Matthew 20 (BOICB)

1 “Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya. 2 Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya. 3 “Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ. 4 Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’ 5 Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ. 6 Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’ 7 “Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’ 8 “Mgbe o ruru oge anyasị, onye nwe ubi vaịnị ahụ gwara onye na-elekọtara ya ndị ahụ anya sị, ‘Kpọkọta ndị ọrụ ahụ kwụọ ha ụgwọ, site na ndị ikpeazụ bịara ọrụ ruo na ndị bu ụzọ.’ 9 “Mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼelekere ise anyasị naara ego ha, a kwụrụ ha otu denarị, otu denarị. 10 Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị. 11 Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ, 12 na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’ 13 “Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị? 14 Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị. 15 Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’ 16 “Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.” 17 Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha, 18 “Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, 19 nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.” 20 Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. 21 Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.” 22 Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?”Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.” 23 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, ma ịnọdụ nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe m, abụghị ihe dịrị m inye, kama ọ dịịrị ndị ahụ Nna m kwadooro ya.” 24 Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu megide ụmụnne abụọ a. 25 Ma Jisọs kpọkọtara ha niile, sị ha, “Nʼetiti ndị na-ekweghị ekwe, ndịisi ha na-emeso ndị ha na-achị mmeso dị ka o si dị ha mma nʼuche. Ndị ukwu nʼetiti ha na-ejikwa aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 26 Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama, onye ọbụla nʼetiti unu chọrọ ịbụ onyeisi, ga-ebu ụzọ bụrụ onye na-ejere unu niile ozi. 27 Ma onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu ga-abụ ohu unu niile. 28 Ọ bụladị dị ka Nwa nke Mmadụ na-abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.” 29 Mgbe ha na-ahapụ Jeriko, ọtụtụ igwe mmadụ sooro ya nʼazụ. 30 Ndị ìsì abụọ nọ nʼakụkụ ụzọ ahụ. Mgbe ha nụrụ na ọ bụ Jisọs na-abịa, ha malitere iti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 31 Igwe mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ ha. Ma ndịisi ahụ nọgidesịrị ike na-eti mkpu nʼoke olu na-asị, “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32 Mgbe Jisọs bịaruru nʼebe ha nọ, o guzoro kpọọ ha, jụọ ha sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33 Ha zara sị ya, “Onyenwe anyị, biko, anyị chọrọ ka i mee ka anyị hụ ụzọ.” 34 Jisọs nwere ọmịiko nʼahụ ha. O metụrụ ha aka nʼanya. Ngwangwa ha bidoro ịhụ ụzọ, ma sorokwa ya.

