Hebrews 12 (BOICB)

1 Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2 Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. 3 Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba. 4 Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. 5 Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,“Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụmaọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba. 6 Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” 7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 8 Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. 9 Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. 10 Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya. 11 Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya. 12 Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji. 13 Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ. 14 Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị. 15 Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ. 16 Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri. 17 Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike. 18 Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, 19 na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha. 20 Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.” 21 Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.” 22 Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ. 23 Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke. 24 Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru. 25 Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị. 26 Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” 27 Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị. 28 Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. 29 Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.

In Other Versions

Hebrews 12 in the ANGEFD

Hebrews 12 in the ANTPNG2D

Hebrews 12 in the AS21

Hebrews 12 in the BAGH

Hebrews 12 in the BBPNG

Hebrews 12 in the BBT1E

Hebrews 12 in the BDS

Hebrews 12 in the BEV

Hebrews 12 in the BHAD

Hebrews 12 in the BIB

Hebrews 12 in the BLPT

Hebrews 12 in the BNT

Hebrews 12 in the BNTABOOT

Hebrews 12 in the BNTLV

Hebrews 12 in the BOATCB

Hebrews 12 in the BOATCB2

Hebrews 12 in the BOBCV

Hebrews 12 in the BOCNT

Hebrews 12 in the BOECS

Hebrews 12 in the BOGWICC

Hebrews 12 in the BOHCB

Hebrews 12 in the BOHCV

Hebrews 12 in the BOHLNT

Hebrews 12 in the BOHNTLTAL

Hebrews 12 in the BOILNTAP

Hebrews 12 in the BOITCV

Hebrews 12 in the BOKCV

Hebrews 12 in the BOKCV2

Hebrews 12 in the BOKHWOG

Hebrews 12 in the BOKSSV

Hebrews 12 in the BOLCB

Hebrews 12 in the BOLCB2

Hebrews 12 in the BOMCV

Hebrews 12 in the BONAV

Hebrews 12 in the BONCB

Hebrews 12 in the BONLT

Hebrews 12 in the BONUT2

Hebrews 12 in the BOPLNT

Hebrews 12 in the BOSCB

Hebrews 12 in the BOSNC

Hebrews 12 in the BOTLNT

Hebrews 12 in the BOVCB

Hebrews 12 in the BOYCB

Hebrews 12 in the BPBB

Hebrews 12 in the BPH

Hebrews 12 in the BSB

Hebrews 12 in the CCB

Hebrews 12 in the CUV

Hebrews 12 in the CUVS

Hebrews 12 in the DBT

Hebrews 12 in the DGDNT

Hebrews 12 in the DHNT

Hebrews 12 in the DNT

Hebrews 12 in the ELBE

Hebrews 12 in the EMTV

Hebrews 12 in the ESV

Hebrews 12 in the FBV

Hebrews 12 in the FEB

Hebrews 12 in the GGMNT

Hebrews 12 in the GNT

Hebrews 12 in the HARY

Hebrews 12 in the HNT

Hebrews 12 in the IRVA

Hebrews 12 in the IRVB

Hebrews 12 in the IRVG

Hebrews 12 in the IRVH

Hebrews 12 in the IRVK

Hebrews 12 in the IRVM

Hebrews 12 in the IRVM2

Hebrews 12 in the IRVO

Hebrews 12 in the IRVP

Hebrews 12 in the IRVT

Hebrews 12 in the IRVT2

Hebrews 12 in the IRVU

Hebrews 12 in the ISVN

Hebrews 12 in the JSNT

Hebrews 12 in the KAPI

Hebrews 12 in the KBT1ETNIK

Hebrews 12 in the KBV

Hebrews 12 in the KJV

Hebrews 12 in the KNFD

Hebrews 12 in the LBA

Hebrews 12 in the LBLA

Hebrews 12 in the LNT

Hebrews 12 in the LSV

Hebrews 12 in the MAAL

Hebrews 12 in the MBV

Hebrews 12 in the MBV2

Hebrews 12 in the MHNT

Hebrews 12 in the MKNFD

Hebrews 12 in the MNG

Hebrews 12 in the MNT

Hebrews 12 in the MNT2

Hebrews 12 in the MRS1T

Hebrews 12 in the NAA

Hebrews 12 in the NASB

Hebrews 12 in the NBLA

Hebrews 12 in the NBS

Hebrews 12 in the NBVTP

Hebrews 12 in the NET2

Hebrews 12 in the NIV11

Hebrews 12 in the NNT

Hebrews 12 in the NNT2

Hebrews 12 in the NNT3

Hebrews 12 in the PDDPT

Hebrews 12 in the PFNT

Hebrews 12 in the RMNT

Hebrews 12 in the SBIAS

Hebrews 12 in the SBIBS

Hebrews 12 in the SBIBS2

Hebrews 12 in the SBICS

Hebrews 12 in the SBIDS

Hebrews 12 in the SBIGS

Hebrews 12 in the SBIHS

Hebrews 12 in the SBIIS

Hebrews 12 in the SBIIS2

Hebrews 12 in the SBIIS3

Hebrews 12 in the SBIKS

Hebrews 12 in the SBIKS2

Hebrews 12 in the SBIMS

Hebrews 12 in the SBIOS

Hebrews 12 in the SBIPS

Hebrews 12 in the SBISS

Hebrews 12 in the SBITS

Hebrews 12 in the SBITS2

Hebrews 12 in the SBITS3

Hebrews 12 in the SBITS4

Hebrews 12 in the SBIUS

Hebrews 12 in the SBIVS

Hebrews 12 in the SBT

Hebrews 12 in the SBT1E

Hebrews 12 in the SCHL

Hebrews 12 in the SNT

Hebrews 12 in the SUSU

Hebrews 12 in the SUSU2

Hebrews 12 in the SYNO

Hebrews 12 in the TBIAOTANT

Hebrews 12 in the TBT1E

Hebrews 12 in the TBT1E2

Hebrews 12 in the TFTIP

Hebrews 12 in the TFTU

Hebrews 12 in the TGNTATF3T

Hebrews 12 in the THAI

Hebrews 12 in the TNFD

Hebrews 12 in the TNT

Hebrews 12 in the TNTIK

Hebrews 12 in the TNTIL

Hebrews 12 in the TNTIN

Hebrews 12 in the TNTIP

Hebrews 12 in the TNTIZ

Hebrews 12 in the TOMA

Hebrews 12 in the TTENT

Hebrews 12 in the UBG

Hebrews 12 in the UGV

Hebrews 12 in the UGV2

Hebrews 12 in the UGV3

Hebrews 12 in the VBL

Hebrews 12 in the VDCC

Hebrews 12 in the YALU

Hebrews 12 in the YAPE

Hebrews 12 in the YBVTP

Hebrews 12 in the ZBP