Isaiah 30 (BOICB)

1 “Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m,ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị,si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie. 2 Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemakama ha ajụtaghị ase site nʼaka m.Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe,chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba. 3 Ma nchekwa Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere,ndo ndị Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ mweda nʼala. 4 Ọ bụ ezie na ha nwere ndị ozi na Zoanndị nnọchi anya ha erutekwala Hans, 5 ihere ga-eme onye ọbụlanʼihi ndị na-abaghị uru nye ha,ndị na-abụghị ihe inyeaka maọbụ ihe iba uru,kama naanị ihe ihere na ịta ụta.” 6 Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev.Nʼala ahụhụ na mkpagbu,nke ọdụm na nne ọdụm,nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ,ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu,na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel,na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru, 7 bụ Ijipt, ndị inyeaka ha na-enye enweghị isi.Nʼihi nke a, ana m agụ yaRehab, onye na-enweghị ihe ọ na-arụ. 8 Gaa ugbu a, dekwasịrị ha ya nʼelu mbadamba nkume,detuokwa ha nʼime akwụkwọ,ka ọ dịrị maka ụbọchị na-abịadịka ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi. 9 Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enupu isi, ụmụ aghụghọndị kpachaara anya jụ ịnabata ozizi ONYENWE ANYỊ na-ezi. 10 Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ,“Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,”ma sịkwa ndị amụma,“Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu.Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị,buonu amụma nduhie. 11 Unu na-anọchiri anyị ụzọ,nyenụ anyị ohere.Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụlabanyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.” 12 Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu,“Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị,ma dabere na mmegbuna-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ, 13 mmehie a ga-aghọrọ unuihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa,nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya. 14 Ọ ga-etipịasị dịka ite aja,nke etipịara na-enweghị obi ebere,nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya,iji gụta ọkụ site na-ekwu,maọbụ kupụta mmiri site nʼite.” 15 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị,“Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu,na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị,ma unu ekweghị na nke ọbụla. 16 Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’E, unu ga-agba ọsọ nʼezie.Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa. 17 Otu onye nʼime ndị iro unuga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ.Mmadụ ise si nʼime haezuola ịchusasị unu,ruo mgbe unu ga-adịka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu,e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.” 18 Ma ONYENWE ANYỊ nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,ka o gosi unu ịhụnanya ya.O jikeere imere unu ebere, nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya. 19 Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya. 20 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha. 21 Ma unu tụgharịrị nʼaka nri ma ọ bụkwanụ nʼaka ekpe, ntị unu ga-anụ otu olu nʼazụ unu, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, Jeenụ ije nʼime ya.” 22 Mgbe ahụ kwa, unu ga-emebi arụsị unu niile, nke e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ. Unu ga-atụfukwa ha dịka ihe ruru unyi, nke na-asọ oyi. Unu ga-asị ha, “Pụọnụ nʼebe a!” 23 Ọ ga-ezitekwa mmiri ozuzo maka mkpụrụ unu kụrụ nʼala ubi unu, ihe omume nke ga-esite nʼala ahụ pụta ga-ama abụba baakwa ụba. Nʼụbọchị ahụ anụ ụlọ unu ga-ata nri nʼebe ịta nri sara mbara. 24 Ehi na ịnyịnya ibu ndị na-arụ ọrụ ubi ga-ata nri a gwara nke ọma nke nnu dị, nke eji ngwa ọrụ ịfụcha ọka na shọvel kpasaa nke ọma. 25 Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada. 26 Ọnwa ga-amụke dịka anwụ, ìhè anyanwụ ga-adịkwa okpukpu asaa dịka ìhè ụbọchị asaa e mere ka ọ mụọ nʼotu ụbọchị! Ihe ndị a ga-emezu nʼụbọchị ahụ ONYENWE ANYỊ malitere ikechi na ịgwọ ọnya o mere ka o rute ndị ya aka. 27 Lee, Aha ONYENWE ANYỊ ka o si nʼebe dị anya na-abịa!Ọ na-abịa nʼoke iwe, anwụrụ ọkụ gbakwara ya gburugburu.Iwe jupụtara nʼegbugbere ọnụ ya,okwu ya na-erechapụ dịka ọkụ. 28 Iku ume ya dịkwa ka iyi rubigara oke, nke na-achị ọkụ,nke na-etoru onye nọ nʼime ya nʼolu.Ọ na-ayọcha mba niile nʼime nyọ ịla nʼiyi,ọ na-etinye nʼagba ndị mmadụeriri igwe nke na-edufu ha. 29 Ma unu ga-abụ abụdịka unu na-abụ nʼabalị mmemme dị nsọ,obi unu ga-aṅụrị ọṅụdịka mgbe ndị na-egbu opi na-arịgo eluna-aga nʼugwu nsọ ONYENWE ANYỊ,na-agakwuru Oke Nkume Izrel. 30 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ndị mmadụ nụ olu ya dị ebube,ọ ga-emekwa ka ha hụ aka ya na-arịdata alajiri ọnụma nke iwe ya na ọkụ na-erepịa erepịa,jirikwa oke mmiri ozuzo, na egbe eluigwe, na akụmmiri igwe. 31 Olu ONYENWE ANYỊ ga-emenye ndị Asịrịa egwu;ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala. 32 Ihe otiti ọbụla nke ONYENWE ANYỊ na-eji mkpọ ya,tie ha nʼahụga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye,mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ. 33 Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga.A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ.Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi,na nke a kwajuru nkụ.Ọ bụ iku ume ONYENWE ANYỊnke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụka a ga-eji mụnye ya ọkụ.

