Hebrews 7 (BOICB)

1 Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. 2 Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” 3 O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. 4 Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha! 5 Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham. 6 Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ. 7 O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta. 8 Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ. 9 Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham. 10 Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya. 11 Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn? 12 Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu. 13 Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja. 14 Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja. 15 E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. 16 Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. 17 Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị,“Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi,dị ka usoro Melkizedek si dị.” 18 Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya 19 (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso. 20 Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja. 21 Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya,“Onyenwe anyị aṅụọla iyi,ọ gaghị agbanwe obi ya,‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 22 Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma. 23 Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. 24 Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. 25 Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha. 26 Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27 Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28 Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.

In Other Versions

Hebrews 7 in the ANGEFD

Hebrews 7 in the ANTPNG2D

Hebrews 7 in the AS21

Hebrews 7 in the BAGH

Hebrews 7 in the BBPNG

Hebrews 7 in the BBT1E

Hebrews 7 in the BDS

Hebrews 7 in the BEV

Hebrews 7 in the BHAD

Hebrews 7 in the BIB

Hebrews 7 in the BLPT

Hebrews 7 in the BNT

Hebrews 7 in the BNTABOOT

Hebrews 7 in the BNTLV

Hebrews 7 in the BOATCB

Hebrews 7 in the BOATCB2

Hebrews 7 in the BOBCV

Hebrews 7 in the BOCNT

Hebrews 7 in the BOECS

Hebrews 7 in the BOGWICC

Hebrews 7 in the BOHCB

Hebrews 7 in the BOHCV

Hebrews 7 in the BOHLNT

Hebrews 7 in the BOHNTLTAL

Hebrews 7 in the BOILNTAP

Hebrews 7 in the BOITCV

Hebrews 7 in the BOKCV

Hebrews 7 in the BOKCV2

Hebrews 7 in the BOKHWOG

Hebrews 7 in the BOKSSV

Hebrews 7 in the BOLCB

Hebrews 7 in the BOLCB2

Hebrews 7 in the BOMCV

Hebrews 7 in the BONAV

Hebrews 7 in the BONCB

Hebrews 7 in the BONLT

Hebrews 7 in the BONUT2

Hebrews 7 in the BOPLNT

Hebrews 7 in the BOSCB

Hebrews 7 in the BOSNC

Hebrews 7 in the BOTLNT

Hebrews 7 in the BOVCB

Hebrews 7 in the BOYCB

Hebrews 7 in the BPBB

Hebrews 7 in the BPH

Hebrews 7 in the BSB

Hebrews 7 in the CCB

Hebrews 7 in the CUV

Hebrews 7 in the CUVS

Hebrews 7 in the DBT

Hebrews 7 in the DGDNT

Hebrews 7 in the DHNT

Hebrews 7 in the DNT

Hebrews 7 in the ELBE

Hebrews 7 in the EMTV

Hebrews 7 in the ESV

Hebrews 7 in the FBV

Hebrews 7 in the FEB

Hebrews 7 in the GGMNT

Hebrews 7 in the GNT

Hebrews 7 in the HARY

Hebrews 7 in the HNT

Hebrews 7 in the IRVA

Hebrews 7 in the IRVB

Hebrews 7 in the IRVG

Hebrews 7 in the IRVH

Hebrews 7 in the IRVK

Hebrews 7 in the IRVM

Hebrews 7 in the IRVM2

Hebrews 7 in the IRVO

Hebrews 7 in the IRVP

Hebrews 7 in the IRVT

Hebrews 7 in the IRVT2

Hebrews 7 in the IRVU

Hebrews 7 in the ISVN

Hebrews 7 in the JSNT

Hebrews 7 in the KAPI

Hebrews 7 in the KBT1ETNIK

Hebrews 7 in the KBV

Hebrews 7 in the KJV

Hebrews 7 in the KNFD

Hebrews 7 in the LBA

Hebrews 7 in the LBLA

Hebrews 7 in the LNT

Hebrews 7 in the LSV

Hebrews 7 in the MAAL

Hebrews 7 in the MBV

Hebrews 7 in the MBV2

Hebrews 7 in the MHNT

Hebrews 7 in the MKNFD

Hebrews 7 in the MNG

Hebrews 7 in the MNT

Hebrews 7 in the MNT2

Hebrews 7 in the MRS1T

Hebrews 7 in the NAA

Hebrews 7 in the NASB

Hebrews 7 in the NBLA

Hebrews 7 in the NBS

Hebrews 7 in the NBVTP

Hebrews 7 in the NET2

Hebrews 7 in the NIV11

Hebrews 7 in the NNT

Hebrews 7 in the NNT2

Hebrews 7 in the NNT3

Hebrews 7 in the PDDPT

Hebrews 7 in the PFNT

Hebrews 7 in the RMNT

Hebrews 7 in the SBIAS

Hebrews 7 in the SBIBS

Hebrews 7 in the SBIBS2

Hebrews 7 in the SBICS

Hebrews 7 in the SBIDS

Hebrews 7 in the SBIGS

Hebrews 7 in the SBIHS

Hebrews 7 in the SBIIS

Hebrews 7 in the SBIIS2

Hebrews 7 in the SBIIS3

Hebrews 7 in the SBIKS

Hebrews 7 in the SBIKS2

Hebrews 7 in the SBIMS

Hebrews 7 in the SBIOS

Hebrews 7 in the SBIPS

Hebrews 7 in the SBISS

Hebrews 7 in the SBITS

Hebrews 7 in the SBITS2

Hebrews 7 in the SBITS3

Hebrews 7 in the SBITS4

Hebrews 7 in the SBIUS

Hebrews 7 in the SBIVS

Hebrews 7 in the SBT

Hebrews 7 in the SBT1E

Hebrews 7 in the SCHL

Hebrews 7 in the SNT

Hebrews 7 in the SUSU

Hebrews 7 in the SUSU2

Hebrews 7 in the SYNO

Hebrews 7 in the TBIAOTANT

Hebrews 7 in the TBT1E

Hebrews 7 in the TBT1E2

Hebrews 7 in the TFTIP

Hebrews 7 in the TFTU

Hebrews 7 in the TGNTATF3T

Hebrews 7 in the THAI

Hebrews 7 in the TNFD

Hebrews 7 in the TNT

Hebrews 7 in the TNTIK

Hebrews 7 in the TNTIL

Hebrews 7 in the TNTIN

Hebrews 7 in the TNTIP

Hebrews 7 in the TNTIZ

Hebrews 7 in the TOMA

Hebrews 7 in the TTENT

Hebrews 7 in the UBG

Hebrews 7 in the UGV

Hebrews 7 in the UGV2

Hebrews 7 in the UGV3

Hebrews 7 in the VBL

Hebrews 7 in the VDCC

Hebrews 7 in the YALU

Hebrews 7 in the YAPE

Hebrews 7 in the YBVTP

Hebrews 7 in the ZBP