Acts 24 (BOICB)

1 Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo. 2 Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a. 3 Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ. 4 Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa. 5 “Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret. 6 Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị, 7 ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị. 8 Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.” 9 Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme. 10 Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị. 11 Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe. 12 Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo. 13 Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m. 14 Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma. 15 Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị. 16 Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile. 17 “Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja. 18 Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla. 19 Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m. 20 Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye. 21 Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ” 22 Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.” 23 O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya. 24 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 25 Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.” 26 Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka. 27 Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.

In Other Versions

Acts 24 in the ANGEFD

Acts 24 in the ANTPNG2D

Acts 24 in the AS21

Acts 24 in the BAGH

Acts 24 in the BBPNG

Acts 24 in the BBT1E

Acts 24 in the BDS

Acts 24 in the BEV

Acts 24 in the BHAD

Acts 24 in the BIB

Acts 24 in the BLPT

Acts 24 in the BNT

Acts 24 in the BNTABOOT

Acts 24 in the BNTLV

Acts 24 in the BOATCB

Acts 24 in the BOATCB2

Acts 24 in the BOBCV

Acts 24 in the BOCNT

Acts 24 in the BOECS

Acts 24 in the BOGWICC

Acts 24 in the BOHCB

Acts 24 in the BOHCV

Acts 24 in the BOHLNT

Acts 24 in the BOHNTLTAL

Acts 24 in the BOILNTAP

Acts 24 in the BOITCV

Acts 24 in the BOKCV

Acts 24 in the BOKCV2

Acts 24 in the BOKHWOG

Acts 24 in the BOKSSV

Acts 24 in the BOLCB

Acts 24 in the BOLCB2

Acts 24 in the BOMCV

Acts 24 in the BONAV

Acts 24 in the BONCB

Acts 24 in the BONLT

Acts 24 in the BONUT2

Acts 24 in the BOPLNT

Acts 24 in the BOSCB

Acts 24 in the BOSNC

Acts 24 in the BOTLNT

Acts 24 in the BOVCB

Acts 24 in the BOYCB

Acts 24 in the BPBB

Acts 24 in the BPH

Acts 24 in the BSB

Acts 24 in the CCB

Acts 24 in the CUV

Acts 24 in the CUVS

Acts 24 in the DBT

Acts 24 in the DGDNT

Acts 24 in the DHNT

Acts 24 in the DNT

Acts 24 in the ELBE

Acts 24 in the EMTV

Acts 24 in the ESV

Acts 24 in the FBV

Acts 24 in the FEB

Acts 24 in the GGMNT

Acts 24 in the GNT

Acts 24 in the HARY

Acts 24 in the HNT

Acts 24 in the IRVA

Acts 24 in the IRVB

Acts 24 in the IRVG

Acts 24 in the IRVH

Acts 24 in the IRVK

Acts 24 in the IRVM

Acts 24 in the IRVM2

Acts 24 in the IRVO

Acts 24 in the IRVP

Acts 24 in the IRVT

Acts 24 in the IRVT2

Acts 24 in the IRVU

Acts 24 in the ISVN

Acts 24 in the JSNT

Acts 24 in the KAPI

Acts 24 in the KBT1ETNIK

Acts 24 in the KBV

Acts 24 in the KJV

Acts 24 in the KNFD

Acts 24 in the LBA

Acts 24 in the LBLA

Acts 24 in the LNT

Acts 24 in the LSV

Acts 24 in the MAAL

Acts 24 in the MBV

Acts 24 in the MBV2

Acts 24 in the MHNT

Acts 24 in the MKNFD

Acts 24 in the MNG

Acts 24 in the MNT

Acts 24 in the MNT2

Acts 24 in the MRS1T

Acts 24 in the NAA

Acts 24 in the NASB

Acts 24 in the NBLA

Acts 24 in the NBS

Acts 24 in the NBVTP

Acts 24 in the NET2

Acts 24 in the NIV11

Acts 24 in the NNT

Acts 24 in the NNT2

Acts 24 in the NNT3

Acts 24 in the PDDPT

Acts 24 in the PFNT

Acts 24 in the RMNT

Acts 24 in the SBIAS

Acts 24 in the SBIBS

Acts 24 in the SBIBS2

Acts 24 in the SBICS

Acts 24 in the SBIDS

Acts 24 in the SBIGS

Acts 24 in the SBIHS

Acts 24 in the SBIIS

Acts 24 in the SBIIS2

Acts 24 in the SBIIS3

Acts 24 in the SBIKS

Acts 24 in the SBIKS2

Acts 24 in the SBIMS

Acts 24 in the SBIOS

Acts 24 in the SBIPS

Acts 24 in the SBISS

Acts 24 in the SBITS

Acts 24 in the SBITS2

Acts 24 in the SBITS3

Acts 24 in the SBITS4

Acts 24 in the SBIUS

Acts 24 in the SBIVS

Acts 24 in the SBT

Acts 24 in the SBT1E

Acts 24 in the SCHL

Acts 24 in the SNT

Acts 24 in the SUSU

Acts 24 in the SUSU2

Acts 24 in the SYNO

Acts 24 in the TBIAOTANT

Acts 24 in the TBT1E

Acts 24 in the TBT1E2

Acts 24 in the TFTIP

Acts 24 in the TFTU

Acts 24 in the TGNTATF3T

Acts 24 in the THAI

Acts 24 in the TNFD

Acts 24 in the TNT

Acts 24 in the TNTIK

Acts 24 in the TNTIL

Acts 24 in the TNTIN

Acts 24 in the TNTIP

Acts 24 in the TNTIZ

Acts 24 in the TOMA

Acts 24 in the TTENT

Acts 24 in the UBG

Acts 24 in the UGV

Acts 24 in the UGV2

Acts 24 in the UGV3

Acts 24 in the VBL

Acts 24 in the VDCC

Acts 24 in the YALU

Acts 24 in the YAPE

Acts 24 in the YBVTP

Acts 24 in the ZBP