In Other Versions

Matthew 20 in the ANGEFD

Matthew 20 in the ANTPNG2D

Matthew 20 in the AS21

Matthew 20 in the BAGH

Matthew 20 in the BBPNG

Matthew 20 in the BBT1E

Matthew 20 in the BDS

Matthew 20 in the BEV

Matthew 20 in the BHAD

Matthew 20 in the BIB

Matthew 20 in the BLPT

Matthew 20 in the BNT

Matthew 20 in the BNTABOOT

Matthew 20 in the BNTLV

Matthew 20 in the BOATCB

Matthew 20 in the BOATCB2

Matthew 20 in the BOBCV

Matthew 20 in the BOCNT

Matthew 20 in the BOECS

Matthew 20 in the BOGWICC

Matthew 20 in the BOHCB

Matthew 20 in the BOHCV

Matthew 20 in the BOHLNT

Matthew 20 in the BOHNTLTAL

Matthew 20 in the BOILNTAP

Matthew 20 in the BOITCV

Matthew 20 in the BOKCV

Matthew 20 in the BOKCV2

Matthew 20 in the BOKHWOG

Matthew 20 in the BOKSSV

Matthew 20 in the BOLCB

Matthew 20 in the BOLCB2

Matthew 20 in the BOMCV

Matthew 20 in the BONAV

Matthew 20 in the BONCB

Matthew 20 in the BONLT

Matthew 20 in the BONUT2

Matthew 20 in the BOPLNT

Matthew 20 in the BOSCB

Matthew 20 in the BOSNC

Matthew 20 in the BOTLNT

Matthew 20 in the BOVCB

Matthew 20 in the BOYCB

Matthew 20 in the BPBB

Matthew 20 in the BPH

Matthew 20 in the BSB

Matthew 20 in the CCB

Matthew 20 in the CUV

Matthew 20 in the CUVS

Matthew 20 in the DBT

Matthew 20 in the DGDNT

Matthew 20 in the DHNT

Matthew 20 in the DNT

Matthew 20 in the ELBE

Matthew 20 in the EMTV

Matthew 20 in the ESV

Matthew 20 in the FBV

Matthew 20 in the FEB

Matthew 20 in the GGMNT

Matthew 20 in the GNT

Matthew 20 in the HARY

Matthew 20 in the HNT

Matthew 20 in the IRVA

Matthew 20 in the IRVB

Matthew 20 in the IRVG

Matthew 20 in the IRVH

Matthew 20 in the IRVK

Matthew 20 in the IRVM

Matthew 20 in the IRVM2

Matthew 20 in the IRVO

Matthew 20 in the IRVP

Matthew 20 in the IRVT

Matthew 20 in the IRVT2

Matthew 20 in the IRVU

Matthew 20 in the ISVN

Matthew 20 in the JSNT

Matthew 20 in the KAPI

Matthew 20 in the KBT1ETNIK

Matthew 20 in the KBV

Matthew 20 in the KJV

Matthew 20 in the KNFD

Matthew 20 in the LBA

Matthew 20 in the LBLA

Matthew 20 in the LNT

Matthew 20 in the LSV

Matthew 20 in the MAAL

Matthew 20 in the MBV

Matthew 20 in the MBV2

Matthew 20 in the MHNT

Matthew 20 in the MKNFD

Matthew 20 in the MNG

Matthew 20 in the MNT

Matthew 20 in the MNT2

Matthew 20 in the MRS1T

Matthew 20 in the NAA

Matthew 20 in the NASB

Matthew 20 in the NBLA

Matthew 20 in the NBS

Matthew 20 in the NBVTP

Matthew 20 in the NET2

Matthew 20 in the NIV11

Matthew 20 in the NNT

Matthew 20 in the NNT2

Matthew 20 in the NNT3

Matthew 20 in the PDDPT

Matthew 20 in the PFNT

Matthew 20 in the RMNT

Matthew 20 in the SBIAS

Matthew 20 in the SBIBS

Matthew 20 in the SBIBS2

Matthew 20 in the SBICS

Matthew 20 in the SBIDS

Matthew 20 in the SBIGS

Matthew 20 in the SBIHS

Matthew 20 in the SBIIS

Matthew 20 in the SBIIS2

Matthew 20 in the SBIIS3

Matthew 20 in the SBIKS

Matthew 20 in the SBIKS2

Matthew 20 in the SBIMS

Matthew 20 in the SBIOS

Matthew 20 in the SBIPS

Matthew 20 in the SBISS

Matthew 20 in the SBITS

Matthew 20 in the SBITS2

Matthew 20 in the SBITS3

Matthew 20 in the SBITS4

Matthew 20 in the SBIUS

Matthew 20 in the SBIVS

Matthew 20 in the SBT

Matthew 20 in the SBT1E

Matthew 20 in the SCHL

Matthew 20 in the SNT

Matthew 20 in the SUSU

Matthew 20 in the SUSU2

Matthew 20 in the SYNO

Matthew 20 in the TBIAOTANT

Matthew 20 in the TBT1E

Matthew 20 in the TBT1E2

Matthew 20 in the TFTIP

Matthew 20 in the TFTU

Matthew 20 in the TGNTATF3T

Matthew 20 in the THAI

Matthew 20 in the TNFD

Matthew 20 in the TNT

Matthew 20 in the TNTIK

Matthew 20 in the TNTIL

Matthew 20 in the TNTIN

Matthew 20 in the TNTIP

Matthew 20 in the TNTIZ

Matthew 20 in the TOMA

Matthew 20 in the TTENT

Matthew 20 in the UBG

Matthew 20 in the UGV

Matthew 20 in the UGV2

Matthew 20 in the UGV3

Matthew 20 in the VBL

Matthew 20 in the VDCC

Matthew 20 in the YALU

Matthew 20 in the YAPE

Matthew 20 in the YBVTP

Matthew 20 in the ZBP