Jeremiah 23 (BOICB)

1 “Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 2 Ya mere, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 3 “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. 4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 5 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,Izrel ga-ebikwa nʼudo.Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: ONYENWE ANYỊ Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị. 7 “Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’ 8 ma ha ga-asị, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.” 9 Ma banyere ndị amụma,obi m na-agbawa nʼime m,ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,dịka onye ṅụbigara mmanya oke,nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka ONYENWE ANYỊ,na site nʼokwu nsọ ya. 10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi. 11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrịebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị hanʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 13 “Ahụrụ m ihe arụnʼetiti ndị amụma Sameria:Ha buru amụma site nʼike chi Baal,si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie. 14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe yanʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.Ha na-agba ndị ajọ omume ume,si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.” 15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalemgbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.” 16 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,o sighị nʼọnụ ONYENWE ANYỊ rute ha 17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,‘ONYENWE ANYỊ kwuru sị, unu ga-enwe udo.’Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’ 18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru ONYENWE ANYỊ nso,hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya? 19 Lee, ONYENWE ANYỊ na-ezite oke ifufe na-efesi ike,ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,nke ga-abịabufuo ndị ajọ omume a. 20 ONYENWE ANYỊ agaghị akwụsị iwe iwe yatutu ruo mgbe o mezuruihe niile dị ya nʼobi.Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma. 21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,ma ha nọkwa na-ebu amụma. 22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,ha gaara ekwusara ndị m okwu m,nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa,sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzonke m na-enweghị ike ịhụ anya?”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara.“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’ 26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi? 27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal. 28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?” 30 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya. 31 E, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ pụta.’ 32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole? Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ 34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ. 35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa ONYENWE ANYỊ nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ nata?’ 36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị. 37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa ONYENWE ANYỊ nyere gị? Maọbụ, gịnị ka ONYENWE ANYỊ kwuru?’ 38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka ONYENWE ANYỊ,’ ma lee ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka ONYENWE ANYỊ,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka ONYENWE ANYỊ.’ 39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha. 40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”

In Other Versions

Jeremiah 23 in the ANGEFD

Jeremiah 23 in the ANTPNG2D

Jeremiah 23 in the AS21

Jeremiah 23 in the BAGH

Jeremiah 23 in the BBPNG

Jeremiah 23 in the BBT1E

Jeremiah 23 in the BDS

Jeremiah 23 in the BEV

Jeremiah 23 in the BHAD

Jeremiah 23 in the BIB

Jeremiah 23 in the BLPT

Jeremiah 23 in the BNT

Jeremiah 23 in the BNTABOOT

Jeremiah 23 in the BNTLV

Jeremiah 23 in the BOATCB

Jeremiah 23 in the BOATCB2

Jeremiah 23 in the BOBCV

Jeremiah 23 in the BOCNT

Jeremiah 23 in the BOECS

Jeremiah 23 in the BOGWICC

Jeremiah 23 in the BOHCB

Jeremiah 23 in the BOHCV

Jeremiah 23 in the BOHLNT

Jeremiah 23 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 23 in the BOILNTAP

