Isaiah 58 (BOICB)
1 “Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu.Welie olu gị dịka opi ike.Gwa ndị m nnupu isi ha,gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha. 2 Kwa ụbọchị ka ha na-achọ mha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile,dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi,ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ.Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi,na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso. 3 Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,ma ị dịghị ahụta ya?Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala,ma ị dịghị ahụta nke a?’ “Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu,unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara. 4 Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taana-ele anya ka anụ olu unu nʼelu. 5 Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,ụbọchị nke ONYENWE ANYỊ nabatara? 6 “Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe hana itiji yoku ọbụla? 7 Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ. 8 Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,ebube ONYENWE ANYỊ ga-echekwa gị nʼazụ. 9 Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, ONYENWE ANYỊ ga-azakwa,ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a. “Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị, 10 ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,nyere ndị nọ na mkpa aka,mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie. 11 ONYENWE ANYỊ ga na-edu gị mgbe niile.Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,dịka isi iyi na-adịghị ata ata. 12 Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie.A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada,ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi. 13 “Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasịna ụbọchị nsọ ONYENWE ANYỊ ihe a na-akwanyere ugwu,ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ, 14 mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime ONYENWE ANYỊ,m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.”Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya.
In Other Versions
Isaiah 58 in the ANGEFD
Isaiah 58 in the ANTPNG2D
Isaiah 58 in the AS21
Isaiah 58 in the BAGH
Isaiah 58 in the BBPNG
Isaiah 58 in the BBT1E
Isaiah 58 in the BDS
Isaiah 58 in the BEV
Isaiah 58 in the BHAD
Isaiah 58 in the BIB
Isaiah 58 in the BLPT
Isaiah 58 in the BNT
Isaiah 58 in the BNTABOOT
Isaiah 58 in the BNTLV
Isaiah 58 in the BOATCB
Isaiah 58 in the BOATCB2
Isaiah 58 in the BOBCV
Isaiah 58 in the BOCNT
Isaiah 58 in the BOECS
Isaiah 58 in the BOGWICC
Isaiah 58 in the BOHCB
Isaiah 58 in the BOHCV
Isaiah 58 in the BOHLNT
Isaiah 58 in the BOHNTLTAL
Isaiah 58 in the BOILNTAP
Isaiah 58 in the BOITCV
Isaiah 58 in the BOKCV
Isaiah 58 in the BOKCV2
Isaiah 58 in the BOKHWOG
Isaiah 58 in the BOKSSV
Isaiah 58 in the BOLCB
Isaiah 58 in the BOLCB2
Isaiah 58 in the BOMCV
Isaiah 58 in the BONAV
Isaiah 58 in the BONCB
Isaiah 58 in the BONLT
Isaiah 58 in the BONUT2
Isaiah 58 in the BOPLNT
Isaiah 58 in the BOSCB
Isaiah 58 in the BOSNC
Isaiah 58 in the BOTLNT
Isaiah 58 in the BOVCB
Isaiah 58 in the BOYCB
Isaiah 58 in the BPBB
Isaiah 58 in the BPH
Isaiah 58 in the BSB
Isaiah 58 in the CCB
Isaiah 58 in the CUV
Isaiah 58 in the CUVS
Isaiah 58 in the DBT
Isaiah 58 in the DGDNT
Isaiah 58 in the DHNT
Isaiah 58 in the DNT
Isaiah 58 in the ELBE
Isaiah 58 in the EMTV
Isaiah 58 in the ESV
Isaiah 58 in the FBV
Isaiah 58 in the FEB
Isaiah 58 in the GGMNT
Isaiah 58 in the GNT
Isaiah 58 in the HARY
Isaiah 58 in the HNT
Isaiah 58 in the IRVA
Isaiah 58 in the IRVB
Isaiah 58 in the IRVG
Isaiah 58 in the IRVH
Isaiah 58 in the IRVK
Isaiah 58 in the IRVM
Isaiah 58 in the IRVM2
Isaiah 58 in the IRVO
Isaiah 58 in the IRVP
Isaiah 58 in the IRVT
Isaiah 58 in the IRVT2
Isaiah 58 in the IRVU
Isaiah 58 in the ISVN
Isaiah 58 in the JSNT
Isaiah 58 in the KAPI
Isaiah 58 in the KBT1ETNIK
Isaiah 58 in the KBV
Isaiah 58 in the KJV
Isaiah 58 in the KNFD
Isaiah 58 in the LBA
Isaiah 58 in the LBLA
Isaiah 58 in the LNT
Isaiah 58 in the LSV
Isaiah 58 in the MAAL
Isaiah 58 in the MBV
Isaiah 58 in the MBV2
Isaiah 58 in the MHNT
Isaiah 58 in the MKNFD
Isaiah 58 in the MNG
Isaiah 58 in the MNT
Isaiah 58 in the MNT2
Isaiah 58 in the MRS1T
Isaiah 58 in the NAA
Isaiah 58 in the NASB
Isaiah 58 in the NBLA
Isaiah 58 in the NBS
Isaiah 58 in the NBVTP
Isaiah 58 in the NET2
Isaiah 58 in the NIV11
Isaiah 58 in the NNT
Isaiah 58 in the NNT2
Isaiah 58 in the NNT3
Isaiah 58 in the PDDPT
Isaiah 58 in the PFNT
Isaiah 58 in the RMNT
Isaiah 58 in the SBIAS
Isaiah 58 in the SBIBS
Isaiah 58 in the SBIBS2
Isaiah 58 in the SBICS
Isaiah 58 in the SBIDS
Isaiah 58 in the SBIGS
Isaiah 58 in the SBIHS
Isaiah 58 in the SBIIS
Isaiah 58 in the SBIIS2
Isaiah 58 in the SBIIS3
Isaiah 58 in the SBIKS
Isaiah 58 in the SBIKS2
Isaiah 58 in the SBIMS
Isaiah 58 in the SBIOS
Isaiah 58 in the SBIPS
Isaiah 58 in the SBISS
Isaiah 58 in the SBITS
Isaiah 58 in the SBITS2
Isaiah 58 in the SBITS3
Isaiah 58 in the SBITS4
Isaiah 58 in the SBIUS
Isaiah 58 in the SBIVS
Isaiah 58 in the SBT
Isaiah 58 in the SBT1E
Isaiah 58 in the SCHL
Isaiah 58 in the SNT
Isaiah 58 in the SUSU
Isaiah 58 in the SUSU2
Isaiah 58 in the SYNO
Isaiah 58 in the TBIAOTANT
Isaiah 58 in the TBT1E
Isaiah 58 in the TBT1E2
Isaiah 58 in the TFTIP
Isaiah 58 in the TFTU
Isaiah 58 in the TGNTATF3T
Isaiah 58 in the THAI
Isaiah 58 in the TNFD
Isaiah 58 in the TNT
Isaiah 58 in the TNTIK
Isaiah 58 in the TNTIL
Isaiah 58 in the TNTIN
Isaiah 58 in the TNTIP
Isaiah 58 in the TNTIZ
Isaiah 58 in the TOMA
Isaiah 58 in the TTENT
Isaiah 58 in the UBG
Isaiah 58 in the UGV
Isaiah 58 in the UGV2
Isaiah 58 in the UGV3
Isaiah 58 in the VBL
Isaiah 58 in the VDCC
Isaiah 58 in the YALU
Isaiah 58 in the YAPE
Isaiah 58 in the YBVTP
Isaiah 58 in the ZBP