Ephesians 4 (BOICB)
1 Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2 Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3 Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4 E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5 Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6 Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile. 7 Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 8 Nʼihi nke a, e kwuru,“Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu,o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha,nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.” 9 (E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ? 10 Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.) 11 O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12 Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst; 13 tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst. 14 Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie. 15 Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst. 16 Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya. 17 Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru. 18 Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa. 19 Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu. 20 Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst, 21 ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs. 22 Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, 23 ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. 24 Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ. 25 Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ. 26 Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe. 27 Enyela ekwensu ohere. 28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 29 Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị. 30 Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta. 31 Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. 32 Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.
In Other Versions
Ephesians 4 in the ANGEFD
Ephesians 4 in the ANTPNG2D
Ephesians 4 in the AS21
Ephesians 4 in the BAGH
Ephesians 4 in the BBPNG
Ephesians 4 in the BBT1E
Ephesians 4 in the BDS
Ephesians 4 in the BEV
Ephesians 4 in the BHAD
Ephesians 4 in the BIB
Ephesians 4 in the BLPT
Ephesians 4 in the BNT
Ephesians 4 in the BNTABOOT
Ephesians 4 in the BNTLV
Ephesians 4 in the BOATCB
Ephesians 4 in the BOATCB2
Ephesians 4 in the BOBCV
Ephesians 4 in the BOCNT
Ephesians 4 in the BOECS
Ephesians 4 in the BOGWICC
Ephesians 4 in the BOHCB
Ephesians 4 in the BOHCV
Ephesians 4 in the BOHLNT
Ephesians 4 in the BOHNTLTAL
Ephesians 4 in the BOILNTAP
Ephesians 4 in the BOITCV
Ephesians 4 in the BOKCV
Ephesians 4 in the BOKCV2
Ephesians 4 in the BOKHWOG
Ephesians 4 in the BOKSSV
Ephesians 4 in the BOLCB
Ephesians 4 in the BOLCB2
Ephesians 4 in the BOMCV
Ephesians 4 in the BONAV
Ephesians 4 in the BONCB
Ephesians 4 in the BONLT
Ephesians 4 in the BONUT2
Ephesians 4 in the BOPLNT
Ephesians 4 in the BOSCB
Ephesians 4 in the BOSNC
Ephesians 4 in the BOTLNT
Ephesians 4 in the BOVCB
Ephesians 4 in the BOYCB
Ephesians 4 in the BPBB
Ephesians 4 in the BPH
Ephesians 4 in the BSB
Ephesians 4 in the CCB
Ephesians 4 in the CUV
Ephesians 4 in the CUVS
Ephesians 4 in the DBT
Ephesians 4 in the DGDNT
Ephesians 4 in the DHNT
Ephesians 4 in the DNT
Ephesians 4 in the ELBE
Ephesians 4 in the EMTV
Ephesians 4 in the ESV
Ephesians 4 in the FBV
Ephesians 4 in the FEB
Ephesians 4 in the GGMNT
Ephesians 4 in the GNT
Ephesians 4 in the HARY
Ephesians 4 in the HNT
Ephesians 4 in the IRVA
Ephesians 4 in the IRVB
Ephesians 4 in the IRVG
Ephesians 4 in the IRVH
Ephesians 4 in the IRVK
Ephesians 4 in the IRVM
Ephesians 4 in the IRVM2
Ephesians 4 in the IRVO
Ephesians 4 in the IRVP
Ephesians 4 in the IRVT
Ephesians 4 in the IRVT2
Ephesians 4 in the IRVU
Ephesians 4 in the ISVN
Ephesians 4 in the JSNT
Ephesians 4 in the KAPI
Ephesians 4 in the KBT1ETNIK
Ephesians 4 in the KBV
Ephesians 4 in the KJV
Ephesians 4 in the KNFD
Ephesians 4 in the LBA
Ephesians 4 in the LBLA
Ephesians 4 in the LNT
Ephesians 4 in the LSV
Ephesians 4 in the MAAL
Ephesians 4 in the MBV
Ephesians 4 in the MBV2
Ephesians 4 in the MHNT
Ephesians 4 in the MKNFD
Ephesians 4 in the MNG
Ephesians 4 in the MNT
Ephesians 4 in the MNT2
Ephesians 4 in the MRS1T
Ephesians 4 in the NAA
Ephesians 4 in the NASB
Ephesians 4 in the NBLA
Ephesians 4 in the NBS
Ephesians 4 in the NBVTP
Ephesians 4 in the NET2
Ephesians 4 in the NIV11
Ephesians 4 in the NNT
Ephesians 4 in the NNT2
Ephesians 4 in the NNT3
Ephesians 4 in the PDDPT
Ephesians 4 in the PFNT
Ephesians 4 in the RMNT
Ephesians 4 in the SBIAS
Ephesians 4 in the SBIBS
Ephesians 4 in the SBIBS2
Ephesians 4 in the SBICS
Ephesians 4 in the SBIDS
Ephesians 4 in the SBIGS
Ephesians 4 in the SBIHS
Ephesians 4 in the SBIIS
Ephesians 4 in the SBIIS2
Ephesians 4 in the SBIIS3
Ephesians 4 in the SBIKS
Ephesians 4 in the SBIKS2
Ephesians 4 in the SBIMS
Ephesians 4 in the SBIOS
Ephesians 4 in the SBIPS
Ephesians 4 in the SBISS
Ephesians 4 in the SBITS
Ephesians 4 in the SBITS2
Ephesians 4 in the SBITS3
Ephesians 4 in the SBITS4
Ephesians 4 in the SBIUS
Ephesians 4 in the SBIVS
Ephesians 4 in the SBT
Ephesians 4 in the SBT1E
Ephesians 4 in the SCHL
Ephesians 4 in the SNT
Ephesians 4 in the SUSU
Ephesians 4 in the SUSU2
Ephesians 4 in the SYNO
Ephesians 4 in the TBIAOTANT
Ephesians 4 in the TBT1E
Ephesians 4 in the TBT1E2
Ephesians 4 in the TFTIP
Ephesians 4 in the TFTU
Ephesians 4 in the TGNTATF3T
Ephesians 4 in the THAI
Ephesians 4 in the TNFD
Ephesians 4 in the TNT
Ephesians 4 in the TNTIK
Ephesians 4 in the TNTIL
Ephesians 4 in the TNTIN
Ephesians 4 in the TNTIP
Ephesians 4 in the TNTIZ
Ephesians 4 in the TOMA
Ephesians 4 in the TTENT
Ephesians 4 in the UBG
Ephesians 4 in the UGV
Ephesians 4 in the UGV2
Ephesians 4 in the UGV3
Ephesians 4 in the VBL
Ephesians 4 in the VDCC
Ephesians 4 in the YALU
Ephesians 4 in the YAPE
Ephesians 4 in the YBVTP
Ephesians 4 in the ZBP