Isaiah 45 (BOICB)
1 “Nke a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri yamegide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,megheere ya ọnụ ụzọ niilenke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 2 Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gịkwazee ugwu ukwu niile,tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niilegbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3 Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ,bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4 Nʼihi Jekọb bụ ohu m,nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,ka m ji kpọọ gị aha gịnyekwa gị aha nke nsọpụrụ,maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5 Ọ bụ m bụ ONYENWE ANYỊ, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.Ọ bụ ezie na ị maghị m,ma aga m eme ka ị dịrị ike. 6 Mgbe ahụ, ụwa niile, site nʼọwụwa anyanwụruo nʼọdịda anyanwụ,ga-amata nʼezie na Chineke ọzọ adịghị, karịa m.Abụ m ONYENWE ANYỊ, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị. 7 Ọ bụ m kpụrụ ìhè, keekwa ọchịchịrị.Ọ bụ m na-ezite ọganihu, na-ekekwa ịla nʼiyi.Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, na-eme ihe ndị a niile. 8 “Gị, eluigwe, zodata ezi omume mka mbara eluigwe na-ezodakwa ya dịka mmiri.Ka ala meghee onwe ya,ka nzọpụta pupụta,ka ezi omume soro ya puokwa dịka ahịhịa.Ọ bụ mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ kere ha niile. 9 “Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ,mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejujunʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala.Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị,‘Gịnị ka i ji m akpụ?’Ka ọrụ gị ọ ga-asị,‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’? 10 Ahụhụ na-adịrị nwantakịrị ahụ gwara nna ya okwu sị,‘Gịnị ka ị mụtara na nwa?’maọbụ sịkwa nne ya,‘Gịnị bụ ihe ị mụpụtara?’ 11 “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye nsọ nke Izrel,Onye kere Izrel na-ajụ ajụjụ sị;banyere ihe ndị gaje imeị na-ajụ m ajụjụ banyere ụmụ m,maọbụ nye m iwu banyere ọrụ aka m? 12 Ọ bụ mụ onwe m kere ụwa,keekwa mmadụ ka o biri nʼime ya.Aka m abụọ ka m ji gbasaa mbara igwe,nyekwa kpakpando niile iwu. 13 M ga-akpọlite Sairọs nʼezi omume m:M ga-eme ka ụzọ ya niile zie ezi.Ọ ga-ewughachi obodo m,mee ka ndị m a dọtara nʼagha nwere onwe ha,ma ọ bụghị nʼihi ọnụahịa maọbụ ihe nrite,ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.” 14 Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Ihe ndị Ijipt rụpụtara na ngwa ahịa ndị Kushna ndị Saba ahụ toro ogologo,ha ga-abịakwute gị,ha ga-abụ nke gị;ha ga-esokwa gị nʼazụdịka ndị mkpọrọ e kere agbụ.Ha ga-akpọ isiala nʼihu gịrịọ gị arịrịọ, na-asị,‘Nʼezie, ọ bụ naanị otu Chineke dị, onye nọnyere gị,ọ dịkwaghị chi ọzọ dị.’ ” 15 Nʼezie, gị onwe gị bụ Chineke, Onye nzọpụta Izrel.Ị bụkwa Chineke, onye na-ezonarị mmadụ onwe ya. 16 A ga-eme ndị niile na-akpụ arụsị ihe ihere,e, ihere ga-eme ha nʼihi na a ga-etinye ha nʼọnọdụ oke ihere. 17 Ma ONYENWE ANYỊ ga-eji nzọpụtanke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi zọpụta Izrel.Ihere agaghị eme ha.A gaghị etinyekwa ha nʼọnọdụ ihe ihere ruo mgbe ebighị ebi. 18 Nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ onye kere eluigwe sịrị,ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha.Ọ bụ ya, bụ Chineke,onye zubere ma kee ụwa,tọkwaa ntọala ya.O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu,kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya.Ọ sịrị,“Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ;ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị. 19 Ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu,site nʼotu ebe nʼala nke ọchịchịrị.Agwaghị m mkpụrụ Jekọb‘Chọọnụ m nʼefu.’Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu eziokwu,Ana m ekwupụta ihe ziri ezi. 20 “Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ,bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ.Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee,ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere. 21 Kwupụtanụ ihe kwesiri ịdị, gosinụ ya,ka ha gbaakọkwa izu.Onye buru ụzọ kwuo ihe ndị a nʼoge gara aga,onye kwupụtara ya site na mgbe ochie?Ọ bụghị mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ?Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị mụ onwe m,Chineke onye ezi omume na Onye nzọpụta;ọ dịghị onye ọzọ dị ma ewezuga m. 22 “Laghachikwutenụ m, ka m zọpụta unu.Laghachikwutenụ m, unu ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa.Nʼihi na ọ bụ naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị chi ọzọ dị. 23 Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,ọnụ m ekwupụla okwu nʼezi omume,bụ okwu nke na-enweghị mgbanwe:Nʼihu m ka ikpere niile ọbụla ga-egbu nʼala;mụ ka ire niile ọbụla ga-aṅụrụ iyi. 24 E, ha ga-ekwupụta sị, ‘Ọ bụ nʼime ONYENWE ANYỊ naanịka ezi omume na ike dị.’ ”Ndị niile na-akpọ ya asị ga-abịakwute ya.Ihere ga-emekwa ha. 25 Ma agbụrụ niile nke Izrelga-achọta nnapụta ha nʼime ONYENWE ANYỊ,ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.