Jeremiah 4 (BOICB)
1 “Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,mụ ka ị ga-alọghachikwute,”“Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m,hapụ isi ebe m nọ kpafuo, 2 ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omumeṅụọ iyi sị, ‘Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ,’mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na yanyakwaa isi nʼime ya.” 3 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị,“Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị;unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu. 4 Bienụ onwe unu ugwu nye ONYENWE ANYỊ,biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalemma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. 5 “Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaagbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. 6 Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibina ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” 7 Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.Ọ hapụla ebe obibi ya,na-abịa ịla Juda nʼiyi.Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. 8 Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,nʼihi na ọnụma ONYENWE ANYỊ esitebeghịnʼebe Juda nọ wezuga onwe ya. 9 “Nʼụbọchị ahụ,” ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” 10 Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” 11 Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, 12 ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” 13 Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii.Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe,ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo.Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! 14 Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị.Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? 15 Otu olu na-akpọsa site na Dan,ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem. 16 “Gwa mba niile otu a, ha abịala,kpọsaa banyere Jerusalem:‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda. 17 Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 18 “Ụzọ gị na omume gị niilebuteere gị ihe ndị a.Nke a bụ ntaramahụhụ gị.Lee ka o si dị ilu!Lee ka o si emibanye nʼime obi.” 19 Ihe mgbu a dị ukwuu.Lee na apụghị m ịnagide ya.Obi m o, obi m o!Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim.Apụghịkwa m ịnọ jụụ.Ana m anụ ụda opi ike,na-anụkwa ụzụ agha. 20 Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu,lee na a laala ala a niile nʼiyi.Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile;a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile. 21 Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ?Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike? 22 “Ndị m bụ ndị nzuzu,ha amaghị m.Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche,ha enweghị nghọta ọbụla.Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume,ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.” 23 Elere m anya nʼụwahụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu,leekwa anya na mbara eluigwe,ma o nweghị ìhè dị ya. 24 Elere m anya nʼugwu ukwu,hụ na ha na-ama jijiji,leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị. 25 Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla,ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala. 26 Ala ọma ahụ aghọọla ọzara,obodo niile aghọọla mkputamkpu ebenʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihu oke iwe ya. 27 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“A ga-ebibi ala ahụ niile,ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam. 28 Ụwa ga-eru ụjụ,mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m.Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.” 29 Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo hamgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu. 30 Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya?Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie,were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu?Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu?Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma.Ndị iko unu na-elelị unu;ndụ unu ka ha na-achọkwa. 31 Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme,ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya.Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike.Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị,“Onye nwụrụ anwụ ka m bụ!Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”