2 Thessalonians 2 (BOICB)
1 Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. 2 Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. 3 Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. 4 Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke. 5 Unu echetaghị ihe m gwara unu nʼoge mụ na unu nọ banyere ya? 6 Ma ugbu a, unu maara na o nwere onye na-egbochi ya ka ọ hapụ ịpụta ihe. Nʼihi na mgbe ọ ga-apụta bụ mgbe oge ya ruru. 7 Ma ọrụ nzuzo nke mmebi iwu ebidolarị ugbu a, ma onye ahụ na-egbochi ya ịbabiga ụba oke ga-anọgide na-eme otu a tutu ruo mgbe oge e wezugara ya. 8 Mgbe ahụ, a ga-eme ka onye mmebi iwu ahụ pụta ìhè, bụ onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji ume ọ ga-esi nʼọnụ ya kupụta laa nʼiyi, ma mee ka ọ ghara ịdịkwa ọzọ site nʼọbịbịa ya. 9 Ọbịbịa onye mmebi iwu ahụ ga-abụ dị ka ọrụ ekwensu si dị, site nʼike ịrụ ọrụ ebube aghụghọ na ihe ịrịbama dị iche iche, na ọrụ ịtụnanya aghụghọ dị iche iche nke ụgha. 10 Ya na ụdị ọrụ ọjọọ dị iche iche nke ọ ga-eji duhie ndị ahụ na-ala nʼiyi. Ha ga-ala nʼiyi nʼihi na ha jụrụ ịhụ eziokwu nʼanya ma nwee nzọpụta. 11 Nʼihi nke a, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha niile nabata okwu ụgha ndị a. 12 Ihe nke a pụtara bụ na ndị niile na-ekweghị nʼeziokwu ahụ ma nwee mmasị nʼajọ omume ka a ga-ama ikpe. 13 Anyị kwesiri inye Chineke ekele mgbe niile nʼihi unu ụmụnna ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya. Nʼihi na Chineke esitelarị na mmalite họpụta unu ka unu bụrụ ndị a zọpụtara site nʼọrụ ido nsọ nke Mmụọ Nsọ na site nʼokwukwe unu nʼeziokwu ahụ. 14 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ unu site nʼoziọma anyị ka unu nweta otuto nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 15 Ya mere, ụmụnna, nọgidenụ nʼozizi ahụ anyị mere ka unu mụta site nʼozizi anyị ziri unu, maọbụ na akwụkwọ anyị deere unu. 16 Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, 17 gbaa obi unu ume, ma mee ka unu guzosie ike nʼịrụ ọrụ na ikwukwa ihe niile dị mma.
In Other Versions
2 Thessalonians 2 in the ANGEFD
2 Thessalonians 2 in the ANTPNG2D
2 Thessalonians 2 in the BBPNG
2 Thessalonians 2 in the BBT1E
2 Thessalonians 2 in the BNTABOOT
2 Thessalonians 2 in the BNTLV
2 Thessalonians 2 in the BOATCB
2 Thessalonians 2 in the BOATCB2
2 Thessalonians 2 in the BOBCV
2 Thessalonians 2 in the BOCNT
2 Thessalonians 2 in the BOECS
2 Thessalonians 2 in the BOGWICC
2 Thessalonians 2 in the BOHCB
2 Thessalonians 2 in the BOHCV
2 Thessalonians 2 in the BOHLNT
2 Thessalonians 2 in the BOHNTLTAL
2 Thessalonians 2 in the BOILNTAP
2 Thessalonians 2 in the BOITCV
2 Thessalonians 2 in the BOKCV
2 Thessalonians 2 in the BOKCV2
2 Thessalonians 2 in the BOKHWOG
2 Thessalonians 2 in the BOKSSV
2 Thessalonians 2 in the BOLCB
2 Thessalonians 2 in the BOLCB2
2 Thessalonians 2 in the BOMCV
2 Thessalonians 2 in the BONAV
2 Thessalonians 2 in the BONCB
2 Thessalonians 2 in the BONLT
2 Thessalonians 2 in the BONUT2
2 Thessalonians 2 in the BOPLNT
2 Thessalonians 2 in the BOSCB
2 Thessalonians 2 in the BOSNC
2 Thessalonians 2 in the BOTLNT
2 Thessalonians 2 in the BOVCB
2 Thessalonians 2 in the BOYCB
2 Thessalonians 2 in the DGDNT
2 Thessalonians 2 in the GGMNT
2 Thessalonians 2 in the IRVM2
2 Thessalonians 2 in the IRVT2
2 Thessalonians 2 in the KBT1ETNIK
2 Thessalonians 2 in the MKNFD
2 Thessalonians 2 in the MRS1T
2 Thessalonians 2 in the NBVTP
2 Thessalonians 2 in the NIV11
2 Thessalonians 2 in the PDDPT
2 Thessalonians 2 in the SBIAS
2 Thessalonians 2 in the SBIBS
2 Thessalonians 2 in the SBIBS2
2 Thessalonians 2 in the SBICS
2 Thessalonians 2 in the SBIDS
2 Thessalonians 2 in the SBIGS
2 Thessalonians 2 in the SBIHS
2 Thessalonians 2 in the SBIIS
2 Thessalonians 2 in the SBIIS2
2 Thessalonians 2 in the SBIIS3
2 Thessalonians 2 in the SBIKS
2 Thessalonians 2 in the SBIKS2
2 Thessalonians 2 in the SBIMS
2 Thessalonians 2 in the SBIOS
2 Thessalonians 2 in the SBIPS
2 Thessalonians 2 in the SBISS
2 Thessalonians 2 in the SBITS
2 Thessalonians 2 in the SBITS2
2 Thessalonians 2 in the SBITS3
2 Thessalonians 2 in the SBITS4
2 Thessalonians 2 in the SBIUS
2 Thessalonians 2 in the SBIVS
2 Thessalonians 2 in the SBT1E
2 Thessalonians 2 in the SUSU2
2 Thessalonians 2 in the TBIAOTANT
2 Thessalonians 2 in the TBT1E
2 Thessalonians 2 in the TBT1E2
2 Thessalonians 2 in the TFTIP
2 Thessalonians 2 in the TGNTATF3T
2 Thessalonians 2 in the TNTIK
2 Thessalonians 2 in the TNTIL
2 Thessalonians 2 in the TNTIN
2 Thessalonians 2 in the TNTIP
2 Thessalonians 2 in the TNTIZ
2 Thessalonians 2 in the TTENT