Acts 18 (BOICB)

1 Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint. 2 Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha, 3 nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu. 4 Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere. 5 Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ. 6 Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.” 7 O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu. 8 Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim. 9 Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị. 10 Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.” 11 Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke. 12 Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe. 13 Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.” 14 Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo. 15 Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.” 16 O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha. 17 Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ. 18 Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere. 19 Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka. 20 Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị. 21 Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs. 22 Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk. 23 Mgbe ọ nọsịrị nwa oge nta nʼebe ahụ, ọ sitere nʼebe ahụ pụọ jegharịa nʼakụkụ obodo Galeshịa na Frigia na-agba ndị na-eso ụzọ ahụ ume. 24 Ma otu nwoke onye Juu, aha ya bụ Apọlọs, onye Alegzandria bịara na Efesọs. Ọ bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere nʼAkwụkwọ Nsọ nke ọma. 25 Nwoke a natara ozizi banyere ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nʼịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ naanị ihe gbasara baptizim Jọn mere. 26 Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nʼụlọ nzukọ. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya, duru ya gaa nʼụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe niile banyere ụzọ Chineke. 27 Mgbe o zubere ịga obodo Akaịa, ndị ụmụnna gbara ya ume. Ha degaara ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ akwụkwọ ka ha nabata ya. Mgbe ọ bịaruru, Onyenwe anyị sitere nʼaka ya mee ka amara ya baa ụba nʼebe ndị kwere ekwe nọ. 28 Nʼihi na nʼihu ndị mmadụ niile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka niile nke ndị Juu. O gosiri ha site nʼakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

In Other Versions

Acts 18 in the ANGEFD

Acts 18 in the ANTPNG2D

Acts 18 in the AS21

Acts 18 in the BAGH

Acts 18 in the BBPNG

Acts 18 in the BBT1E

Acts 18 in the BDS

Acts 18 in the BEV

Acts 18 in the BHAD

Acts 18 in the BIB

Acts 18 in the BLPT

Acts 18 in the BNT

Acts 18 in the BNTABOOT

Acts 18 in the BNTLV

Acts 18 in the BOATCB

Acts 18 in the BOATCB2

Acts 18 in the BOBCV

Acts 18 in the BOCNT

Acts 18 in the BOECS

Acts 18 in the BOGWICC

Acts 18 in the BOHCB

Acts 18 in the BOHCV

Acts 18 in the BOHLNT

Acts 18 in the BOHNTLTAL

Acts 18 in the BOILNTAP

Acts 18 in the BOITCV

Acts 18 in the BOKCV

Acts 18 in the BOKCV2

Acts 18 in the BOKHWOG

Acts 18 in the BOKSSV

Acts 18 in the BOLCB

Acts 18 in the BOLCB2

Acts 18 in the BOMCV

Acts 18 in the BONAV

Acts 18 in the BONCB

Acts 18 in the BONLT

Acts 18 in the BONUT2

Acts 18 in the BOPLNT

Acts 18 in the BOSCB

Acts 18 in the BOSNC

Acts 18 in the BOTLNT

Acts 18 in the BOVCB

Acts 18 in the BOYCB

Acts 18 in the BPBB

Acts 18 in the BPH

Acts 18 in the BSB

Acts 18 in the CCB

Acts 18 in the CUV

Acts 18 in the CUVS

Acts 18 in the DBT

Acts 18 in the DGDNT

Acts 18 in the DHNT

Acts 18 in the DNT

Acts 18 in the ELBE

Acts 18 in the EMTV

Acts 18 in the ESV

Acts 18 in the FBV

Acts 18 in the FEB

Acts 18 in the GGMNT

Acts 18 in the GNT

Acts 18 in the HARY

Acts 18 in the HNT

Acts 18 in the IRVA

Acts 18 in the IRVB

Acts 18 in the IRVG

Acts 18 in the IRVH

Acts 18 in the IRVK

Acts 18 in the IRVM

Acts 18 in the IRVM2

Acts 18 in the IRVO

Acts 18 in the IRVP

Acts 18 in the IRVT

Acts 18 in the IRVT2

Acts 18 in the IRVU

Acts 18 in the ISVN

Acts 18 in the JSNT

Acts 18 in the KAPI

Acts 18 in the KBT1ETNIK

Acts 18 in the KBV

Acts 18 in the KJV

Acts 18 in the KNFD

Acts 18 in the LBA

Acts 18 in the LBLA

Acts 18 in the LNT

Acts 18 in the LSV

Acts 18 in the MAAL

Acts 18 in the MBV

Acts 18 in the MBV2

Acts 18 in the MHNT

Acts 18 in the MKNFD

Acts 18 in the MNG

Acts 18 in the MNT

Acts 18 in the MNT2

Acts 18 in the MRS1T

Acts 18 in the NAA

Acts 18 in the NASB

Acts 18 in the NBLA

Acts 18 in the NBS

Acts 18 in the NBVTP

Acts 18 in the NET2

Acts 18 in the NIV11

Acts 18 in the NNT

Acts 18 in the NNT2

Acts 18 in the NNT3

Acts 18 in the PDDPT

Acts 18 in the PFNT

Acts 18 in the RMNT

Acts 18 in the SBIAS

Acts 18 in the SBIBS

Acts 18 in the SBIBS2

Acts 18 in the SBICS

Acts 18 in the SBIDS

Acts 18 in the SBIGS

Acts 18 in the SBIHS

Acts 18 in the SBIIS

Acts 18 in the SBIIS2

Acts 18 in the SBIIS3

Acts 18 in the SBIKS

Acts 18 in the SBIKS2

Acts 18 in the SBIMS

Acts 18 in the SBIOS

Acts 18 in the SBIPS

Acts 18 in the SBISS

Acts 18 in the SBITS

Acts 18 in the SBITS2

Acts 18 in the SBITS3

Acts 18 in the SBITS4

Acts 18 in the SBIUS

Acts 18 in the SBIVS

Acts 18 in the SBT

Acts 18 in the SBT1E

Acts 18 in the SCHL

Acts 18 in the SNT

Acts 18 in the SUSU

Acts 18 in the SUSU2

Acts 18 in the SYNO

Acts 18 in the TBIAOTANT

Acts 18 in the TBT1E

Acts 18 in the TBT1E2

Acts 18 in the TFTIP

Acts 18 in the TFTU

Acts 18 in the TGNTATF3T

Acts 18 in the THAI

Acts 18 in the TNFD

Acts 18 in the TNT

Acts 18 in the TNTIK

Acts 18 in the TNTIL

Acts 18 in the TNTIN

Acts 18 in the TNTIP

Acts 18 in the TNTIZ

Acts 18 in the TOMA

Acts 18 in the TTENT

Acts 18 in the UBG

Acts 18 in the UGV

Acts 18 in the UGV2

Acts 18 in the UGV3

Acts 18 in the VBL

Acts 18 in the VDCC

Acts 18 in the YALU

Acts 18 in the YAPE

Acts 18 in the YBVTP

Acts 18 in the ZBP