In Other Versions

Isaiah 30 in the ANGEFD

Isaiah 30 in the ANTPNG2D

Isaiah 30 in the AS21

Isaiah 30 in the BAGH

Isaiah 30 in the BBPNG

Isaiah 30 in the BBT1E

Isaiah 30 in the BDS

Isaiah 30 in the BEV

Isaiah 30 in the BHAD

Isaiah 30 in the BIB

Isaiah 30 in the BLPT

Isaiah 30 in the BNT

Isaiah 30 in the BNTABOOT

Isaiah 30 in the BNTLV

Isaiah 30 in the BOATCB

Isaiah 30 in the BOATCB2

Isaiah 30 in the BOBCV

Isaiah 30 in the BOCNT

Isaiah 30 in the BOECS

Isaiah 30 in the BOGWICC

Isaiah 30 in the BOHCB

Isaiah 30 in the BOHCV

Isaiah 30 in the BOHLNT

Isaiah 30 in the BOHNTLTAL

Isaiah 30 in the BOILNTAP

Isaiah 30 in the BOITCV

Isaiah 30 in the BOKCV

Isaiah 30 in the BOKCV2

Isaiah 30 in the BOKHWOG

Isaiah 30 in the BOKSSV

Isaiah 30 in the BOLCB

Isaiah 30 in the BOLCB2

Isaiah 30 in the BOMCV

Isaiah 30 in the BONAV

Isaiah 30 in the BONCB

Isaiah 30 in the BONLT

Isaiah 30 in the BONUT2

Isaiah 30 in the BOPLNT

Isaiah 30 in the BOSCB

Isaiah 30 in the BOSNC

Isaiah 30 in the BOTLNT

Isaiah 30 in the BOVCB

Isaiah 30 in the BOYCB

Isaiah 30 in the BPBB

Isaiah 30 in the BPH

Isaiah 30 in the BSB

Isaiah 30 in the CCB

Isaiah 30 in the CUV

Isaiah 30 in the CUVS

Isaiah 30 in the DBT

Isaiah 30 in the DGDNT

Isaiah 30 in the DHNT

Isaiah 30 in the DNT

Isaiah 30 in the ELBE

Isaiah 30 in the EMTV

Isaiah 30 in the ESV

Isaiah 30 in the FBV

Isaiah 30 in the FEB

Isaiah 30 in the GGMNT

Isaiah 30 in the GNT

Isaiah 30 in the HARY

Isaiah 30 in the HNT

Isaiah 30 in the IRVA

Isaiah 30 in the IRVB

Isaiah 30 in the IRVG

Isaiah 30 in the IRVH

Isaiah 30 in the IRVK

Isaiah 30 in the IRVM

Isaiah 30 in the IRVM2

Isaiah 30 in the IRVO

Isaiah 30 in the IRVP

Isaiah 30 in the IRVT

Isaiah 30 in the IRVT2

Isaiah 30 in the IRVU

Isaiah 30 in the ISVN

Isaiah 30 in the JSNT

Isaiah 30 in the KAPI

Isaiah 30 in the KBT1ETNIK

Isaiah 30 in the KBV

Isaiah 30 in the KJV

