Matthew 27 (BOICB)

1 Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya. 2 Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ. 3 Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4 Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.”Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.” 5 Ọ wụsara ego ọlaọcha ahụ nʼala ụlọnsọ, pụọ gaa kwụọ ụdọ. 6 Ndịisi nchụaja tụtụkọtara ego ahụ kwuo sị, “O megidere iwu itinye ego a nʼime ụlọakụ, nʼihi na ọ bụ ego ọbara.” 7 Mgbe ha gbasịrị izu, ha kwekọtara ma were ego ahụ zụta ala nʼaka otu ọkpụ ite. Ha mere ala ahụ ka ọ bụrụ ebe a na-eli ndị ọbịa. 8 Nke a mere e ji na-akpọ ala ahụ, “Ala Ọbara,” ruo taa. 9 Nʼụzọ dị otu a, okwu e kwuru site nʼọnụ Jeremaya onye amụma mezuru. “Ha tụtụkọtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, bụ ọnụahịa onye ahụ, nke ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel kpebiri na a ga-akwụ nʼisi ya. 10 Ha ji ego ahụ zụọ ubi onye ọkpụ ite, dị ka Onyenwe anyị nyere m iwu.” 11 Nʼoge a Jisọs guzo nʼihu gọvanọ. Gọvanọ jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?”Jisọs sịrị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 12 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro ya ebubo ụgha, o kwughị ihe ọbụla. 13 Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?” 14 Ma ọ zaghị ọ bụladị otu mkpụrụ okwu nʼebubo ndị ahụ. Ihe a gbagwojuru gọvanọ anya nke ukwuu. 15 Ugbu a, ọ bụ omenaala gọvanọ nʼoge mmemme na ọ ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye igwe mmadụ họọrọ. 16 Ma nʼoge a e nwere otu onye mkpọrọ nke ọtụtụ mmadụ maara nke ọma. A na-akpọ Jisọs Barabas. 17 Mgbe igwe mmadụ niile zukọrọ, Pailet sịrị ha, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ bụ Jisọs Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?” 18 Nʼihi na ọ maara nke ọma na ọ bụ site nʼekworo ka ha ji rara Jisọs nye nʼaka ya. 19 Mgbe ọ nọkwasịrị nʼelu oche ikpe ya, nwunye ya zitere ozi sị ya, “Wepụkwa aka gị nʼihe gbasara nwoke onye ezi omume ahụ. Nʼihi na ahụjuru m anya na nrọ nʼabalị gara aga nʼihi ya.” 20 Ma ndịisi nchụaja na ndị okenye kwagidere igwe mmadụ ahụ ka ha rịọ ya, ka ọ hapụrụ ha Barabas, ma nye ha Jisọs ka ha gbuo ya. 21 Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?”Ha sịrị, “Barabas!” 22 Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” 23 Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?”Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 24 Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” 25 Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!” 26 Mgbe ahụ ọ hapụụrụ ha Barabas. Mgbe ọ pịachara Jisọs ihe, ọ raara ya nye ka ha kpọgide ya nʼobe. 27 Mgbe ahụ ndị agha gọvanọ duuru Jisọs baa nʼogige ụlọ ndị agha, mee ka otu ndị agha niile gbaa ya gburugburu. 28 Ha yipụrụ ya uwe ya, yinye ya uwe mwụda na-acha uhie uhie. 29 Ha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi. Ha tinyekwara ya mkpara achara nʼaka nri, gbuo ikpere nʼala nʼihu ya, na-akwa ya emo na-asị, “Ekele, Eze ndị Juu!” 30 Ha gbụrụ ya ọnụ mmiri asọ, werekwa osisi ahụ kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe. 31 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe. 32 Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, “ebe okpokoro isi”). 