Isaiah 28 (BOICB)

1 Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem,obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi.Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma.Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi. 2 Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume,dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi,dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo,ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala. 3 Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke,ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ. 4 Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe,ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo,nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka,tinye nʼọnụ ya, loo ha. 5 Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya,ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụokpueze mara mma,ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma. 6 Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezinye ndị ikpe.Ọ ga-abụkwa ikenye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama. 7 Ndị a kwa na-adagharị site na mmanyasitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya.Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya,mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme;ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanyaha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche,ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe. 8 Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.O nwekwaghị ebe dị ọcha. 9 “Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe?Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya?Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara,bụ ndị a ka napụrụ ara? 10 Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya,ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ,nʼusoro tụkwasị nʼusoro,nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.” 11 Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghịzi unu ihe. 12 Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị,“Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike;nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.”Ma ha jụrụ ige ya ntị. 13 Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu ONYENWE ANYỊnʼahịrị nʼahịrị,nʼusoro nʼusoro;nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ,ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ,ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara. 14 Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị na-akwa emo,ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka. 15 Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi.Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee,ọ gaghị erute anyị,nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị;ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” 16 Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị,“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala.Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike.Onye nke kweere na yaegwu agaghị ejide ya. 17 Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi;akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu,mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu. 18 Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara;mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa.Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe,ọ ga-azọda unu. 19 Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu,maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị,oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke;ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji. 20 Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma. 21 ONYENWE ANYỊ ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. 22 Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa.Nʼihi na Onyenwe anyị, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niileagwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi. 23 Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu. 24 Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? 25 Mgbe o gwuzesịrị ya,ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,ọka balị nʼebe o kwesiri,na spelti nʼebe o kwesiri? 26 Ọ maara ihe o kwesiri ime,nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi. 27 Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin,kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin,werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe. 28 A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya.E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha,ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha. 29 Ihe ndị a niile na-esite nʼaka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,onye nzube ya dị ịtụnanya,onye amamihe ya dị ebube.

In Other Versions

Isaiah 28 in the ANGEFD

Isaiah 28 in the ANTPNG2D

Isaiah 28 in the AS21

Isaiah 28 in the BAGH

Isaiah 28 in the BBPNG

Isaiah 28 in the BBT1E

Isaiah 28 in the BDS

Isaiah 28 in the BEV

Isaiah 28 in the BHAD

Isaiah 28 in the BIB

Isaiah 28 in the BLPT

Isaiah 28 in the BNT

Isaiah 28 in the BNTABOOT

Isaiah 28 in the BNTLV

Isaiah 28 in the BOATCB

Isaiah 28 in the BOATCB2

Isaiah 28 in the BOBCV

Isaiah 28 in the BOCNT

Isaiah 28 in the BOECS

Isaiah 28 in the BOGWICC

Isaiah 28 in the BOHCB

Isaiah 28 in the BOHCV

Isaiah 28 in the BOHLNT

Isaiah 28 in the BOHNTLTAL

Isaiah 28 in the BOILNTAP

Isaiah 28 in the BOITCV

Isaiah 28 in the BOKCV

Isaiah 28 in the BOKCV2

Isaiah 28 in the BOKHWOG

Isaiah 28 in the BOKSSV

Isaiah 28 in the BOLCB

Isaiah 28 in the BOLCB2

Isaiah 28 in the BOMCV

Isaiah 28 in the BONAV

Isaiah 28 in the BONCB

Isaiah 28 in the BONLT

Isaiah 28 in the BONUT2

Isaiah 28 in the BOPLNT

Isaiah 28 in the BOSCB

Isaiah 28 in the BOSNC

Isaiah 28 in the BOTLNT

Isaiah 28 in the BOVCB

Isaiah 28 in the BOYCB

Isaiah 28 in the BPBB

Isaiah 28 in the BPH

Isaiah 28 in the BSB

Isaiah 28 in the CCB

Isaiah 28 in the CUV

Isaiah 28 in the CUVS

Isaiah 28 in the DBT

Isaiah 28 in the DGDNT

Isaiah 28 in the DHNT

Isaiah 28 in the DNT

Isaiah 28 in the ELBE

Isaiah 28 in the EMTV

Isaiah 28 in the ESV

Isaiah 28 in the FBV

Isaiah 28 in the FEB

Isaiah 28 in the GGMNT

Isaiah 28 in the GNT

Isaiah 28 in the HARY

Isaiah 28 in the HNT

Isaiah 28 in the IRVA

Isaiah 28 in the IRVB

Isaiah 28 in the IRVG

Isaiah 28 in the IRVH

Isaiah 28 in the IRVK

Isaiah 28 in the IRVM

Isaiah 28 in the IRVM2

Isaiah 28 in the IRVO

Isaiah 28 in the IRVP

Isaiah 28 in the IRVT

Isaiah 28 in the IRVT2

Isaiah 28 in the IRVU

Isaiah 28 in the ISVN

Isaiah 28 in the JSNT

Isaiah 28 in the KAPI

Isaiah 28 in the KBT1ETNIK

Isaiah 28 in the KBV

Isaiah 28 in the KJV

Isaiah 28 in the KNFD

Isaiah 28 in the LBA

Isaiah 28 in the LBLA

Isaiah 28 in the LNT

Isaiah 28 in the LSV

Isaiah 28 in the MAAL

Isaiah 28 in the MBV

Isaiah 28 in the MBV2

Isaiah 28 in the MHNT

Isaiah 28 in the MKNFD

Isaiah 28 in the MNG

Isaiah 28 in the MNT

Isaiah 28 in the MNT2

Isaiah 28 in the MRS1T

Isaiah 28 in the NAA

Isaiah 28 in the NASB

Isaiah 28 in the NBLA

Isaiah 28 in the NBS

Isaiah 28 in the NBVTP

Isaiah 28 in the NET2

Isaiah 28 in the NIV11

Isaiah 28 in the NNT

Isaiah 28 in the NNT2

Isaiah 28 in the NNT3

Isaiah 28 in the PDDPT

Isaiah 28 in the PFNT

Isaiah 28 in the RMNT

Isaiah 28 in the SBIAS

Isaiah 28 in the SBIBS

Isaiah 28 in the SBIBS2

Isaiah 28 in the SBICS

Isaiah 28 in the SBIDS

Isaiah 28 in the SBIGS

Isaiah 28 in the SBIHS

Isaiah 28 in the SBIIS

Isaiah 28 in the SBIIS2

Isaiah 28 in the SBIIS3

Isaiah 28 in the SBIKS

Isaiah 28 in the SBIKS2

Isaiah 28 in the SBIMS

Isaiah 28 in the SBIOS

Isaiah 28 in the SBIPS

Isaiah 28 in the SBISS

Isaiah 28 in the SBITS

Isaiah 28 in the SBITS2

Isaiah 28 in the SBITS3

Isaiah 28 in the SBITS4

Isaiah 28 in the SBIUS

Isaiah 28 in the SBIVS

Isaiah 28 in the SBT

Isaiah 28 in the SBT1E

Isaiah 28 in the SCHL

Isaiah 28 in the SNT

Isaiah 28 in the SUSU

Isaiah 28 in the SUSU2

Isaiah 28 in the SYNO

Isaiah 28 in the TBIAOTANT

Isaiah 28 in the TBT1E

Isaiah 28 in the TBT1E2

Isaiah 28 in the TFTIP

Isaiah 28 in the TFTU

Isaiah 28 in the TGNTATF3T

Isaiah 28 in the THAI

Isaiah 28 in the TNFD

Isaiah 28 in the TNT

Isaiah 28 in the TNTIK

Isaiah 28 in the TNTIL

Isaiah 28 in the TNTIN

Isaiah 28 in the TNTIP

Isaiah 28 in the TNTIZ

Isaiah 28 in the TOMA

Isaiah 28 in the TTENT

Isaiah 28 in the UBG

Isaiah 28 in the UGV

Isaiah 28 in the UGV2

Isaiah 28 in the UGV3

Isaiah 28 in the VBL

Isaiah 28 in the VDCC

Isaiah 28 in the YALU

Isaiah 28 in the YAPE

Isaiah 28 in the YBVTP

Isaiah 28 in the ZBP