Hebrews 6 (BOICB)

1 Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ, 2 na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. 3 Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe. 4 Ma ọ dịghị mfe ịkpọghachi ndị dara ada ọzọ, bụ ndị natarala ihe ahụ na mbụ, ndị detụkwara onyinye amara dị iche iche nke si nʼeluigwe bịa ire, ndị ketakwara oke Mmụọ Nsọ, 5 ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, 6 ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ. 7 Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke. 8 Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ. 9 Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa. 10 Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa. 11 Anyị chọrọ ka onye ọbụla nʼime unu nọgidesie ike nʼotu ịnụ ọkụ nʼobi ahụ ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka unu nwee olileanya inwezu ihe niile unu na-atụ anya ya mgbe oge ruru. 12 Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama ka unu bụrụ ndị na-eṅomi ndụ ahụ jiri okwukwe na ntachiobi nweta ihe ahụ e kwere na nkwa. 13 Mgbe Chineke kwere Ebraham nkwa, o ji onwe ya ṅụọ iyi, nʼihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya, 14 na-asị, “Nʼezie aga m agọzi gị, nyekwa gị ọtụtụ ụmụ ụmụ.” 15 Ebraham nwere ndidi, natakwa ihe e kwere ya na nkwa. 16 Ụmụ mmadụ na-eji ndị ka ha ukwuu ṅụọ iyi, iyi aṅụrụ nʼụzọ dị otu a na-eme ka ihe e kwuru guzosie ike ma wezugakwa ịrụ ụka niile nʼetiti mmadụ. 17 Ya mere, mgbe Chineke chọrọ igosi ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ, ụdịdị izuzu ya, o jiri ịṅụ iyi mee ka o doo ha anya na izuzu ya adịghị agbanwe agbanwe. 18 Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. 19 Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi 20 ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.

