Matthew 14 (BOICB)

1 Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs. 2 Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.” 3 Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke. 4 Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.” 5 Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma. 6 Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu. 7 Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ. 8 Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.” 9 Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ. 10 O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 11 E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya. 12 Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere. 13 Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala. 14 Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha. 15 Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.” 16 Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17 Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.” 18 Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.” 19 Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ. 20 Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ. 21 Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị. 22 Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23 Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ. 24 Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya. 25 Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. 26 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu. 27 Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.” 28 Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.” 29 Ọ sịrị ya, “Bịa!”Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs. 30 Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!” 31 Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!” 32 Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. 33 Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.” 34 Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret. 35 Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike. 36 Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.

In Other Versions

Matthew 14 in the ANGEFD

Matthew 14 in the ANTPNG2D

Matthew 14 in the AS21

Matthew 14 in the BAGH

Matthew 14 in the BBPNG

Matthew 14 in the BBT1E

Matthew 14 in the BDS

Matthew 14 in the BEV

Matthew 14 in the BHAD

Matthew 14 in the BIB

Matthew 14 in the BLPT

Matthew 14 in the BNT

Matthew 14 in the BNTABOOT

Matthew 14 in the BNTLV

Matthew 14 in the BOATCB

Matthew 14 in the BOATCB2

Matthew 14 in the BOBCV

Matthew 14 in the BOCNT

Matthew 14 in the BOECS

Matthew 14 in the BOGWICC

Matthew 14 in the BOHCB

Matthew 14 in the BOHCV

Matthew 14 in the BOHLNT

Matthew 14 in the BOHNTLTAL

Matthew 14 in the BOILNTAP

Matthew 14 in the BOITCV

Matthew 14 in the BOKCV

Matthew 14 in the BOKCV2

Matthew 14 in the BOKHWOG

Matthew 14 in the BOKSSV

Matthew 14 in the BOLCB

Matthew 14 in the BOLCB2

Matthew 14 in the BOMCV

Matthew 14 in the BONAV

Matthew 14 in the BONCB

Matthew 14 in the BONLT

Matthew 14 in the BONUT2

Matthew 14 in the BOPLNT

Matthew 14 in the BOSCB

Matthew 14 in the BOSNC

Matthew 14 in the BOTLNT

Matthew 14 in the BOVCB

Matthew 14 in the BOYCB

Matthew 14 in the BPBB

Matthew 14 in the BPH

Matthew 14 in the BSB

Matthew 14 in the CCB

Matthew 14 in the CUV

Matthew 14 in the CUVS

Matthew 14 in the DBT

Matthew 14 in the DGDNT

Matthew 14 in the DHNT

Matthew 14 in the DNT

Matthew 14 in the ELBE

Matthew 14 in the EMTV

Matthew 14 in the ESV

Matthew 14 in the FBV

Matthew 14 in the FEB

Matthew 14 in the GGMNT

Matthew 14 in the GNT

Matthew 14 in the HARY

Matthew 14 in the HNT

Matthew 14 in the IRVA

Matthew 14 in the IRVB

Matthew 14 in the IRVG

Matthew 14 in the IRVH

Matthew 14 in the IRVK

Matthew 14 in the IRVM

Matthew 14 in the IRVM2

Matthew 14 in the IRVO

Matthew 14 in the IRVP

Matthew 14 in the IRVT

Matthew 14 in the IRVT2

Matthew 14 in the IRVU

Matthew 14 in the ISVN

Matthew 14 in the JSNT

Matthew 14 in the KAPI

Matthew 14 in the KBT1ETNIK

Matthew 14 in the KBV

Matthew 14 in the KJV

Matthew 14 in the KNFD

Matthew 14 in the LBA

Matthew 14 in the LBLA

Matthew 14 in the LNT

Matthew 14 in the LSV

Matthew 14 in the MAAL

Matthew 14 in the MBV

Matthew 14 in the MBV2

Matthew 14 in the MHNT

Matthew 14 in the MKNFD

Matthew 14 in the MNG

Matthew 14 in the MNT

Matthew 14 in the MNT2

Matthew 14 in the MRS1T

Matthew 14 in the NAA

Matthew 14 in the NASB

Matthew 14 in the NBLA

Matthew 14 in the NBS

Matthew 14 in the NBVTP

Matthew 14 in the NET2

Matthew 14 in the NIV11

Matthew 14 in the NNT

Matthew 14 in the NNT2

Matthew 14 in the NNT3

Matthew 14 in the PDDPT

Matthew 14 in the PFNT

Matthew 14 in the RMNT

Matthew 14 in the SBIAS

Matthew 14 in the SBIBS

Matthew 14 in the SBIBS2

Matthew 14 in the SBICS

Matthew 14 in the SBIDS

Matthew 14 in the SBIGS

Matthew 14 in the SBIHS

Matthew 14 in the SBIIS

Matthew 14 in the SBIIS2

Matthew 14 in the SBIIS3

Matthew 14 in the SBIKS

Matthew 14 in the SBIKS2

Matthew 14 in the SBIMS

Matthew 14 in the SBIOS

Matthew 14 in the SBIPS

Matthew 14 in the SBISS

Matthew 14 in the SBITS

Matthew 14 in the SBITS2

Matthew 14 in the SBITS3

Matthew 14 in the SBITS4

Matthew 14 in the SBIUS

Matthew 14 in the SBIVS

Matthew 14 in the SBT

Matthew 14 in the SBT1E

Matthew 14 in the SCHL

Matthew 14 in the SNT

Matthew 14 in the SUSU

Matthew 14 in the SUSU2

Matthew 14 in the SYNO

Matthew 14 in the TBIAOTANT

Matthew 14 in the TBT1E

Matthew 14 in the TBT1E2

Matthew 14 in the TFTIP

Matthew 14 in the TFTU

Matthew 14 in the TGNTATF3T

Matthew 14 in the THAI

Matthew 14 in the TNFD

Matthew 14 in the TNT

Matthew 14 in the TNTIK

Matthew 14 in the TNTIL

Matthew 14 in the TNTIN

Matthew 14 in the TNTIP

Matthew 14 in the TNTIZ

Matthew 14 in the TOMA

Matthew 14 in the TTENT

Matthew 14 in the UBG

Matthew 14 in the UGV

Matthew 14 in the UGV2

Matthew 14 in the UGV3

Matthew 14 in the VBL

Matthew 14 in the VDCC

Matthew 14 in the YALU

Matthew 14 in the YAPE

Matthew 14 in the YBVTP

Matthew 14 in the ZBP