCB2

1 Peter 3 in the BOMCV

1 Peter 3 in the BONAV

1 Peter 3 in the BONCB

1 Peter 3 in the BONLT

1 Peter 3 in the BONUT2

1 Peter 3 in the BOPLNT

1 Peter 3 in the BOSCB

1 Peter 3 in the BOSNC

1 Peter 3 in the BOTLNT

1 Peter 3 in the BOVCB

1 Peter 3 in the BOYCB

1 Peter 3 in the BPBB

1 Peter 3 in the BPH

1 Peter 3 in the BSB

1 Peter 3 in the CCB

1 Peter 3 in the CUV

1 Peter 3 in the CUVS

1 Peter 3 in the DBT

1 Peter 3 in the DGDNT

1 Peter 3 in the DHNT

1 Peter 3 in the DNT

1 Peter 3 in the ELBE

1 Peter 3 in the EMTV

1 Peter 3 in the ESV

1 Peter 3 in the FBV

1 Peter 3 in the FEB

1 Peter 3 in the GGMNT

1 Peter 3 in the GNT

1 Peter 3 in the HARY

1 Peter 3 in the HNT

1 Peter 3 in the IRVA

1 Peter 3 in the IRVB

1 Peter 3 in the IRVG

1 Peter 3 in the IRVH

1 Peter 3 in the IRVK

1 Peter 3 in the IRVM

1 Peter 3 in the IRVM2

1 Peter 3 in the IRVO

1 Peter 3 in the IRVP

1 Peter 3 in the IRVT

1 Peter 3 in the IRVT2

1 Peter 3 in the IRVU

1 Peter 3 in the ISVN

1 Peter 3 in the JSNT

1 Peter 3 in the KAPI

1 Peter 3 in the KBT1ETNIK

1 Peter 3 in the KBV

1 Peter 3 in the KJV

1 Peter 3 in the KNFD

1 Peter 3 in the LBA

1 Peter 3 in the LBLA

1 Peter 3 in the LNT

1 Peter 3 in the LSV

1 Peter 3 in the MAAL

1 Peter 3 in the MBV

1 Peter 3 in the MBV2

1 Peter 3 in the MHNT

1 Peter 3 in the MKNFD

1 Peter 3 in the MNG

1 Peter 3 in the MNT

1 Peter 3 in the MNT2

1 Peter 3 in the MRS1T

1 Peter 3 in the NAA

1 Peter 3 in the NASB

1 Peter 3 in the NBLA

1 Peter 3 in the NBS

1 Peter 3 in the NBVTP

1 Peter 3 in the NET2

1 Peter 3 in the NIV11

1 Peter 3 in the NNT

1 Peter 3 in the NNT2

1 Peter 3 in the NNT3

1 Peter 3 in the PDDPT

1 Peter 3 in the PFNT

1 Peter 3 in the RMNT

1 Peter 3 in the SBIAS

1 Peter 3 in the SBIBS

1 Peter 3 in the SBIBS2

1 Peter 3 in the SBICS

1 Peter 3 in the SBIDS

1 Peter 3 in the SBIGS

1 Peter 3 in the SBIHS

1 Peter 3 in the SBIIS

1 Peter 3 in the SBIIS2

1 Peter 3 in the SBIIS3

1 Peter 3 in the SBIKS

1 Peter 3 in the SBIKS2

1 Peter 3 in the SBIMS

1 Peter 3 in the SBIOS

1 Peter 3 in the SBIPS

1 Peter 3 in the SBISS

1 Peter 3 in the SBITS

1 Peter 3 in the SBITS2

1 Peter 3 in the SBITS3

1 Peter 3 in the SBITS4

1 Peter 3 in the SBIUS

1 Peter 3 in the SBIVS

1 Peter 3 in the SBT

1 Peter 3 in the SBT1E

1 Peter 3 in the SCHL

1 Peter 3 in the SNT

1 Peter 3 in the SUSU

1 Peter 3 in the SUSU2

1 Peter 3 in the SYNO

1 Peter 3 in the TBIAOTANT

1 Peter 3 in the TBT1E

1 Peter 3 in the TBT1E2

1 Peter 3 in the TFTIP

1 Peter 3 in the TFTU

1 Peter 3 in the TGNTATF3T

1 Peter 3 in the THAI

1 Peter 3 in the TNFD

1 Peter 3 in the TNT

1 Peter 3 in the TNTIK

1 Peter 3 in the TNTIL

1 Peter 3 in the TNTIN

1 Peter 3 in the TNTIP

1 Peter 3 in the TNTIZ

1 Peter 3 in the TOMA

1 Peter 3 in the TTENT

1 Peter 3 in the UBG

1 Peter 3 in the UGV

1 Peter 3 in the UGV2

1 Peter 3 in the UGV3

1 Peter 3 in the VBL

1 Peter 3 in the VDCC

1 Peter 3 in the YALU

1 Peter 3 in the YAPE

1 Peter 3 in the YBVTP

1 Peter 3 in the ZBP