2 Chronicles 13 (BOICB)

1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam. 2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, otu nʼime ụmụ nwanyị Uriel, onye Gibea.Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam. 3 Abija họpụtara ndị ya dị ike nʼagha bụ ndị ọnụọgụgụ ha dị narị puku anọ, ma Jeroboam eze Izrel họpụtara ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku asatọ doo ha nʼusoro. 4 Abija guzoro nʼugwu Zemaraim nʼala ugwu ugwu Ifrem jiri oke olu sị “Jeroboam na ndị Izrel niile geenụ m ntị! 5 Unu amataghị na ONYENWE ANYỊ Chineke nke Izrel esitela nʼọgbụgba ndụ nnu nyefee ọchịchị ala Izrel niile nʼaka Devid na ụmụ ụmụ ya ruo ebighị ebi? 6 Ma Jeroboam, nwa Nebat, bụ onye ọrụ Solomọn nwa Devid, nupuru isi megide onyenwe ya. 7 Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha. 8 “Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze ONYENWE ANYỊ nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu. 9 Ma unu achụpụghị ndị nchụaja ONYENWE ANYỊ, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi. 10 “Ma banyere anyị, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere ONYENWE ANYỊ ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka. 11 Ha na-achụ aja nye ONYENWE ANYỊ kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ. 12 Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!” 13 Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ. 14 Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha. 15 Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel. 16 Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda. 17 Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ. 18 Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime ONYENWE ANYỊ Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel. 19 Abija chụkwara Jeroboam na ndị agha ya ọsọ dọta obodo ndị a nʼagha: Betel, na Jeshana, na Efrọn, na obodo niile gbara ha gburugburu. 20 Jeroboam enwetakwaghị ike ya ọzọ oge niile Abija nọ dịka eze. Ma ọ dịghị anya ONYENWE ANYỊ tidara ya tigbuo ya. 21 Ma Abija gara nʼihu bụrụ onye dị ike, ọ lụrụ nwunye iri na anọ, mụọ iri ụmụ nwoke abụọ na abụọ, na ụmụ ndị nwanyị iri na isii. 22 Akụkọ niile banyere ọchịchị Abija, ihe o mere na ihe o kwuru, dị nʼakwụkwọ akụkọ nke Ido onye amụma dere.