In Other Versions

Hebrews 6 in the ANGEFD

Hebrews 6 in the ANTPNG2D

Hebrews 6 in the AS21

Hebrews 6 in the BAGH

Hebrews 6 in the BBPNG

Hebrews 6 in the BBT1E

Hebrews 6 in the BDS

Hebrews 6 in the BEV

Hebrews 6 in the BHAD

Hebrews 6 in the BIB

Hebrews 6 in the BLPT

Hebrews 6 in the BNT

Hebrews 6 in the BNTABOOT

Hebrews 6 in the BNTLV

Hebrews 6 in the BOATCB

Hebrews 6 in the BOATCB2

Hebrews 6 in the BOBCV

Hebrews 6 in the BOCNT

Hebrews 6 in the BOECS

Hebrews 6 in the BOGWICC

Hebrews 6 in the BOHCB

Hebrews 6 in the BOHCV

Hebrews 6 in the BOHLNT

Hebrews 6 in the BOHNTLTAL

Hebrews 6 in the BOILNTAP

Hebrews 6 in the BOITCV

Hebrews 6 in the BOKCV

Hebrews 6 in the BOKCV2

Hebrews 6 in the BOKHWOG

Hebrews 6 in the BOKSSV

Hebrews 6 in the BOLCB

Hebrews 6 in the BOLCB2

Hebrews 6 in the BOMCV

Hebrews 6 in the BONAV

Hebrews 6 in the BONCB

Hebrews 6 in the BONLT

Hebrews 6 in the BONUT2

Hebrews 6 in the BOPLNT

Hebrews 6 in the BOSCB

Hebrews 6 in the BOSNC

Hebrews 6 in the BOTLNT

Hebrews 6 in the BOVCB

Hebrews 6 in the BOYCB

Hebrews 6 in the BPBB

Hebrews 6 in the BPH

Hebrews 6 in the BSB

Hebrews 6 in the CCB

Hebrews 6 in the CUV

Hebrews 6 in the CUVS

Hebrews 6 in the DBT

Hebrews 6 in the DGDNT

Hebrews 6 in the DHNT

Hebrews 6 in the DNT

Hebrews 6 in the ELBE

Hebrews 6 in the EMTV

Hebrews 6 in the ESV

Hebrews 6 in the FBV

Hebrews 6 in the FEB

Hebrews 6 in the GGMNT

Hebrews 6 in the GNT

Hebrews 6 in the HARY

Hebrews 6 in the HNT

Hebrews 6 in the IRVA

Hebrews 6 in the IRVB

Hebrews 6 in the IRVG

Hebrews 6 in the IRVH

Hebrews 6 in the IRVK

Hebrews 6 in the IRVM

Hebrews 6 in the IRVM2

Hebrews 6 in the IRVO

Hebrews 6 in the IRVP

Hebrews 6 in the IRVT

Hebrews 6 in the IRVT2

Hebrews 6 in the IRVU

Hebrews 6 in the ISVN

Hebrews 6 in the JSNT

Hebrews 6 in the KAPI

Hebrews 6 in the KBT1ETNIK

Hebrews 6 in the KBV

Hebrews 6 in the KJV

Hebrews 6 in the KNFD

Hebrews 6 in the LBA

Hebrews 6 in the LBLA

Hebrews 6 in the LNT

Hebrews 6 in the LSV

Hebrews 6 in the MAAL

Hebrews 6 in the MBV

Hebrews 6 in the MBV2

Hebrews 6 in the MHNT

Hebrews 6 in the MKNFD

Hebrews 6 in the MNG

Hebrews 6 in the MNT

Hebrews 6 in the MNT2

Hebrews 6 in the MRS1T

Hebrews 6 in the NAA

Hebrews 6 in the NASB

Hebrews 6 in the NBLA

Hebrews 6 in the NBS

Hebrews 6 in the NBVTP

Hebrews 6 in the NET2

Hebrews 6 in the NIV11

Hebrews 6 in the NNT

Hebrews 6 in the NNT2

Hebrews 6 in the NNT3

Hebrews 6 in the PDDPT

Hebrews 6 in the PFNT

Hebrews 6 in the RMNT

Hebrews 6 in the SBIAS

Hebrews 6 in the SBIBS

Hebrews 6 in the SBIBS2

Hebrews 6 in the SBICS

Hebrews 6 in the SBIDS

Hebrews 6 in the SBIGS

Hebrews 6 in the SBIHS

Hebrews 6 in the SBIIS

Hebrews 6 in the SBIIS2

Hebrews 6 in the SBIIS3

Hebrews 6 in the SBIKS

Hebrews 6 in the SBIKS2

Hebrews 6 in the SBIMS

Hebrews 6 in the SBIOS

Hebrews 6 in the SBIPS

Hebrews 6 in the SBISS

Hebrews 6 in the SBITS

Hebrews 6 in the SBITS2

Hebrews 6 in the SBITS3

Hebrews 6 in the SBITS4

Hebrews 6 in the SBIUS

Hebrews 6 in the SBIVS

Hebrews 6 in the SBT

Hebrews 6 in the SBT1E

Hebrews 6 in the SCHL

Hebrews 6 in the SNT

Hebrews 6 in the SUSU

Hebrews 6 in the SUSU2

Hebrews 6 in the SYNO

Hebrews 6 in the TBIAOTANT

Hebrews 6 in the TBT1E

Hebrews 6 in the TBT1E2

Hebrews 6 in the TFTIP

Hebrews 6 in the TFTU

Hebrews 6 in the TGNTATF3T

Hebrews 6 in the THAI

Hebrews 6 in the TNFD

Hebrews 6 in the TNT

Hebrews 6 in the TNTIK

Hebrews 6 in the TNTIL

Hebrews 6 in the TNTIN

Hebrews 6 in the TNTIP

Hebrews 6 in the TNTIZ

Hebrews 6 in the TOMA

Hebrews 6 in the TTENT

Hebrews 6 in the UBG

Hebrews 6 in the UGV

Hebrews 6 in the UGV2

Hebrews 6 in the UGV3

Hebrews 6 in the VBL

Hebrews 6 in the VDCC

Hebrews 6 in the YALU

Hebrews 6 in the YAPE

Hebrews 6 in the YBVTP

Hebrews 6 in the ZBP