Matthew 10 (BOICB)

1 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 2 Nke a bụ aha ndị ozi iri na abụọ ahụ: Saimọn (onye a na-akpọkwa Pita) na Andru nwanne Saimọn;Jemis nwa Zebedi, na Jọn nwanne ya. 3 Filip na Batalomi;Tọmọs na Matiu onye ọna ụtụ;Jemis nwa Alfiọs, na Tadiọs. 4 Saimọn onye a na-akpọ Zilọt na Judas Iskarịọt, onye raara ya nye nʼaka ndị gburu ya. 5 Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6 Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7 Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8 Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu. 9 “Mgbe unu na-aga, unu anatala ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ ọla ọbụla tinye nʼime belịt unu. 10 Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya. 11 Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ. 12 Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu. 13 Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu. 14 Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu. 15 Nʼeziokwu, ọ ga-adịrị obodo ahụ njọ nʼụbọchị ikpe karịa obodo Sọdọm na Gọmọra. 16 “Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru. 17 Kpachapụnụ anya. Nʼihi na a ga-enyefe unu nʼaka nzukọ ndị ụlọ ikpe, pịaakwa unu ihe nʼụlọ ekpere ha. 18 A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ. 19 Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, maọbụ otu unu ga-esi kwuo ya. Nʼihi na a ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nʼoge ahụ. 20 Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nʼonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nʼeluigwe ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu. 21 “Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 22 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta. 23 Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi. 24 “Nwata akwụkwọ adịghị akarị onye nkuzi ya. Ohu adịghị akarịkwa nna ya ukwu. 25 O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a? 26 “Ya mere unu atụla ha egwu. O nweghị ihe ọbụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, maọbụ ihe e zoro ezo nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè. 27 Ihe m na-agwa unu ugbu a na nzuzo, kọsaanụ ya mgbe chi bọrọ. Ihe m ji nwayọọ mee ka ọ baa unu na ntị, nọdụnụ nʼelu ụlọ kwusaa ya. 28 Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. 29 Ọ bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma ọ bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị. 30 Ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. 31 Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza. 32 “Ya mere, onye ọbụla kwupụtara m nʼihu ụmụ mmadụ, ka mụ onwe m ga-ekwupụta nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 33 Ma onye ọbụla na-agọnarị m nʼihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nʼihu Nna m bi nʼeluigwe. 34 “Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha. 35 Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya, 36 ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’ 37 “Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. 38 Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. 39 Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya. 40 “Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata. 41 Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume. 42 Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”

