Isaiah 5 (BOICB)

1 Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,abụ banyere ubi vaịnị ya.Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi yanʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala. 2 O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị. 3 “Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m. 4 Olee ihe ọzọ m gaara emere yakarịa ihe m mere?Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọnʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ? 5 Ugbu a, lee,ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a.Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya,hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri.Aga m etida mgbidi yahapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ. 6 Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.Agakwaghị m egwuru ya ala,aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya.Aga m enyekwa igwe ojii iwuka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.” 7 Ubi vaịnị nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,bụ mba Izrelna ndị Juda,ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ.Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara.O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu. 8 Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta alama ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi,unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu,ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa. 9 Ma ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa. 10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.” 11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụịgbaso mmanya.Ndị na-amụgide anya abalịtutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke. 12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,ma unu na-elelị ONYENWE ANYỊ anya;unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya. 13 Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,nʼihi amaghị ihe;ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri. 14 Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. 15 Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,na ndị dị ala,ndị mpako ka a ga-eweda nʼala. 16 Ma ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya. 17 Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ. 18 Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala. 19 Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ,ka anyị hụ ya.Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel,ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè,ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.” 20 Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihendị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhèna ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrịndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu. 21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta. 22 Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya, 23 ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ. 24 Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka,na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu,otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ureokoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu;nʼihi na ha ajụla iwu niile ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile nyere,lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel. 25 Nʼihi nke a, iwe ONYENWE ANYỊ dị ọkụ megide ndị ya;o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala.Ugwu niile ga-ama jijiji,ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 26 Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa.Ma lee, ka ha na-abịa,ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ. 27 Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi. 28 Àkụ ha niile dị nkọ,ekweela ụta ha niile,ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe. 29 Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere. 30 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu yadịka mbigbọ nke oke osimiri.A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya,ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu,ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.

