Acts 13 (BOICB)

1 Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. 2 Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.” 3 Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha. 4 Ebe Mmụọ Nsọ zipụrụ ha, ha gbadara Selusia, sitekwa ebe ahụ gbadaa Saiprọs. 5 Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi. 6 Mgbe ha gazuchara obodo niile ndị ahụ mmiri gbara gburugburu ruo Pafọs, ha zutere otu onye mgbaasị, onye Juu bụ onye amụma ụgha a na-akpọ Ba-Jisọs. 7 Ya na otu onye ọchịchị obodo, aha ya bụ Sajiọs Pọlọs nọ. Ọ bụ nwoke nwere ọgụgụisi nʼebe ọ dị ukwuu, ọ kpọrọ Banabas na Sọl ka ha gwa ya okwu nke Chineke. 8 Ma onye mgbaasị ahụ, onye aha ya bụkwa Elimas (nʼihi nke a bụ aha ya ma asụgharịa ya) malitere igbochi ha site nʼimegharị onyeisi ahụ anya ka ọ ghara ịnabata okwukwe ahụ. 9 Ma Sọl, onye aha ya bụkwa Pọl, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, legidere ya anya 10 sị, “Gị nwa ekwensu, jupụtara nʼaghụghọ na nʼihe ọjọọ dị iche iche. Gị onye iro nke ezi omume niile. Ọ bụ na i gaghị akwụsị imerụ ụzọ niile ziri ezi nke Onyenwe anyị? 11 Nʼihi ya lee, iwe nke Onyenwe anyị ga-adakwasị gị. Ị ga-ekpụ ìsì nwa oge, ị gaghị enwe ike hụ ìhè nke anyanwụ.”Nʼotu oge ahụ, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Ọ malitere na-ebigharị aka, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya. 12 Mgbe onyeisi ahụ hụrụ ihe mere, o kweere, nʼihi na o juru ya anya bụ ozizi nke okwu Onyenwe anyị. 13 Pọl na ndị otu ya ji ụgbọ mmiri site na Pafọs garuo Pega nke dị nʼala Pamfilia. Nʼebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem. 14 Site na Pega ha gara ruo Antiọk obodo nke dị na Pisidia. Nʼụbọchị izuike, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala. 15 Mgbe a gụpụtasịrị site nʼakwụkwọ iwu na nke ndị amụma, ndịisi ụlọ ekpere ahụ zigara ya ozi, sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ịgbaume nye anyị, biko kwuonụ ya.” 16 Pọl guzoro ọtọ nʼetiti ha feere ha aka ya, sị, “Unu ndị Izrel na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị. 17 Chineke nke Izrel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwu nʼoge ha nọ nʼobodo Ijipt. O ji ike aka ya dupụta ha site nʼala ahụ. 18 Ọ nagidere ha iri afọ anọ nʼime ọzara. 19 O bibiri mba asaa dị ukwuu nʼime ala Kenan nʼihi ha, nyekwa ndị ya obodo a ka ọ bụrụ nke ha. 20 Nke a bụ ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise.“Mgbe nke a gasịrị, o nyere ha ndị ikpe dị iche iche ruo oge Samuel onye amụma. 21 Mgbe ahụ ha rịọrọ ka enye ha eze, Chineke nyekwara ha Sọl, nwa Kish, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta, onye chịrị iri afọ anọ. 22 Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’ 23 “Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite. 24 Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị. 25 Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’ 26 “Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile. 27 Ndị bi na Jerusalem na ndị na-achị ha amataghị ya, nke ha ji aghọta okwu ndị amụma nke a na-agụpụtara ha kwa izu, bụ nʼụbọchị izuike. Ma ha mere ka okwu ahụ mezuo, mgbe ha mara ya ikpe ọnwụ. 28 Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesiri ọnwụ nʼaka ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya. 29 Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha budatara ya site nʼelu obe, lie ya. 30 Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilie. 31 Ndị niile soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem hụkwara ya anya ọtụtụ ụbọchị. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nʼihu ndị mmadụ banyere ya. 32 “Anyị na-ezikwa unu oziọma a, nke nkwa ahụ Chineke kwere ndị nna nna anyị ha. 33 O mezuola ha nye anyị bụ ụmụ ha, site na-ime ka Jisọs site nʼọnwụ bilie, dịka e dere ya nʼakwụkwọ Abụ ọma,“ ‘Ị bụ ọkpara m,taa abụrụla m nna gị.’ 34 Ma banyere ime ka o site nʼọnwụ bilie, ka ọ ghara ịlaghachi nʼire ure ọzọ. Nke a bụ ihe o kwuru,“ ‘Aga m emezuru gị nkwa nsọ ahụ niile m kwere Devid.’ 35 E dekwara ya nʼebe ọzọ nʼabụ ọma,“ ‘Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.’ 36 “Mgbe Devid rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ nʼọgbọ ha, ọ nwụrụ, e likọọ ya na ndị nna nna ya ha o rekwara ure. 37 Ma onye ahụ Chineke mere ka o site nʼọnwụ bilite erekwaghị ure. 38 “Ya mere, ụmụnna m, achọrọ m ka o doo unu anya na mgbaghara mmehie dịkwa nʼime nwoke a, bụ Jisọs, anyị na-ekwusa nye unu. 39 A na-esite na ya gụọ onye ọbụla kwere nʼonye ezi omume ọ bụladị site nʼihe ndị ahụ niile nke iwu Mosis na-apụghị ịgụ unu dị ka ndị ezi omume. 40 Lezienụ anya ka ihe niile ndị amụma kwuru ghara ịdakwasị unu. 41 “ ‘Lee, unu ndị na-akwa emo,nọrọnụ na mgbagwoju anya ma lakwanụ nʼiyi.Nʼihi na agaje m ime otu ihe nʼụbọchị ununke unu na-agaghị ekwe na o mere,ọ bụladị na mmadụ kọrọ unu maka ya.’” 42 Mgbe Pọl na Banabas na-apụ, ndị mmadụ rịọrọ ha ka ha bịakwa nʼizu ụka ọzọ gwa ha okwu gbasara ihe ndị a. 43 Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sooro Pọl na Banabas, ndị gwara ha okwu, rịọsiekwa ha ike ka ha nọgide nʼamara Chineke. 44 Nʼụbọchị izuike ọzọ ahụ, ọtụtụ ndị bi nʼobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị. 45 Mgbe ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, obi ha jupụtara nʼekworo, ha bidokwara ikwu okwu ọjọọ megide okwu niile Pọl na-ekwu. 46 Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. 47 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị nyere anyị nʼiwu,“ ‘Emeela m ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ,ka ị nwee ike weruo nzọpụta nʼebe niile ụwa sọtụrụ.’” 48 Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. 49 Ya mere okwu Onyenwe anyị gbasara ruo ebe niile nʼobodo ahụ. 50 Mgbe ahụ, ndị Juu kpaliri obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke ndị ọnọdụ ha dị elu, na ndị ikom ndị nke ndu obodo ahụ. Ha kpasuru mkpagbu megide Pọl na Banabas si otu a, chụpụ ha site nʼobodo ahụ. 51 Ha tichapụrụ aja dị nʼụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka na ntị mmegide ha. Ha hapụrụ obodo ahụ gaa Aikoniọm. 52 Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.

