James 2 (BOICB)
1 Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2 Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3 ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4 ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5 Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6 Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7 Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? 8 Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. 9 Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. 10 Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11 Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. 12 Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. 13 Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya. 14 Olee uru ọ bara ụmụnna m, na mmadụ sịrị, enwere m okwukwe, ma okwukwe ahụ apụtaghị ihe nʼọrụ ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ pụrụ ịzọpụta ya? 15 Ọ bụrụ na otu nwanne anyị nwoke maọbụ nwanne anyị nwanyị yi nkịrịnka akwa, ọ bụrụkwa na o nweghị ihe oriri ga-ezuru ya nʼụbọchị, 16 ma otu onye nʼime unu asị ha, “Laa nʼudo, kpuchiekwa onwe gị nke ọma, rijuokwa afọ,” nʼenyeghị ya ihe dị mkpa maka ahụ ya, uru gịnị ka ọ bara? 17 Nʼụzọ dị otu a, okwukwe naanị ya bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ esoghị ya. 18 Otu onye ga-asị, “I nwere okwukwe; e nwere m ọrụ.”Gosi m okwukwe gị ma e wepụ ọrụ gị, aga m egosi gị okwukwe site nʼọrụ 19 I kweere na ọ bụ naanị otu Chineke, i mere nke ọma, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere ma kụja. 20 Gị onye nzuzu, ị na-achọ ka e gosi gị na okwukwe bụ ihe na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ọrụ e soghị ya? 21 Ọ bụ na nna anyị Ebraham abụghị onye a gụrụ nʼonye ezi omume site nʼọrụ ya, mgbe o jiri otu nwa ya bụ Aịzik chụọ aja nʼebe ịchụ aja? 22 Unu ahụghị na okwukwe ya na ọrụ soro rụkọọ nʼotu, e sitekwara nʼọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo oke. 23 Ọ bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, “Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume,” kpọọkwa ya enyi Chineke. 24 Unu ahụla na a na-esite nʼihe mmadụ rụrụ gụọ ya nʼonye ezi omume, ọ bụkwaghị naanị nʼokwukwe. 25 Nʼotu ụzọ ahụ, agụnyeghị Rehab, nwanyị akwụna ahụ nʼonye ezi omume nʼihi ọrụ ọ rụrụ, mgbe ọ kpọbatara ndị nnyopụta ahụ ma zipụkwa ha site nʼụzọ dị iche? 26 Dịka anụ ahụ na-enweghị mmụọ si bụrụ ihe nwụrụ anwụ, otu a ka ọ dịkwa okwukwe na-enweghị ọrụ.
In Other Versions
James 2 in the ANGEFD
James 2 in the ANTPNG2D
James 2 in the AS21
James 2 in the BAGH
James 2 in the BBPNG
James 2 in the BBT1E
James 2 in the BDS
James 2 in the BEV
James 2 in the BHAD
James 2 in the BIB
James 2 in the BLPT
James 2 in the BNT
James 2 in the BNTABOOT
James 2 in the BNTLV
James 2 in the BOATCB
James 2 in the BOATCB2
James 2 in the BOBCV
James 2 in the BOCNT
James 2 in the BOECS
James 2 in the BOGWICC
James 2 in the BOHCB
James 2 in the BOHCV
James 2 in the BOHLNT
James 2 in the BOHNTLTAL
James 2 in the BOILNTAP
James 2 in the BOITCV
James 2 in the BOKCV
James 2 in the BOKCV2
James 2 in the BOKHWOG
James 2 in the BOKSSV
James 2 in the BOLCB
James 2 in the BOLCB2
James 2 in the BOMCV
James 2 in the BONAV
James 2 in the BONCB
James 2 in the BONLT
James 2 in the BONUT2
James 2 in the BOPLNT
James 2 in the BOSCB
James 2 in the BOSNC
James 2 in the BOTLNT
James 2 in the BOVCB
James 2 in the BOYCB
James 2 in the BPBB
James 2 in the BPH
James 2 in the BSB
James 2 in the CCB
James 2 in the CUV
James 2 in the CUVS
James 2 in the DBT
James 2 in the DGDNT
James 2 in the DHNT
James 2 in the DNT
James 2 in the ELBE
James 2 in the EMTV
James 2 in the ESV
James 2 in the FBV
James 2 in the FEB
James 2 in the GGMNT
James 2 in the GNT
James 2 in the HARY
James 2 in the HNT
James 2 in the IRVA
James 2 in the IRVB
James 2 in the IRVG
James 2 in the IRVH
James 2 in the IRVK
James 2 in the IRVM
James 2 in the IRVM2
James 2 in the IRVO
James 2 in the IRVP
James 2 in the IRVT
James 2 in the IRVT2
James 2 in the IRVU
James 2 in the ISVN
James 2 in the JSNT
James 2 in the KAPI
James 2 in the KBT1ETNIK
James 2 in the KBV
James 2 in the KJV
James 2 in the KNFD
James 2 in the LBA
James 2 in the LBLA
James 2 in the LNT
James 2 in the LSV
James 2 in the MAAL
James 2 in the MBV
James 2 in the MBV2
James 2 in the MHNT
James 2 in the MKNFD
James 2 in the MNG
James 2 in the MNT
James 2 in the MNT2
James 2 in the MRS1T
James 2 in the NAA
James 2 in the NASB
James 2 in the NBLA
James 2 in the NBS
James 2 in the NBVTP
James 2 in the NET2
James 2 in the NIV11
James 2 in the NNT
James 2 in the NNT2
James 2 in the NNT3
James 2 in the PDDPT
James 2 in the PFNT
James 2 in the RMNT
James 2 in the SBIAS
James 2 in the SBIBS
James 2 in the SBIBS2
James 2 in the SBICS
James 2 in the SBIDS
James 2 in the SBIGS
James 2 in the SBIHS
James 2 in the SBIIS
James 2 in the SBIIS2
James 2 in the SBIIS3
James 2 in the SBIKS
James 2 in the SBIKS2
James 2 in the SBIMS
James 2 in the SBIOS
James 2 in the SBIPS
James 2 in the SBISS
James 2 in the SBITS
James 2 in the SBITS2
James 2 in the SBITS3
James 2 in the SBITS4
James 2 in the SBIUS
James 2 in the SBIVS
James 2 in the SBT
James 2 in the SBT1E
James 2 in the SCHL
James 2 in the SNT
James 2 in the SUSU
James 2 in the SUSU2
James 2 in the SYNO
James 2 in the TBIAOTANT
James 2 in the TBT1E
James 2 in the TBT1E2
James 2 in the TFTIP
James 2 in the TFTU
James 2 in the TGNTATF3T
James 2 in the THAI
James 2 in the TNFD
James 2 in the TNT
James 2 in the TNTIK
James 2 in the TNTIL
James 2 in the TNTIN
James 2 in the TNTIP
James 2 in the TNTIZ
James 2 in the TOMA
James 2 in the TTENT
James 2 in the UBG
James 2 in the UGV
James 2 in the UGV2
James 2 in the UGV3
James 2 in the VBL
James 2 in the VDCC
James 2 in the YALU
James 2 in the YAPE
James 2 in the YBVTP
James 2 in the ZBP