Jeremiah 23 in the BOITCV

Jeremiah 23 in the BOKCV

Jeremiah 23 in the BOKCV2

Jeremiah 23 in the BOKHWOG

Jeremiah 23 in the BOKSSV

Jeremiah 23 in the BOLCB

Jeremiah 23 in the BOLCB2

Jeremiah 23 in the BOMCV

Jeremiah 23 in the BONAV

Jeremiah 23 in the BONCB

Jeremiah 23 in the BONLT

Jeremiah 23 in the BONUT2

Jeremiah 23 in the BOPLNT

Jeremiah 23 in the BOSCB

Jeremiah 23 in the BOSNC

Jeremiah 23 in the BOTLNT

Jeremiah 23 in the BOVCB

Jeremiah 23 in the BOYCB

Jeremiah 23 in the BPBB

Jeremiah 23 in the BPH

Jeremiah 23 in the BSB

Jeremiah 23 in the CCB

Jeremiah 23 in the CUV

Jeremiah 23 in the CUVS

Jeremiah 23 in the DBT

Jeremiah 23 in the DGDNT

Jeremiah 23 in the DHNT

Jeremiah 23 in the DNT

Jeremiah 23 in the ELBE

Jeremiah 23 in the EMTV

Jeremiah 23 in the ESV

Jeremiah 23 in the FBV

Jeremiah 23 in the FEB

Jeremiah 23 in the GGMNT

Jeremiah 23 in the GNT

Jeremiah 23 in the HARY

Jeremiah 23 in the HNT

Jeremiah 23 in the IRVA

Jeremiah 23 in the IRVB

Jeremiah 23 in the IRVG

Jeremiah 23 in the IRVH

Jeremiah 23 in the IRVK

Jeremiah 23 in the IRVM

Jeremiah 23 in the IRVM2

Jeremiah 23 in the IRVO

Jeremiah 23 in the IRVP

Jeremiah 23 in the IRVT

Jeremiah 23 in the IRVT2

Jeremiah 23 in the IRVU

Jeremiah 23 in the ISVN

Jeremiah 23 in the JSNT

Jeremiah 23 in the KAPI

Jeremiah 23 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 23 in the KBV

Jeremiah 23 in the KJV

Jeremiah 23 in the KNFD

Jeremiah 23 in the LBA

Jeremiah 23 in the LBLA

Jeremiah 23 in the LNT

Jeremiah 23 in the LSV

Jeremiah 23 in the MAAL

Jeremiah 23 in the MBV

Jeremiah 23 in the MBV2

Jeremiah 23 in the MHNT

Jeremiah 23 in the MKNFD

Jeremiah 23 in the MNG

Jeremiah 23 in the MNT

Jeremiah 23 in the MNT2

Jeremiah 23 in the MRS1T

Jeremiah 23 in the NAA

Jeremiah 23 in the NASB

Jeremiah 23 in the NBLA

Jeremiah 23 in the NBS

Jeremiah 23 in the NBVTP

Jeremiah 23 in the NET2

Jeremiah 23 in the NIV11

Jeremiah 23 in the NNT

Jeremiah 23 in the NNT2

Jeremiah 23 in the NNT3

Jeremiah 23 in the PDDPT

Jeremiah 23 in the PFNT

Jeremiah 23 in the RMNT

Jeremiah 23 in the SBIAS

Jeremiah 23 in the SBIBS

Jeremiah 23 in the SBIBS2

Jeremiah 23 in the SBICS

Jeremiah 23 in the SBIDS

Jeremiah 23 in the SBIGS

Jeremiah 23 in the SBIHS

Jeremiah 23 in the SBIIS

Jeremiah 23 in the SBIIS2

Jeremiah 23 in the SBIIS3

Jeremiah 23 in the SBIKS

Jeremiah 23 in the SBIKS2

Jeremiah 23 in the SBIMS

Jeremiah 23 in the SBIOS

Jeremiah 23 in the SBIPS

Jeremiah 23 in the SBISS

Jeremiah 23 in the SBITS

Jeremiah 23 in the SBITS2

Jeremiah 23 in the SBITS3

Jeremiah 23 in the SBITS4

Jeremiah 23 in the SBIUS

Jeremiah 23 in the SBIVS

Jeremiah 23 in the SBT

Jeremiah 23 in the SBT1E

Jeremiah 23 in the SCHL

Jeremiah 23 in the SNT

Jeremiah 23 in the SUSU

Jeremiah 23 in the SUSU2

Jeremiah 23 in the SYNO

Jeremiah 23 in the TBIAOTANT

Jeremiah 23 in the TBT1E

Jeremiah 23 in the TBT1E2

Jeremiah 23 in the TFTIP

Jeremiah 23 in the TFTU

Jeremiah 23 in the TGNTATF3T

Jeremiah 23 in the THAI

Jeremiah 23 in the TNFD

Jeremiah 23 in the TNT

Jeremiah 23 in the TNTIK

Jeremiah 23 in the TNTIL

Jeremiah 23 in the TNTIN

Jeremiah 23 in the TNTIP

Jeremiah 23 in the TNTIZ

Jeremiah 23 in the TOMA

Jeremiah 23 in the TTENT

Jeremiah 23 in the UBG

Jeremiah 23 in the UGV

Jeremiah 23 in the UGV2

Jeremiah 23 in the UGV3

Jeremiah 23 in the VBL

Jeremiah 23 in the VDCC

Jeremiah 23 in the YALU

Jeremiah 23 in the YAPE

Jeremiah 23 in the YBVTP

Jeremiah 23 in the ZBP