In Other Versions

Acts 13 in the ANGEFD

Acts 13 in the ANTPNG2D

Acts 13 in the AS21

Acts 13 in the BAGH

Acts 13 in the BBPNG

Acts 13 in the BBT1E

Acts 13 in the BDS

Acts 13 in the BEV

Acts 13 in the BHAD

Acts 13 in the BIB

Acts 13 in the BLPT

Acts 13 in the BNT

Acts 13 in the BNTABOOT

Acts 13 in the BNTLV

Acts 13 in the BOATCB

Acts 13 in the BOATCB2

Acts 13 in the BOBCV

Acts 13 in the BOCNT

Acts 13 in the BOECS

Acts 13 in the BOGWICC

Acts 13 in the BOHCB

Acts 13 in the BOHCV

Acts 13 in the BOHLNT

Acts 13 in the BOHNTLTAL

Acts 13 in the BOILNTAP

Acts 13 in the BOITCV

Acts 13 in the BOKCV

Acts 13 in the BOKCV2

Acts 13 in the BOKHWOG

Acts 13 in the BOKSSV

Acts 13 in the BOLCB

Acts 13 in the BOLCB2

Acts 13 in the BOMCV

Acts 13 in the BONAV

Acts 13 in the BONCB

Acts 13 in the BONLT

Acts 13 in the BONUT2

Acts 13 in the BOPLNT

Acts 13 in the BOSCB

Acts 13 in the BOSNC

Acts 13 in the BOTLNT

Acts 13 in the BOVCB

Acts 13 in the BOYCB

Acts 13 in the BPBB

Acts 13 in the BPH

Acts 13 in the BSB

Acts 13 in the CCB

Acts 13 in the CUV

Acts 13 in the CUVS

Acts 13 in the DBT

Acts 13 in the DGDNT

Acts 13 in the DHNT

Acts 13 in the DNT

Acts 13 in the ELBE

Acts 13 in the EMTV

Acts 13 in the ESV

Acts 13 in the FBV

Acts 13 in the FEB

Acts 13 in the GGMNT

Acts 13 in the GNT

Acts 13 in the HARY

Acts 13 in the HNT

Acts 13 in the IRVA

Acts 13 in the IRVB

Acts 13 in the IRVG

Acts 13 in the IRVH

Acts 13 in the IRVK

Acts 13 in the IRVM

Acts 13 in the IRVM2

Acts 13 in the IRVO

Acts 13 in the IRVP

Acts 13 in the IRVT

Acts 13 in the IRVT2

Acts 13 in the IRVU

Acts 13 in the ISVN

Acts 13 in the JSNT

Acts 13 in the KAPI

Acts 13 in the KBT1ETNIK

Acts 13 in the KBV

Acts 13 in the KJV

Acts 13 in the KNFD

Acts 13 in the LBA

Acts 13 in the LBLA

Acts 13 in the LNT

Acts 13 in the LSV

Acts 13 in the MAAL

Acts 13 in the MBV

Acts 13 in the MBV2

Acts 13 in the MHNT

Acts 13 in the MKNFD

Acts 13 in the MNG

Acts 13 in the MNT

Acts 13 in the MNT2

Acts 13 in the MRS1T

Acts 13 in the NAA

Acts 13 in the NASB

Acts 13 in the NBLA

Acts 13 in the NBS

Acts 13 in the NBVTP

Acts 13 in the NET2

Acts 13 in the NIV11

Acts 13 in the NNT

Acts 13 in the NNT2

Acts 13 in the NNT3

Acts 13 in the PDDPT

Acts 13 in the PFNT

Acts 13 in the RMNT

Acts 13 in the SBIAS

Acts 13 in the SBIBS

Acts 13 in the SBIBS2

Acts 13 in the SBICS

Acts 13 in the SBIDS

Acts 13 in the SBIGS

Acts 13 in the SBIHS

Acts 13 in the SBIIS

Acts 13 in the SBIIS2

Acts 13 in the SBIIS3

Acts 13 in the SBIKS

Acts 13 in the SBIKS2

Acts 13 in the SBIMS

Acts 13 in the SBIOS

Acts 13 in the SBIPS

Acts 13 in the SBISS

Acts 13 in the SBITS

Acts 13 in the SBITS2

Acts 13 in the SBITS3

Acts 13 in the SBITS4

Acts 13 in the SBIUS

Acts 13 in the SBIVS

Acts 13 in the SBT

Acts 13 in the SBT1E

Acts 13 in the SCHL

Acts 13 in the SNT

Acts 13 in the SUSU

Acts 13 in the SUSU2

Acts 13 in the SYNO

Acts 13 in the TBIAOTANT

Acts 13 in the TBT1E

Acts 13 in the TBT1E2

Acts 13 in the TFTIP

Acts 13 in the TFTU

Acts 13 in the TGNTATF3T

Acts 13 in the THAI

Acts 13 in the TNFD

Acts 13 in the TNT

Acts 13 in the TNTIK

Acts 13 in the TNTIL

Acts 13 in the TNTIN

Acts 13 in the TNTIP

Acts 13 in the TNTIZ

Acts 13 in the TOMA

Acts 13 in the TTENT

Acts 13 in the UBG

Acts 13 in the UGV

Acts 13 in the UGV2

Acts 13 in the UGV3

Acts 13 in the VBL

Acts 13 in the VDCC

Acts 13 in the YALU

Acts 13 in the YAPE

Acts 13 in the YBVTP

Acts 13 in the ZBP