Hosea 2 (BOICB)
1 “Gwa ụmụnne gị ndị nwoke Ami, ‘nke pụtara ndị m,’ gwakwa ụmụnne gị nwanyị Ruhama, nke pụtara, ‘Unu ndị m hụrụ nʼanya.’ 2 “Unu guzogidenụ nne unu, rịọọnụ ya,nʼihi na ọ bụghị nwunye m,mụ onwe m abụkwaghị di ya.Gwanụ ya ka o wezuga ịkwa iko site nʼihu ya,ya wezugakwa ịgba akwụna nke dị nʼetiti ara ya abụọ. 3 Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ,aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya.Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara,ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ,were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ. 4 Agaghị m egosi ụmụ ya ebere m,nʼihi na ha bụ ụmụ a kwatara nʼiko. 5 Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko,ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere.Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya,ndị na-enye m nri na mmiri,ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’ 6 Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu;aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje. 7 Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.Mgbe ahụ, ọ ga-asị,‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’ 8 Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niilenke o ji na-efe Baal. 9 “Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 10 Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ yanʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m. 11 Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka. 12 Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,anụ ọhịa ga-eripịa ha. 13 Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niilebụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,ma chezọọ m,” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 14 “Nʼihi nke a, aga m arara ya,duba ya nʼime ọzara,jiri olu dị nro gwa ya okwu nʼebe ahụ. 15 Ebe ahụ ka m ga-enyeghachi ya ubi vaịnị ya,gbanweekwa Ndagwurugwu Akọ, mee ka ọ ghọọ ọnụ ụzọ olileanya.Mgbe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọbịa,nʼoge ahụ o si nʼala Ijipt pụta. 16 “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“Ị ga-akpọ m ‘Di m,’ị gaghị akpọkwa m ‘nna m ukwu,’ ọzọ. 17 Nʼihi na aga m ewepụkwa aha niile nke arụsị Baal nʼegbugbere ọnụ ya,ha gaghị akpọkwa ha aha ọzọ. 18 Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka gị na ụmụ anụ ọhịa gbaa ndụ,meekwa ka gị na ụmụ nnụnụ,na ihe niile e kere eke nʼakpụgharị nʼala gbaa ndụ.Aga m emebi ngwa agha niile,agha niile ga-akwụsịkwa.Mgbe ahụ, a ga-eme ka ị dịnaa ala nʼudo na-enweghị nsogbu, na ụjọ. 19 Aga m ekwerekwa ịlụ gị dịka nwunye ruo ebighị ebi;aga m ekwerekwa ịlụ gị nʼezi omume na ikpe ziri ezi,nʼịhụnanya nke na-adịgide, nakwa obi ebere. 20 Aga m eji ikwesi ntụkwasị obi kwere ịlụ gị.Ị ga-amatakwa ONYENWE ANYỊ. 21 “Nʼụbọchị ahụ m ga-azaghachi,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.“M ga-azaghachi eluigwe,ha ga-azaghachi ala. 22 Ala ga-azaghachi ọkana mmanya ọhụrụ na mmanụ oliv,mgbe ahụ ha ga-azaghachi Jezril. 23 Aga m akụkwa ya nye onwe m nʼala ahụ dịka mkpụrụ.Aga m egosi ịhụnanya m nʼahụ onye ahụ m kpọrọ, ‘Onye m na-ahụghị nʼanya.’M ga-asịkwa ndị ahụ a kpọrọ, ‘Ndị na-abụghị ndị m,’ ‘Unu bụ ndị nke m,’Ha ga-azakwa, ‘Chineke m ka ị bụ.’ ”