Isaiah 30 in the KNFD

Isaiah 30 in the LBA

Isaiah 30 in the LBLA

Isaiah 30 in the LNT

Isaiah 30 in the LSV

Isaiah 30 in the MAAL

Isaiah 30 in the MBV

Isaiah 30 in the MBV2

Isaiah 30 in the MHNT

Isaiah 30 in the MKNFD

Isaiah 30 in the MNG

Isaiah 30 in the MNT

Isaiah 30 in the MNT2

Isaiah 30 in the MRS1T

Isaiah 30 in the NAA

Isaiah 30 in the NASB

Isaiah 30 in the NBLA

Isaiah 30 in the NBS

Isaiah 30 in the NBVTP

Isaiah 30 in the NET2

Isaiah 30 in the NIV11

Isaiah 30 in the NNT

Isaiah 30 in the NNT2

Isaiah 30 in the NNT3

Isaiah 30 in the PDDPT

Isaiah 30 in the PFNT

Isaiah 30 in the RMNT

Isaiah 30 in the SBIAS

Isaiah 30 in the SBIBS

Isaiah 30 in the SBIBS2

Isaiah 30 in the SBICS

Isaiah 30 in the SBIDS

Isaiah 30 in the SBIGS

Isaiah 30 in the SBIHS

Isaiah 30 in the SBIIS

Isaiah 30 in the SBIIS2

Isaiah 30 in the SBIIS3

Isaiah 30 in the SBIKS

Isaiah 30 in the SBIKS2

Isaiah 30 in the SBIMS

Isaiah 30 in the SBIOS

Isaiah 30 in the SBIPS

Isaiah 30 in the SBISS

Isaiah 30 in the SBITS

Isaiah 30 in the SBITS2

Isaiah 30 in the SBITS3

Isaiah 30 in the SBITS4

Isaiah 30 in the SBIUS

Isaiah 30 in the SBIVS

Isaiah 30 in the SBT

Isaiah 30 in the SBT1E

Isaiah 30 in the SCHL

Isaiah 30 in the SNT

Isaiah 30 in the SUSU

Isaiah 30 in the SUSU2

Isaiah 30 in the SYNO

Isaiah 30 in the TBIAOTANT

Isaiah 30 in the TBT1E

Isaiah 30 in the TBT1E2

Isaiah 30 in the TFTIP

Isaiah 30 in the TFTU

Isaiah 30 in the TGNTATF3T

Isaiah 30 in the THAI

Isaiah 30 in the TNFD

Isaiah 30 in the TNT

Isaiah 30 in the TNTIK

Isaiah 30 in the TNTIL

Isaiah 30 in the TNTIN

Isaiah 30 in the TNTIP

Isaiah 30 in the TNTIZ

Isaiah 30 in the TOMA

Isaiah 30 in the TTENT

Isaiah 30 in the UBG

Isaiah 30 in the UGV

Isaiah 30 in the UGV2

Isaiah 30 in the UGV3

Isaiah 30 in the VBL

Isaiah 30 in the VDCC

Isaiah 30 in the YALU

Isaiah 30 in the YAPE

Isaiah 30 in the YBVTP

Isaiah 30 in the ZBP