Jeremiah 13 (BOICB)
1 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.” 2 Ejere m zụta ajị ahụ dịka ONYENWE ANYỊ kwuru, kee ya nʼukwu m. 3 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m, 4 “Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.” 5 Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka ONYENWE ANYỊ gwara m. 6 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ONYENWE ANYỊ gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.” 7 Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla. 8 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 9 “Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem. 10 Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla. 11 Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 12 Sị ha, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’ 13 Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem. 14 Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 15 Nụrụnụ, geekwanụ ntị,unu ebulila onwe unu elu,nʼihi na ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. 16 Nyenụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu nsọpụrụ.Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;tupu unu akpọbie ụkwụ ununʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.Unu na-ele anya ìhèma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. 17 Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwanʼihi mpako unu.Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuunʼihi na igwe atụrụ ONYENWE ANYỊ ka a ga-adọta nʼagha. 18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha,“Sitenụ nʼocheeze unu rịdata,nʼihi na okpueze ọma unuga-esi nʼisi unu dapụ.” 19 A ga-emechi obodo niile nke Negeb.Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha.A ga-adọtakwa Juda niile nʼaghaburu ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20 Welienụ anya unuka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa.Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ,igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? 21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe ONYENWE ANYỊ mere ka ndị ahụ ị gụrụdịka ndị enyi gị bịa buso gị agha?Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gịọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme? 22 Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị,“Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?”Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gịka e ji dọwaa uwe mwụda gị,merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile. 23 Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya?Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa?Nʼụzọ dị otu a kwa,unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe. 24 “Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ,nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị. 25 Nke a bụ ihe unu fetara na nza,oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.“Nʼihi na unu echefuola m,tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche. 26 Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu,si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị. 27 Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị,na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile!Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile,nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa.Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem!Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”