34 Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35 Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 36 Ha nọdụkwara ala nʼebe ahụ na-eche ya nche. 37 Nʼelu ebe isi ya dị, ka ha debere ihe ha dekwasịrị ebubo ha boro ya. Nke a bụ ihe ha dere:Onye a bụ Jisọs, Eze ndị Juu. 38 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe. Otu onye nʼaka nri, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 39 Ndị na-agafe nʼụzọ na-ekwutọ ya, na-efufekwa isi ha, 40 na-asịkwa, “Leenụ onye nwere ike ịkwatu ụlọnsọ Chineke wughachi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ! Zọpụtanụ onwe gị! Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke si nʼelu obe ahụ rịdata!” 41 Ndịisi nchụaja, ndị ozizi iwu na ndị okenye sokwa na-eme ya ihe ọchị, na-asị, 42 “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ eze ndị Izrel; ya si nʼelu obe rịdata ugbu a, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43 Ọ tụkwasịrị Chineke obi, ọ bụrụ na ọ masịrị Chineke, ya napụta ya ugbua, nʼihi na o kwuru sị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke. ’ ” 44 Ọ bụladị ndị ohi ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 45 Ma site nʼelekere iri na abụọ nke ehihie ruo nʼelekere atọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. 46 Nʼoge dị ka elekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani?” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 47 Mgbe ụfọdụ ndị guzo nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Ọ na-akpọ Ịlaịja.” 48 Nʼotu oge ahụ kwa otu onye nʼime ha gbaara ọsọ were ogbo denye ya na mmanya gbara ụka, fanye ya nʼosisi, welie ya elu, chee ya ka ọ ṅụọ. 49 Ma ndị ọzọ sịrị, “Hapụnụ, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa ịzọpụta ya.” 50 Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. 51 Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. 52 Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. 53 Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. 54 Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!” 55 Ọtụtụ ụmụ nwanyị nọ nʼebe ahụ, ndị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme. Ha si Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi. 56 Nʼime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jemis na Josef, na nne ụmụ Zebedi. 57 Mgbe o ruru anyasị, otu onye ọgaranya si Arimatia aha ya bụ Josef. Onye ya onwe ya bụkwa onye na-eso ụzọ Jisọs, 58 jekwuuru Pailet rịọọ ya ka e bunye ya ozu Jisọs. Pailet nyere iwu ka e bunye ya ozu ahụ. 59 Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya, 60 ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa. 61 Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ. 62 Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet. 63 Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị. 64 Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.” 65 Pailet gwara ha sị, “Unu nwere otu ndị agha na-eche nche, kpọrọnụ ha gaa mechisie ili ahụ ike dị ka unu si maara eme.” 66 Ya mere, ha kpọrọ ndị agha gaa mechizie ọnụ ili ahụ. Ha kakwara akara nʼelu nkume ahụ.