In Other Versions

2 Chronicles 13 in the ANGEFD

2 Chronicles 13 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 13 in the AS21

2 Chronicles 13 in the BAGH

2 Chronicles 13 in the BBPNG

2 Chronicles 13 in the BBT1E

2 Chronicles 13 in the BDS

2 Chronicles 13 in the BEV

2 Chronicles 13 in the BHAD

2 Chronicles 13 in the BIB

2 Chronicles 13 in the BLPT

2 Chronicles 13 in the BNT

2 Chronicles 13 in the BNTABOOT

2 Chronicles 13 in the BNTLV

2 Chronicles 13 in the BOATCB

2 Chronicles 13 in the BOATCB2

2 Chronicles 13 in the BOBCV

2 Chronicles 13 in the BOCNT

2 Chronicles 13 in the BOECS

2 Chronicles 13 in the BOGWICC

2 Chronicles 13 in the BOHCB

2 Chronicles 13 in the BOHCV

2 Chronicles 13 in the BOHLNT

2 Chronicles 13 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 13 in the BOILNTAP

2 Chronicles 13 in the BOITCV

2 Chronicles 13 in the BOKCV

2 Chronicles 13 in the BOKCV2

2 Chronicles 13 in the BOKHWOG

2 Chronicles 13 in the BOKSSV

2 Chronicles 13 in the BOLCB

2 Chronicles 13 in the BOLCB2

2 Chronicles 13 in the BOMCV

2 Chronicles 13 in the BONAV

2 Chronicles 13 in the BONCB

2 Chronicles 13 in the BONLT

2 Chronicles 13 in the BONUT2

2 Chronicles 13 in the BOPLNT

2 Chronicles 13 in the BOSCB

2 Chronicles 13 in the BOSNC

2 Chronicles 13 in the BOTLNT

2 Chronicles 13 in the BOVCB

2 Chronicles 13 in the BOYCB

2 Chronicles 13 in the BPBB

2 Chronicles 13 in the BPH

2 Chronicles 13 in the BSB

2 Chronicles 13 in the CCB

2 Chronicles 13 in the CUV

2 Chronicles 13 in the CUVS

2 Chronicles 13 in the DBT

2 Chronicles 13 in the DGDNT

2 Chronicles 13 in the DHNT

2 Chronicles 13 in the DNT

2 Chronicles 13 in the ELBE

2 Chronicles 13 in the EMTV

2 Chronicles 13 in the ESV

2 Chronicles 13 in the FBV

2 Chronicles 13 in the FEB

2 Chronicles 13 in the GGMNT

2 Chronicles 13 in the GNT

2 Chronicles 13 in the HARY

2 Chronicles 13 in the HNT

2 Chronicles 13 in the IRVA

2 Chronicles 13 in the IRVB

2 Chronicles 13 in the IRVG

2 Chronicles 13 in the IRVH

2 Chronicles 13 in the IRVK

2 Chronicles 13 in the IRVM

2 Chronicles 13 in the IRVM2

2 Chronicles 13 in the IRVO

2 Chronicles 13 in the IRVP

2 Chronicles 13 in the IRVT

2 Chronicles 13 in the IRVT2

2 Chronicles 13 in the IRVU

2 Chronicles 13 in the ISVN

2 Chronicles 13 in the JSNT

2 Chronicles 13 in the KAPI

2 Chronicles 13 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 13 in the KBV

2 Chronicles 13 in the KJV

2 Chronicles 13 in the KNFD

2 Chronicles 13 in the LBA

2 Chronicles 13 in the LBLA

2 Chronicles 13 in the LNT

2 Chronicles 13 in the LSV

2 Chronicles 13 in the MAAL

2 Chronicles 13 in the MBV

2 Chronicles 13 in the MBV2

2 Chronicles 13 in the MHNT

2 Chronicles 13 in the MKNFD

2 Chronicles 13 in the MNG

2 Chronicles 13 in the MNT

2 Chronicles 13 in the MNT2

2 Chronicles 13 in the MRS1T

2 Chronicles 13 in the NAA

2 Chronicles 13 in the NASB

2 Chronicles 13 in the NBLA

2 Chronicles 13 in the NBS

2 Chronicles 13 in the NBVTP

2 Chronicles 13 in the NET2

2 Chronicles 13 in the NIV11

2 Chronicles 13 in the NNT

2 Chronicles 13 in the NNT2

2 Chronicles 13 in the NNT3

2 Chronicles 13 in the PDDPT

2 Chronicles 13 in the PFNT

2 Chronicles 13 in the RMNT

2 Chronicles 13 in the SBIAS

2 Chronicles 13 in the SBIBS

2 Chronicles 13 in the SBIBS2

2 Chronicles 13 in the SBICS

2 Chronicles 13 in the SBIDS

2 Chronicles 13 in the SBIGS

2 Chronicles 13 in the SBIHS

2 Chronicles 13 in the SBIIS

2 Chronicles 13 in the SBIIS2

2 Chronicles 13 in the SBIIS3

2 Chronicles 13 in the SBIKS

2 Chronicles 13 in the SBIKS2

2 Chronicles 13 in the SBIMS

2 Chronicles 13 in the SBIOS

2 Chronicles 13 in the SBIPS

2 Chronicles 13 in the SBISS

2 Chronicles 13 in the SBITS

2 Chronicles 13 in the SBITS2

2 Chronicles 13 in the SBITS3

2 Chronicles 13 in the SBITS4

2 Chronicles 13 in the SBIUS

2 Chronicles 13 in the SBIVS

2 Chronicles 13 in the SBT

2 Chronicles 13 in the SBT1E

2 Chronicles 13 in the SCHL

2 Chronicles 13 in the SNT

2 Chronicles 13 in the SUSU

2 Chronicles 13 in the SUSU2

2 Chronicles 13 in the SYNO

2 Chronicles 13 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 13 in the TBT1E

2 Chronicles 13 in the TBT1E2

2 Chronicles 13 in the TFTIP

2 Chronicles 13 in the TFTU

2 Chronicles 13 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 13 in the THAI

2 Chronicles 13 in the TNFD

2 Chronicles 13 in the TNT

2 Chronicles 13 in the TNTIK

2 Chronicles 13 in the TNTIL

2 Chronicles 13 in the TNTIN

2 Chronicles 13 in the TNTIP

2 Chronicles 13 in the TNTIZ

2 Chronicles 13 in the TOMA

2 Chronicles 13 in the TTENT

2 Chronicles 13 in the UBG

2 Chronicles 13 in the UGV

2 Chronicles 13 in the UGV2

2 Chronicles 13 in the UGV3

2 Chronicles 13 in the VBL

2 Chronicles 13 in the VDCC

2 Chronicles 13 in the YALU

2 Chronicles 13 in the YAPE

2 Chronicles 13 in the YBVTP

2 Chronicles 13 in the ZBP