2 Chronicles 23 (BOICB)

1 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada gosiri ịdị ike nke obi ya. Ya na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha gbara ndụ. Ndị a bụ: Azaraya nwa Jeroham, Ishmel nwa Jehohanan, Azaraya nwa Obed, Maaseia nwa Adaya na Elishafat nwa Zikri. 2 Ha pụrụ gaa akụkụ niile nke ala Juda kpọkọta ndị Livayị na ndịisi ezinaụlọ Izrel site nʼobodo niile. Mgbe ha bịarutere Jerusalem, 3 ọgbakọ ahụ niile na eze gbara ndụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke.Mgbe ahụ, Jehoiada sịrị ha, “Nwa eze ga-achị dịka ONYENWE ANYỊ kwere na nkwa banyere agbụrụ Devid. 4 Ugbu a, nke a bụ ihe unu ga-eme: Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị nchụaja na ndị Livayị, bụ ndị ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike ga-abụ ndị ga-eche ọnụ ụzọ niile nche. 5 Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ọzọ ga-anọ nʼụlọeze, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Ntọala. Ndị ọzọ niile ga-anọ gburugburu mpụta ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 6 Ọ dịghị onye ọbụla ga-abata nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ karịa naanị ndị nchụaja na ndị Livayị ndị nọ ọrụ, ha ga-abata nʼihi ha bụ ndị edoro nsọ, ma ndị ọzọ niile ga-edebe iwu ONYENWE ANYỊ, ghara ịbata. 7 Ndị Livayị ga-edo onwe ha gburugburu eze, onye ọbụla ga e jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla batara nʼime ụlọnsọ ahụ ka a ga-egbu. Nọrọnụ eze nso, ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.” 8 Ndị Livayị na ndị ikom Juda niile mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike ma ndị na-emechi ọrụ. Nʼihi na Jehoiada onye nchụaja ezipụghị otu ọbụla nʼime ndị ọrụ ahụ niile. 9 O nyere ndị ọchịagha ahụ na-elekọta narị ndị agha, ùbe na ọta ukwu na ọta nta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, bụ ndị dị nʼụlọnsọ Chineke. 10 O guzobere ndị ikom niile ahụ, onye ọbụla ji ngwa agha ya nʼaka ya, nọdụ eze gburugburu na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu ahụ. Site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. 11 Jehoiada na ụmụ ya ndị ikom kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, ha nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze, tie mkpu sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!” 12 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ ndị mmadụ, ndị na-agba ọsọ na-eto eze, ọ gakwuru ha nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 13 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi ya dị na mbata. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze, ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Ndị ọbụ abụ jikwa iti egwu na-edu nʼabụ otuto. Mgbe ahụ, Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nke a bụ nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!” 14 Jehoiada, bụ onye nchụaja zipụrụ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, sị ha, “Sitenụ nʼetiti ahịrị ahụ kpụpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Ka egbula ya na ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ.” 15 Ya mere, ha jidere ya mgbe o rutere na mbata nke ọnụ ụzọ ịnyịnya nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha gburu ya. 16 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị, na ya, na ndị mmadụ, na eze, ga-abụ ndị nke ONYENWE ANYỊ. 17 Ndị niile ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. 18 Mgbe ahụ, Jehoiada nyefere nlekọta nke ụlọnsọ ukwuu ONYENWE ANYỊ nʼaka ndị nchụaja bụ ndị Livayị, bụ ndị Devid nyere ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ nke ONYENWE ANYỊ nʼime ụlọnsọ, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, nʼiji ọṅụ na ịbụ abụ dịka Devid nyere nʼiwu. 19 O debekwara ndị nche nʼọnụ ụzọ ama ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, igbochi ka onye ọbụla nke na-adịghị ọcha nʼụzọ ọbụla ghara ịbanye. 20 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị a na-asọpụrụ, na ndị na-achị achị, na ndị ala ahụ niile, dupụta eze site nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Ha bara nʼụlọeze site nʼọnụ ụzọ ama nke dị Elu, mee ka eze nọkwasị nʼelu ocheeze. 21 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.

