Jeremiah 17 (BOICB)

1 “E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị,depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha,nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha. 2 Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera,nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ,ma nʼelu ugwu nta niile. 3 Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,na ihe niile ha nwere, na akụnụba haka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile. 4 Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gịnʼala nke ị na-amaghị,nʼihi na ị kpasuola iwe m,ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” 5 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,onye wezugara obi ya site nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 6 Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7 “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi ya.Onye ịnya isi ya bụ nʼime ONYENWE ANYỊ. 8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9 Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,o nwekwaghị ngwọta.Onye pụrụ ịghọta ya? 10 “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na-enyocha obi,na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.” 11 Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị.Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha.Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu. 12 Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,ka ebe nsọ anyị bụ. 13 ONYENWE ANYỊ, olileanya Izrel ka ị bụ.A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ.A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala,nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe ONYENWE ANYỊ,isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ. 14 ONYENWE ANYỊ, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara,nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto. 15 Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m,“Olee ebe okwu ONYENWE ANYỊ dị?Ya mezuonụ ugbu a!” 16 Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m.Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba.Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ. 17 A ghọrọla m ihe na-eyi egwu,nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi. 18 Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m.Ekwekwala ka ihere mee m.Mee ka ha tụọ ụjọ,ma chebe m site nʼihe egwu.Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha,werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha. 19 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem. 20 Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’ 21 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya. 22 Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu. 23 Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya. 24 Ma otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya, 25 mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi. 26 Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ ONYENWE ANYỊ. 27 Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 17 in the ANGEFD

Jeremiah 17 in the ANTPNG2D

Jeremiah 17 in the AS21

Jeremiah 17 in the BAGH

Jeremiah 17 in the BBPNG

Jeremiah 17 in the BBT1E

Jeremiah 17 in the BDS

Jeremiah 17 in the BEV

Jeremiah 17 in the BHAD

Jeremiah 17 in the BIB

Jeremiah 17 in the BLPT

Jeremiah 17 in the BNT

Jeremiah 17 in the BNTABOOT

Jeremiah 17 in the BNTLV

Jeremiah 17 in the BOATCB

Jeremiah 17 in the BOATCB2

Jeremiah 17 in the BOBCV

Jeremiah 17 in the BOCNT

Jeremiah 17 in the BOECS

Jeremiah 17 in the BOGWICC

Jeremiah 17 in the BOHCB

Jeremiah 17 in the BOHCV

Jeremiah 17 in the BOHLNT

Jeremiah 17 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 17 in the BOILNTAP

