Acts 14 (BOICB)

1 Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara. 2 Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna. 3 Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. 4 Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi. 5 Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume. 6 Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ. 7 Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ. 8 Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla. 9 O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya, 10 were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije. 11 Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.” 12 Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu. 13 Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha. 14 Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu, 15 na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha. 16 Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha. 17 Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.” 18 Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja. 19 Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla. 20 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi. 21 Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk. 22 Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” 23 Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. 24 Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. 25 Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia. 26 Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru. 27 Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ. 28 Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.

In Other Versions

Acts 14 in the ANGEFD

Acts 14 in the ANTPNG2D

Acts 14 in the AS21

Acts 14 in the BAGH

Acts 14 in the BBPNG

Acts 14 in the BBT1E

Acts 14 in the BDS

Acts 14 in the BEV

Acts 14 in the BHAD

Acts 14 in the BIB

Acts 14 in the BLPT

Acts 14 in the BNT

Acts 14 in the BNTABOOT

Acts 14 in the BNTLV

Acts 14 in the BOATCB

Acts 14 in the BOATCB2

Acts 14 in the BOBCV

Acts 14 in the BOCNT

Acts 14 in the BOECS

Acts 14 in the BOGWICC

Acts 14 in the BOHCB

Acts 14 in the BOHCV

Acts 14 in the BOHLNT

Acts 14 in the BOHNTLTAL

Acts 14 in the BOILNTAP

Acts 14 in the BOITCV

Acts 14 in the BOKCV

Acts 14 in the BOKCV2

Acts 14 in the BOKHWOG

Acts 14 in the BOKSSV

Acts 14 in the BOLCB

Acts 14 in the BOLCB2

Acts 14 in the BOMCV

Acts 14 in the BONAV

Acts 14 in the BONCB

Acts 14 in the BONLT

Acts 14 in the BONUT2

Acts 14 in the BOPLNT

Acts 14 in the BOSCB

Acts 14 in the BOSNC

Acts 14 in the BOTLNT

Acts 14 in the BOVCB

Acts 14 in the BOYCB

Acts 14 in the BPBB

Acts 14 in the BPH

Acts 14 in the BSB

Acts 14 in the CCB

Acts 14 in the CUV

Acts 14 in the CUVS

Acts 14 in the DBT

Acts 14 in the DGDNT

Acts 14 in the DHNT

Acts 14 in the DNT

Acts 14 in the ELBE

Acts 14 in the EMTV

Acts 14 in the ESV

Acts 14 in the FBV

Acts 14 in the FEB

Acts 14 in the GGMNT

Acts 14 in the GNT

Acts 14 in the HARY

Acts 14 in the HNT

Acts 14 in the IRVA

Acts 14 in the IRVB

Acts 14 in the IRVG

Acts 14 in the IRVH

Acts 14 in the IRVK

Acts 14 in the IRVM

Acts 14 in the IRVM2

Acts 14 in the IRVO

Acts 14 in the IRVP

Acts 14 in the IRVT

Acts 14 in the IRVT2

Acts 14 in the IRVU

Acts 14 in the ISVN

Acts 14 in the JSNT

Acts 14 in the KAPI

Acts 14 in the KBT1ETNIK

Acts 14 in the KBV

Acts 14 in the KJV

Acts 14 in the KNFD

Acts 14 in the LBA

Acts 14 in the LBLA

Acts 14 in the LNT

Acts 14 in the LSV

Acts 14 in the MAAL

Acts 14 in the MBV

Acts 14 in the MBV2

Acts 14 in the MHNT

Acts 14 in the MKNFD

Acts 14 in the MNG

Acts 14 in the MNT

Acts 14 in the MNT2

Acts 14 in the MRS1T

Acts 14 in the NAA

Acts 14 in the NASB

Acts 14 in the NBLA

Acts 14 in the NBS

Acts 14 in the NBVTP

Acts 14 in the NET2

Acts 14 in the NIV11

Acts 14 in the NNT

Acts 14 in the NNT2

Acts 14 in the NNT3

Acts 14 in the PDDPT

Acts 14 in the PFNT

Acts 14 in the RMNT

Acts 14 in the SBIAS

Acts 14 in the SBIBS

Acts 14 in the SBIBS2

Acts 14 in the SBICS

Acts 14 in the SBIDS

Acts 14 in the SBIGS

Acts 14 in the SBIHS

Acts 14 in the SBIIS

Acts 14 in the SBIIS2

Acts 14 in the SBIIS3

Acts 14 in the SBIKS

Acts 14 in the SBIKS2

Acts 14 in the SBIMS

Acts 14 in the SBIOS

Acts 14 in the SBIPS

Acts 14 in the SBISS

Acts 14 in the SBITS

Acts 14 in the SBITS2

Acts 14 in the SBITS3

Acts 14 in the SBITS4

Acts 14 in the SBIUS

Acts 14 in the SBIVS

Acts 14 in the SBT

Acts 14 in the SBT1E

Acts 14 in the SCHL

Acts 14 in the SNT

Acts 14 in the SUSU

Acts 14 in the SUSU2

Acts 14 in the SYNO

Acts 14 in the TBIAOTANT

Acts 14 in the TBT1E

Acts 14 in the TBT1E2

Acts 14 in the TFTIP

Acts 14 in the TFTU

Acts 14 in the TGNTATF3T

Acts 14 in the THAI

Acts 14 in the TNFD

Acts 14 in the TNT

Acts 14 in the TNTIK

Acts 14 in the TNTIL

Acts 14 in the TNTIN

Acts 14 in the TNTIP

Acts 14 in the TNTIZ

Acts 14 in the TOMA

Acts 14 in the TTENT

Acts 14 in the UBG

Acts 14 in the UGV

Acts 14 in the UGV2

Acts 14 in the UGV3

Acts 14 in the VBL

Acts 14 in the VDCC

Acts 14 in the YALU

Acts 14 in the YAPE

Acts 14 in the YBVTP

Acts 14 in the ZBP