Galatians 3 (BOICB)

1 Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst. 2 Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? 3 Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ? 4 Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu? 5 Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma? 6 Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume. 7 Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham. 8 Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9 Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. 10 Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11 Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12 Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.” 13 Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.” 14 Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ. 15 Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. 16 Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst. 17 Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. 18 Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya. 19 Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire. 20 Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu. 21 Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu. 22 Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 23 Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24 Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25 Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. 26 Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27 Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28 E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29 Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.

In Other Versions

Galatians 3 in the ANGEFD

Galatians 3 in the ANTPNG2D

Galatians 3 in the AS21

Galatians 3 in the BAGH

Galatians 3 in the BBPNG

Galatians 3 in the BBT1E

Galatians 3 in the BDS

Galatians 3 in the BEV

Galatians 3 in the BHAD

Galatians 3 in the BIB

Galatians 3 in the BLPT

Galatians 3 in the BNT

Galatians 3 in the BNTABOOT

Galatians 3 in the BNTLV

Galatians 3 in the BOATCB

Galatians 3 in the BOATCB2

Galatians 3 in the BOBCV

Galatians 3 in the BOCNT

Galatians 3 in the BOECS

Galatians 3 in the BOGWICC

Galatians 3 in the BOHCB

Galatians 3 in the BOHCV

Galatians 3 in the BOHLNT

Galatians 3 in the BOHNTLTAL

Galatians 3 in the BOILNTAP

Galatians 3 in the BOITCV

Galatians 3 in the BOKCV

Galatians 3 in the BOKCV2

Galatians 3 in the BOKHWOG

Galatians 3 in the BOKSSV

Galatians 3 in the BOLCB

Galatians 3 in the BOLCB2

Galatians 3 in the BOMCV

Galatians 3 in the BONAV

Galatians 3 in the BONCB

Galatians 3 in the BONLT

Galatians 3 in the BONUT2

Galatians 3 in the BOPLNT

Galatians 3 in the BOSCB

Galatians 3 in the BOSNC

Galatians 3 in the BOTLNT

Galatians 3 in the BOVCB

Galatians 3 in the BOYCB

Galatians 3 in the BPBB

Galatians 3 in the BPH

Galatians 3 in the BSB

Galatians 3 in the CCB

Galatians 3 in the CUV

Galatians 3 in the CUVS

Galatians 3 in the DBT

Galatians 3 in the DGDNT

Galatians 3 in the DHNT

Galatians 3 in the DNT

Galatians 3 in the ELBE

Galatians 3 in the EMTV

Galatians 3 in the ESV

Galatians 3 in the FBV

Galatians 3 in the FEB

Galatians 3 in the GGMNT

Galatians 3 in the GNT

Galatians 3 in the HARY

Galatians 3 in the HNT

Galatians 3 in the IRVA

Galatians 3 in the IRVB

Galatians 3 in the IRVG

Galatians 3 in the IRVH

Galatians 3 in the IRVK

Galatians 3 in the IRVM

Galatians 3 in the IRVM2

Galatians 3 in the IRVO

Galatians 3 in the IRVP

Galatians 3 in the IRVT

Galatians 3 in the IRVT2

Galatians 3 in the IRVU

Galatians 3 in the ISVN

Galatians 3 in the JSNT

Galatians 3 in the KAPI

Galatians 3 in the KBT1ETNIK

Galatians 3 in the KBV

Galatians 3 in the KJV

Galatians 3 in the KNFD

Galatians 3 in the LBA

Galatians 3 in the LBLA

Galatians 3 in the LNT

Galatians 3 in the LSV

Galatians 3 in the MAAL

Galatians 3 in the MBV

Galatians 3 in the MBV2

Galatians 3 in the MHNT

Galatians 3 in the MKNFD

Galatians 3 in the MNG

Galatians 3 in the MNT

Galatians 3 in the MNT2

Galatians 3 in the MRS1T

Galatians 3 in the NAA

Galatians 3 in the NASB

Galatians 3 in the NBLA

Galatians 3 in the NBS

Galatians 3 in the NBVTP

Galatians 3 in the NET2

Galatians 3 in the NIV11

Galatians 3 in the NNT

Galatians 3 in the NNT2

Galatians 3 in the NNT3

Galatians 3 in the PDDPT

Galatians 3 in the PFNT

Galatians 3 in the RMNT

Galatians 3 in the SBIAS

Galatians 3 in the SBIBS

Galatians 3 in the SBIBS2

Galatians 3 in the SBICS

Galatians 3 in the SBIDS

Galatians 3 in the SBIGS

Galatians 3 in the SBIHS

Galatians 3 in the SBIIS

Galatians 3 in the SBIIS2

Galatians 3 in the SBIIS3

Galatians 3 in the SBIKS

Galatians 3 in the SBIKS2

Galatians 3 in the SBIMS

Galatians 3 in the SBIOS

Galatians 3 in the SBIPS

Galatians 3 in the SBISS

Galatians 3 in the SBITS

Galatians 3 in the SBITS2

Galatians 3 in the SBITS3

Galatians 3 in the SBITS4

Galatians 3 in the SBIUS

Galatians 3 in the SBIVS

Galatians 3 in the SBT

Galatians 3 in the SBT1E

Galatians 3 in the SCHL

Galatians 3 in the SNT

Galatians 3 in the SUSU

Galatians 3 in the SUSU2

Galatians 3 in the SYNO

Galatians 3 in the TBIAOTANT

Galatians 3 in the TBT1E

Galatians 3 in the TBT1E2

Galatians 3 in the TFTIP

Galatians 3 in the TFTU

Galatians 3 in the TGNTATF3T

Galatians 3 in the THAI

Galatians 3 in the TNFD

Galatians 3 in the TNT

Galatians 3 in the TNTIK

Galatians 3 in the TNTIL

Galatians 3 in the TNTIN

Galatians 3 in the TNTIP

Galatians 3 in the TNTIZ

Galatians 3 in the TOMA

Galatians 3 in the TTENT

Galatians 3 in the UBG

Galatians 3 in the UGV

Galatians 3 in the UGV2

Galatians 3 in the UGV3

Galatians 3 in the VBL

Galatians 3 in the VDCC

Galatians 3 in the YALU

Galatians 3 in the YAPE

Galatians 3 in the YBVTP

Galatians 3 in the ZBP