In Other Versions

Isaiah 5 in the ANGEFD

Isaiah 5 in the ANTPNG2D

Isaiah 5 in the AS21

Isaiah 5 in the BAGH

Isaiah 5 in the BBPNG

Isaiah 5 in the BBT1E

Isaiah 5 in the BDS

Isaiah 5 in the BEV

Isaiah 5 in the BHAD

Isaiah 5 in the BIB

Isaiah 5 in the BLPT

Isaiah 5 in the BNT

Isaiah 5 in the BNTABOOT

Isaiah 5 in the BNTLV

Isaiah 5 in the BOATCB

Isaiah 5 in the BOATCB2

Isaiah 5 in the BOBCV

Isaiah 5 in the BOCNT

Isaiah 5 in the BOECS

Isaiah 5 in the BOGWICC

Isaiah 5 in the BOHCB

Isaiah 5 in the BOHCV

Isaiah 5 in the BOHLNT

Isaiah 5 in the BOHNTLTAL

Isaiah 5 in the BOILNTAP

Isaiah 5 in the BOITCV

Isaiah 5 in the BOKCV

Isaiah 5 in the BOKCV2

Isaiah 5 in the BOKHWOG

Isaiah 5 in the BOKSSV

Isaiah 5 in the BOLCB

Isaiah 5 in the BOLCB2

Isaiah 5 in the BOMCV

Isaiah 5 in the BONAV

Isaiah 5 in the BONCB

Isaiah 5 in the BONLT

Isaiah 5 in the BONUT2

Isaiah 5 in the BOPLNT

Isaiah 5 in the BOSCB

Isaiah 5 in the BOSNC

Isaiah 5 in the BOTLNT

Isaiah 5 in the BOVCB

Isaiah 5 in the BOYCB

Isaiah 5 in the BPBB

Isaiah 5 in the BPH

Isaiah 5 in the BSB

Isaiah 5 in the CCB

Isaiah 5 in the CUV

Isaiah 5 in the CUVS

Isaiah 5 in the DBT

Isaiah 5 in the DGDNT

Isaiah 5 in the DHNT

Isaiah 5 in the DNT

Isaiah 5 in the ELBE

Isaiah 5 in the EMTV

Isaiah 5 in the ESV

Isaiah 5 in the FBV

Isaiah 5 in the FEB

Isaiah 5 in the GGMNT

Isaiah 5 in the GNT

Isaiah 5 in the HARY

Isaiah 5 in the HNT

Isaiah 5 in the IRVA

Isaiah 5 in the IRVB

Isaiah 5 in the IRVG

Isaiah 5 in the IRVH

Isaiah 5 in the IRVK

Isaiah 5 in the IRVM

Isaiah 5 in the IRVM2

Isaiah 5 in the IRVO

Isaiah 5 in the IRVP

Isaiah 5 in the IRVT

Isaiah 5 in the IRVT2

Isaiah 5 in the IRVU

Isaiah 5 in the ISVN

Isaiah 5 in the JSNT

Isaiah 5 in the KAPI

Isaiah 5 in the KBT1ETNIK

Isaiah 5 in the KBV

Isaiah 5 in the KJV

Isaiah 5 in the KNFD

Isaiah 5 in the LBA

Isaiah 5 in the LBLA

Isaiah 5 in the LNT

Isaiah 5 in the LSV

Isaiah 5 in the MAAL

Isaiah 5 in the MBV

Isaiah 5 in the MBV2

Isaiah 5 in the MHNT

Isaiah 5 in the MKNFD

Isaiah 5 in the MNG

Isaiah 5 in the MNT

Isaiah 5 in the MNT2

Isaiah 5 in the MRS1T

Isaiah 5 in the NAA

Isaiah 5 in the NASB

Isaiah 5 in the NBLA

Isaiah 5 in the NBS

Isaiah 5 in the NBVTP

Isaiah 5 in the NET2

Isaiah 5 in the NIV11

Isaiah 5 in the NNT

Isaiah 5 in the NNT2

Isaiah 5 in the NNT3

Isaiah 5 in the PDDPT

Isaiah 5 in the PFNT

Isaiah 5 in the RMNT

Isaiah 5 in the SBIAS

Isaiah 5 in the SBIBS

Isaiah 5 in the SBIBS2

Isaiah 5 in the SBICS

Isaiah 5 in the SBIDS

Isaiah 5 in the SBIGS

Isaiah 5 in the SBIHS

Isaiah 5 in the SBIIS

Isaiah 5 in the SBIIS2

Isaiah 5 in the SBIIS3

Isaiah 5 in the SBIKS

Isaiah 5 in the SBIKS2

Isaiah 5 in the SBIMS

Isaiah 5 in the SBIOS

Isaiah 5 in the SBIPS

Isaiah 5 in the SBISS

Isaiah 5 in the SBITS

Isaiah 5 in the SBITS2

Isaiah 5 in the SBITS3

Isaiah 5 in the SBITS4

Isaiah 5 in the SBIUS

Isaiah 5 in the SBIVS

Isaiah 5 in the SBT

Isaiah 5 in the SBT1E

Isaiah 5 in the SCHL

Isaiah 5 in the SNT

Isaiah 5 in the SUSU

Isaiah 5 in the SUSU2

Isaiah 5 in the SYNO

Isaiah 5 in the TBIAOTANT

Isaiah 5 in the TBT1E

Isaiah 5 in the TBT1E2

Isaiah 5 in the TFTIP

Isaiah 5 in the TFTU

Isaiah 5 in the TGNTATF3T

Isaiah 5 in the THAI

Isaiah 5 in the TNFD

Isaiah 5 in the TNT

Isaiah 5 in the TNTIK

Isaiah 5 in the TNTIL

Isaiah 5 in the TNTIN

Isaiah 5 in the TNTIP

Isaiah 5 in the TNTIZ

Isaiah 5 in the TOMA

Isaiah 5 in the TTENT

Isaiah 5 in the UBG

Isaiah 5 in the UGV

Isaiah 5 in the UGV2

Isaiah 5 in the UGV3

Isaiah 5 in the VBL

Isaiah 5 in the VDCC

Isaiah 5 in the YALU

Isaiah 5 in the YAPE

Isaiah 5 in the YBVTP

Isaiah 5 in the ZBP