In Other Versions

Matthew 10 in the ANGEFD

Matthew 10 in the ANTPNG2D

Matthew 10 in the AS21

Matthew 10 in the BAGH

Matthew 10 in the BBPNG

Matthew 10 in the BBT1E

Matthew 10 in the BDS

Matthew 10 in the BEV

Matthew 10 in the BHAD

Matthew 10 in the BIB

Matthew 10 in the BLPT

Matthew 10 in the BNT

Matthew 10 in the BNTABOOT

Matthew 10 in the BNTLV

Matthew 10 in the BOATCB

Matthew 10 in the BOATCB2

Matthew 10 in the BOBCV

Matthew 10 in the BOCNT

Matthew 10 in the BOECS

Matthew 10 in the BOGWICC

Matthew 10 in the BOHCB

Matthew 10 in the BOHCV

Matthew 10 in the BOHLNT

Matthew 10 in the BOHNTLTAL

Matthew 10 in the BOILNTAP

Matthew 10 in the BOITCV

Matthew 10 in the BOKCV

Matthew 10 in the BOKCV2

Matthew 10 in the BOKHWOG

Matthew 10 in the BOKSSV

Matthew 10 in the BOLCB

Matthew 10 in the BOLCB2

Matthew 10 in the BOMCV

Matthew 10 in the BONAV

Matthew 10 in the BONCB

Matthew 10 in the BONLT

Matthew 10 in the BONUT2

Matthew 10 in the BOPLNT

Matthew 10 in the BOSCB

Matthew 10 in the BOSNC

Matthew 10 in the BOTLNT

Matthew 10 in the BOVCB

Matthew 10 in the BOYCB

Matthew 10 in the BPBB

Matthew 10 in the BPH

Matthew 10 in the BSB

Matthew 10 in the CCB

Matthew 10 in the CUV

Matthew 10 in the CUVS

Matthew 10 in the DBT

Matthew 10 in the DGDNT

Matthew 10 in the DHNT

Matthew 10 in the DNT

Matthew 10 in the ELBE

Matthew 10 in the EMTV

Matthew 10 in the ESV

Matthew 10 in the FBV

Matthew 10 in the FEB

Matthew 10 in the GGMNT

Matthew 10 in the GNT

Matthew 10 in the HARY

Matthew 10 in the HNT

Matthew 10 in the IRVA

Matthew 10 in the IRVB

Matthew 10 in the IRVG

Matthew 10 in the IRVH

Matthew 10 in the IRVK

Matthew 10 in the IRVM

Matthew 10 in the IRVM2

Matthew 10 in the IRVO

Matthew 10 in the IRVP

Matthew 10 in the IRVT

Matthew 10 in the IRVT2

Matthew 10 in the IRVU

Matthew 10 in the ISVN

Matthew 10 in the JSNT

Matthew 10 in the KAPI

Matthew 10 in the KBT1ETNIK

Matthew 10 in the KBV

Matthew 10 in the KJV

Matthew 10 in the KNFD

Matthew 10 in the LBA

Matthew 10 in the LBLA

Matthew 10 in the LNT

Matthew 10 in the LSV

Matthew 10 in the MAAL

Matthew 10 in the MBV

Matthew 10 in the MBV2

Matthew 10 in the MHNT

Matthew 10 in the MKNFD

Matthew 10 in the MNG

Matthew 10 in the MNT

Matthew 10 in the MNT2

Matthew 10 in the MRS1T

Matthew 10 in the NAA

Matthew 10 in the NASB

Matthew 10 in the NBLA

Matthew 10 in the NBS

Matthew 10 in the NBVTP

Matthew 10 in the NET2

Matthew 10 in the NIV11

Matthew 10 in the NNT

Matthew 10 in the NNT2

Matthew 10 in the NNT3

Matthew 10 in the PDDPT

Matthew 10 in the PFNT

Matthew 10 in the RMNT

Matthew 10 in the SBIAS

Matthew 10 in the SBIBS

Matthew 10 in the SBIBS2

Matthew 10 in the SBICS

Matthew 10 in the SBIDS

Matthew 10 in the SBIGS

Matthew 10 in the SBIHS

Matthew 10 in the SBIIS

Matthew 10 in the SBIIS2

Matthew 10 in the SBIIS3

Matthew 10 in the SBIKS

Matthew 10 in the SBIKS2

Matthew 10 in the SBIMS

Matthew 10 in the SBIOS

Matthew 10 in the SBIPS

Matthew 10 in the SBISS

Matthew 10 in the SBITS

Matthew 10 in the SBITS2

Matthew 10 in the SBITS3

Matthew 10 in the SBITS4

Matthew 10 in the SBIUS

Matthew 10 in the SBIVS

Matthew 10 in the SBT

Matthew 10 in the SBT1E

Matthew 10 in the SCHL

Matthew 10 in the SNT

Matthew 10 in the SUSU

Matthew 10 in the SUSU2

Matthew 10 in the SYNO

Matthew 10 in the TBIAOTANT

Matthew 10 in the TBT1E

Matthew 10 in the TBT1E2

Matthew 10 in the TFTIP

Matthew 10 in the TFTU

Matthew 10 in the TGNTATF3T

Matthew 10 in the THAI

Matthew 10 in the TNFD

Matthew 10 in the TNT

Matthew 10 in the TNTIK

Matthew 10 in the TNTIL

Matthew 10 in the TNTIN

Matthew 10 in the TNTIP

Matthew 10 in the TNTIZ

Matthew 10 in the TOMA

Matthew 10 in the TTENT

Matthew 10 in the UBG

Matthew 10 in the UGV

Matthew 10 in the UGV2

Matthew 10 in the UGV3

Matthew 10 in the VBL

Matthew 10 in the VDCC

Matthew 10 in the YALU

Matthew 10 in the YAPE

Matthew 10 in the YBVTP

Matthew 10 in the ZBP