In Other Versions

2 Chronicles 23 in the ANGEFD

2 Chronicles 23 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 23 in the AS21

2 Chronicles 23 in the BAGH

2 Chronicles 23 in the BBPNG

2 Chronicles 23 in the BBT1E

2 Chronicles 23 in the BDS

2 Chronicles 23 in the BEV

2 Chronicles 23 in the BHAD

2 Chronicles 23 in the BIB

2 Chronicles 23 in the BLPT

2 Chronicles 23 in the BNT

2 Chronicles 23 in the BNTABOOT

2 Chronicles 23 in the BNTLV

2 Chronicles 23 in the BOATCB

2 Chronicles 23 in the BOATCB2

2 Chronicles 23 in the BOBCV

2 Chronicles 23 in the BOCNT

2 Chronicles 23 in the BOECS

2 Chronicles 23 in the BOGWICC

2 Chronicles 23 in the BOHCB

2 Chronicles 23 in the BOHCV

2 Chronicles 23 in the BOHLNT

2 Chronicles 23 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 23 in the BOILNTAP

2 Chronicles 23 in the BOITCV

2 Chronicles 23 in the BOKCV

2 Chronicles 23 in the BOKCV2

2 Chronicles 23 in the BOKHWOG

2 Chronicles 23 in the BOKSSV

2 Chronicles 23 in the BOLCB

2 Chronicles 23 in the BOLCB2

2 Chronicles 23 in the BOMCV

2 Chronicles 23 in the BONAV

2 Chronicles 23 in the BONCB

2 Chronicles 23 in the BONLT

2 Chronicles 23 in the BONUT2

2 Chronicles 23 in the BOPLNT

2 Chronicles 23 in the BOSCB

2 Chronicles 23 in the BOSNC

2 Chronicles 23 in the BOTLNT

2 Chronicles 23 in the BOVCB

2 Chronicles 23 in the BOYCB

2 Chronicles 23 in the BPBB

2 Chronicles 23 in the BPH

2 Chronicles 23 in the BSB

2 Chronicles 23 in the CCB

2 Chronicles 23 in the CUV

2 Chronicles 23 in the CUVS

2 Chronicles 23 in the DBT

2 Chronicles 23 in the DGDNT

2 Chronicles 23 in the DHNT

2 Chronicles 23 in the DNT

2 Chronicles 23 in the ELBE

2 Chronicles 23 in the EMTV

2 Chronicles 23 in the ESV

2 Chronicles 23 in the FBV

2 Chronicles 23 in the FEB

2 Chronicles 23 in the GGMNT

2 Chronicles 23 in the GNT

2 Chronicles 23 in the HARY

2 Chronicles 23 in the HNT

2 Chronicles 23 in the IRVA

2 Chronicles 23 in the IRVB

2 Chronicles 23 in the IRVG

2 Chronicles 23 in the IRVH

2 Chronicles 23 in the IRVK

2 Chronicles 23 in the IRVM

2 Chronicles 23 in the IRVM2

2 Chronicles 23 in the IRVO

2 Chronicles 23 in the IRVP

2 Chronicles 23 in the IRVT

2 Chronicles 23 in the IRVT2

2 Chronicles 23 in the IRVU

2 Chronicles 23 in the ISVN

2 Chronicles 23 in the JSNT

2 Chronicles 23 in the KAPI

2 Chronicles 23 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 23 in the KBV

2 Chronicles 23 in the KJV

2 Chronicles 23 in the KNFD

2 Chronicles 23 in the LBA

2 Chronicles 23 in the LBLA

2 Chronicles 23 in the LNT

2 Chronicles 23 in the LSV

2 Chronicles 23 in the MAAL

2 Chronicles 23 in the MBV

2 Chronicles 23 in the MBV2

2 Chronicles 23 in the MHNT

2 Chronicles 23 in the MKNFD

2 Chronicles 23 in the MNG

2 Chronicles 23 in the MNT

2 Chronicles 23 in the MNT2

2 Chronicles 23 in the MRS1T

2 Chronicles 23 in the NAA

2 Chronicles 23 in the NASB

2 Chronicles 23 in the NBLA

2 Chronicles 23 in the NBS

2 Chronicles 23 in the NBVTP

2 Chronicles 23 in the NET2

2 Chronicles 23 in the NIV11

2 Chronicles 23 in the NNT

2 Chronicles 23 in the NNT2

2 Chronicles 23 in the NNT3

2 Chronicles 23 in the PDDPT

2 Chronicles 23 in the PFNT

2 Chronicles 23 in the RMNT

2 Chronicles 23 in the SBIAS

2 Chronicles 23 in the SBIBS

2 Chronicles 23 in the SBIBS2

2 Chronicles 23 in the SBICS

2 Chronicles 23 in the SBIDS

2 Chronicles 23 in the SBIGS

2 Chronicles 23 in the SBIHS

2 Chronicles 23 in the SBIIS

2 Chronicles 23 in the SBIIS2

2 Chronicles 23 in the SBIIS3

2 Chronicles 23 in the SBIKS

2 Chronicles 23 in the SBIKS2

2 Chronicles 23 in the SBIMS

2 Chronicles 23 in the SBIOS

2 Chronicles 23 in the SBIPS

2 Chronicles 23 in the SBISS

2 Chronicles 23 in the SBITS

2 Chronicles 23 in the SBITS2

2 Chronicles 23 in the SBITS3

2 Chronicles 23 in the SBITS4

2 Chronicles 23 in the SBIUS

2 Chronicles 23 in the SBIVS

2 Chronicles 23 in the SBT

2 Chronicles 23 in the SBT1E

2 Chronicles 23 in the SCHL

2 Chronicles 23 in the SNT

2 Chronicles 23 in the SUSU

2 Chronicles 23 in the SUSU2

2 Chronicles 23 in the SYNO

2 Chronicles 23 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 23 in the TBT1E

2 Chronicles 23 in the TBT1E2

2 Chronicles 23 in the TFTIP

2 Chronicles 23 in the TFTU

2 Chronicles 23 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 23 in the THAI

2 Chronicles 23 in the TNFD

2 Chronicles 23 in the TNT

2 Chronicles 23 in the TNTIK

2 Chronicles 23 in the TNTIL

2 Chronicles 23 in the TNTIN

2 Chronicles 23 in the TNTIP

2 Chronicles 23 in the TNTIZ

2 Chronicles 23 in the TOMA

2 Chronicles 23 in the TTENT

2 Chronicles 23 in the UBG

2 Chronicles 23 in the UGV

2 Chronicles 23 in the UGV2

2 Chronicles 23 in the UGV3

2 Chronicles 23 in the VBL

2 Chronicles 23 in the VDCC

2 Chronicles 23 in the YALU

2 Chronicles 23 in the YAPE

2 Chronicles 23 in the YBVTP

2 Chronicles 23 in the ZBP