Jeremiah 17 in the BOITCV

Jeremiah 17 in the BOKCV

Jeremiah 17 in the BOKCV2

Jeremiah 17 in the BOKHWOG

Jeremiah 17 in the BOKSSV

Jeremiah 17 in the BOLCB

Jeremiah 17 in the BOLCB2

Jeremiah 17 in the BOMCV

Jeremiah 17 in the BONAV

Jeremiah 17 in the BONCB

Jeremiah 17 in the BONLT

Jeremiah 17 in the BONUT2

Jeremiah 17 in the BOPLNT

Jeremiah 17 in the BOSCB

Jeremiah 17 in the BOSNC

Jeremiah 17 in the BOTLNT

Jeremiah 17 in the BOVCB

Jeremiah 17 in the BOYCB

Jeremiah 17 in the BPBB

Jeremiah 17 in the BPH

Jeremiah 17 in the BSB

Jeremiah 17 in the CCB

Jeremiah 17 in the CUV

Jeremiah 17 in the CUVS

Jeremiah 17 in the DBT

Jeremiah 17 in the DGDNT

Jeremiah 17 in the DHNT

Jeremiah 17 in the DNT

Jeremiah 17 in the ELBE

Jeremiah 17 in the EMTV

Jeremiah 17 in the ESV

Jeremiah 17 in the FBV

Jeremiah 17 in the FEB

Jeremiah 17 in the GGMNT

Jeremiah 17 in the GNT

Jeremiah 17 in the HARY

Jeremiah 17 in the HNT

Jeremiah 17 in the IRVA

Jeremiah 17 in the IRVB

Jeremiah 17 in the IRVG

Jeremiah 17 in the IRVH

Jeremiah 17 in the IRVK

Jeremiah 17 in the IRVM

Jeremiah 17 in the IRVM2

Jeremiah 17 in the IRVO

Jeremiah 17 in the IRVP

Jeremiah 17 in the IRVT

Jeremiah 17 in the IRVT2

Jeremiah 17 in the IRVU

Jeremiah 17 in the ISVN

Jeremiah 17 in the JSNT

Jeremiah 17 in the KAPI

Jeremiah 17 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 17 in the KBV

Jeremiah 17 in the KJV

Jeremiah 17 in the KNFD

Jeremiah 17 in the LBA

Jeremiah 17 in the LBLA

Jeremiah 17 in the LNT

Jeremiah 17 in the LSV

Jeremiah 17 in the MAAL

Jeremiah 17 in the MBV

Jeremiah 17 in the MBV2

Jeremiah 17 in the MHNT

Jeremiah 17 in the MKNFD

Jeremiah 17 in the MNG

Jeremiah 17 in the MNT

Jeremiah 17 in the MNT2

Jeremiah 17 in the MRS1T

Jeremiah 17 in the NAA

Jeremiah 17 in the NASB

Jeremiah 17 in the NBLA

Jeremiah 17 in the NBS

Jeremiah 17 in the NBVTP

Jeremiah 17 in the NET2

Jeremiah 17 in the NIV11

Jeremiah 17 in the NNT

Jeremiah 17 in the NNT2

Jeremiah 17 in the NNT3

Jeremiah 17 in the PDDPT

Jeremiah 17 in the PFNT

Jeremiah 17 in the RMNT

Jeremiah 17 in the SBIAS

Jeremiah 17 in the SBIBS

Jeremiah 17 in the SBIBS2

Jeremiah 17 in the SBICS

Jeremiah 17 in the SBIDS

Jeremiah 17 in the SBIGS

Jeremiah 17 in the SBIHS

Jeremiah 17 in the SBIIS

Jeremiah 17 in the SBIIS2

Jeremiah 17 in the SBIIS3

Jeremiah 17 in the SBIKS

Jeremiah 17 in the SBIKS2

Jeremiah 17 in the SBIMS

Jeremiah 17 in the SBIOS

Jeremiah 17 in the SBIPS

Jeremiah 17 in the SBISS

Jeremiah 17 in the SBITS

Jeremiah 17 in the SBITS2

Jeremiah 17 in the SBITS3

Jeremiah 17 in the SBITS4

Jeremiah 17 in the SBIUS

Jeremiah 17 in the SBIVS

Jeremiah 17 in the SBT

Jeremiah 17 in the SBT1E

Jeremiah 17 in the SCHL

Jeremiah 17 in the SNT

Jeremiah 17 in the SUSU

Jeremiah 17 in the SUSU2

Jeremiah 17 in the SYNO

Jeremiah 17 in the TBIAOTANT

Jeremiah 17 in the TBT1E

Jeremiah 17 in the TBT1E2

Jeremiah 17 in the TFTIP

Jeremiah 17 in the TFTU

Jeremiah 17 in the TGNTATF3T

Jeremiah 17 in the THAI

Jeremiah 17 in the TNFD

Jeremiah 17 in the TNT

Jeremiah 17 in the TNTIK

Jeremiah 17 in the TNTIL

Jeremiah 17 in the TNTIN

Jeremiah 17 in the TNTIP

Jeremiah 17 in the TNTIZ

Jeremiah 17 in the TOMA

Jeremiah 17 in the TTENT

Jeremiah 17 in the UBG

Jeremiah 17 in the UGV

Jeremiah 17 in the UGV2

Jeremiah 17 in the UGV3

Jeremiah 17 in the VBL

Jeremiah 17 in the VDCC

Jeremiah 17 in the YALU

Jeremiah 17 in the YAPE

Jeremiah 17 in the YBVTP

Jeremiah 17 in the ZBP