In Other Versions

Matthew 27 in the ANGEFD

Matthew 27 in the ANTPNG2D

Matthew 27 in the AS21

Matthew 27 in the BAGH

Matthew 27 in the BBPNG

Matthew 27 in the BBT1E

Matthew 27 in the BDS

Matthew 27 in the BEV

Matthew 27 in the BHAD

Matthew 27 in the BIB

Matthew 27 in the BLPT

Matthew 27 in the BNT

Matthew 27 in the BNTABOOT

Matthew 27 in the BNTLV

Matthew 27 in the BOATCB

Matthew 27 in the BOATCB2

Matthew 27 in the BOBCV

Matthew 27 in the BOCNT

Matthew 27 in the BOECS

Matthew 27 in the BOGWICC

Matthew 27 in the BOHCB

Matthew 27 in the BOHCV

Matthew 27 in the BOHLNT

Matthew 27 in the BOHNTLTAL

Matthew 27 in the BOILNTAP

Matthew 27 in the BOITCV

Matthew 27 in the BOKCV

Matthew 27 in the BOKCV2

Matthew 27 in the BOKHWOG

Matthew 27 in the BOKSSV

Matthew 27 in the BOLCB

Matthew 27 in the BOLCB2

Matthew 27 in the BOMCV

Matthew 27 in the BONAV

Matthew 27 in the BONCB

Matthew 27 in the BONLT

Matthew 27 in the BONUT2

Matthew 27 in the BOPLNT

Matthew 27 in the BOSCB

Matthew 27 in the BOSNC

Matthew 27 in the BOTLNT

Matthew 27 in the BOVCB

Matthew 27 in the BOYCB

Matthew 27 in the BPBB

Matthew 27 in the BPH

Matthew 27 in the BSB

Matthew 27 in the CCB

Matthew 27 in the CUV

Matthew 27 in the CUVS

Matthew 27 in the DBT

Matthew 27 in the DGDNT

Matthew 27 in the DHNT

Matthew 27 in the DNT

Matthew 27 in the ELBE

Matthew 27 in the EMTV

Matthew 27 in the ESV

Matthew 27 in the FBV

Matthew 27 in the FEB

Matthew 27 in the GGMNT

Matthew 27 in the GNT

Matthew 27 in the HARY

Matthew 27 in the HNT

Matthew 27 in the IRVA

Matthew 27 in the IRVB

Matthew 27 in the IRVG

Matthew 27 in the IRVH

Matthew 27 in the IRVK

Matthew 27 in the IRVM

Matthew 27 in the IRVM2

Matthew 27 in the IRVO

Matthew 27 in the IRVP

Matthew 27 in the IRVT

Matthew 27 in the IRVT2

Matthew 27 in the IRVU

Matthew 27 in the ISVN

Matthew 27 in the JSNT

Matthew 27 in the KAPI

Matthew 27 in the KBT1ETNIK

Matthew 27 in the KBV

Matthew 27 in the KJV

Matthew 27 in the KNFD

Matthew 27 in the LBA

Matthew 27 in the LBLA

Matthew 27 in the LNT

Matthew 27 in the LSV

Matthew 27 in the MAAL

Matthew 27 in the MBV

Matthew 27 in the MBV2

Matthew 27 in the MHNT

Matthew 27 in the MKNFD

Matthew 27 in the MNG

Matthew 27 in the MNT

Matthew 27 in the MNT2

Matthew 27 in the MRS1T

Matthew 27 in the NAA

Matthew 27 in the NASB

Matthew 27 in the NBLA

Matthew 27 in the NBS

Matthew 27 in the NBVTP

Matthew 27 in the NET2

Matthew 27 in the NIV11

Matthew 27 in the NNT

Matthew 27 in the NNT2

Matthew 27 in the NNT3

Matthew 27 in the PDDPT

Matthew 27 in the PFNT

Matthew 27 in the RMNT

Matthew 27 in the SBIAS

Matthew 27 in the SBIBS

Matthew 27 in the SBIBS2

Matthew 27 in the SBICS

Matthew 27 in the SBIDS

Matthew 27 in the SBIGS

Matthew 27 in the SBIHS

Matthew 27 in the SBIIS

Matthew 27 in the SBIIS2

Matthew 27 in the SBIIS3

Matthew 27 in the SBIKS

Matthew 27 in the SBIKS2

Matthew 27 in the SBIMS

Matthew 27 in the SBIOS

Matthew 27 in the SBIPS

Matthew 27 in the SBISS

Matthew 27 in the SBITS

Matthew 27 in the SBITS2

Matthew 27 in the SBITS3

Matthew 27 in the SBITS4

Matthew 27 in the SBIUS

Matthew 27 in the SBIVS

Matthew 27 in the SBT

Matthew 27 in the SBT1E

Matthew 27 in the SCHL

Matthew 27 in the SNT

Matthew 27 in the SUSU

Matthew 27 in the SUSU2

Matthew 27 in the SYNO

Matthew 27 in the TBIAOTANT

Matthew 27 in the TBT1E

Matthew 27 in the TBT1E2

Matthew 27 in the TFTIP

Matthew 27 in the TFTU

Matthew 27 in the TGNTATF3T

Matthew 27 in the THAI

Matthew 27 in the TNFD

Matthew 27 in the TNT

Matthew 27 in the TNTIK

Matthew 27 in the TNTIL

Matthew 27 in the TNTIN

Matthew 27 in the TNTIP

Matthew 27 in the TNTIZ

Matthew 27 in the TOMA

Matthew 27 in the TTENT

Matthew 27 in the UBG

Matthew 27 in the UGV

Matthew 27 in the UGV2

Matthew 27 in the UGV3

Matthew 27 in the VBL

Matthew 27 in the VDCC

Matthew 27 in the YALU

Matthew 27 in the YAPE

Matthew 27 in the YBVTP

Matthew 27 in the ZBP