Mark 15 (BOICB)

1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet. 2 Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?”Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.” 3 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe. 4 Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.” 5 Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya. 6 Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ. 7 Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ. 8 Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha. 9 Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?” 10 Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya. 11 Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas. 12 Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?” 13 Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!” 14 Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?”Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!” 15 Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe. 16 Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ. 17 Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi. 18 Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.” 19 Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya. 20 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe. 21 Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. 22 Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). 23 Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. 24 Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. 25 Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. 26 Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ:Eze ndị Juu. 27 Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 28 A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. 29 Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. 30 Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” 31 Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! 32 Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya. 33 Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie. 34 Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”). 35 Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!” 36 Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.” 37 Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume. 38 Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya. 39 Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.” 40 O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi. 41 Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem. 42 Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe, 43 Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs. 44 Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla. 45 Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya. 46 Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ. 47 Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.

In Other Versions

Mark 15 in the ANGEFD

Mark 15 in the ANTPNG2D

Mark 15 in the AS21

Mark 15 in the BAGH

Mark 15 in the BBPNG

Mark 15 in the BBT1E

Mark 15 in the BDS

Mark 15 in the BEV

Mark 15 in the BHAD

Mark 15 in the BIB

Mark 15 in the BLPT

Mark 15 in the BNT

Mark 15 in the BNTABOOT

Mark 15 in the BNTLV

Mark 15 in the BOATCB

Mark 15 in the BOATCB2

Mark 15 in the BOBCV

Mark 15 in the BOCNT

Mark 15 in the BOECS

Mark 15 in the BOGWICC

Mark 15 in the BOHCB

Mark 15 in the BOHCV

Mark 15 in the BOHLNT

Mark 15 in the BOHNTLTAL

Mark 15 in the BOILNTAP

Mark 15 in the BOITCV

Mark 15 in the BOKCV

Mark 15 in the BOKCV2

Mark 15 in the BOKHWOG

Mark 15 in the BOKSSV

Mark 15 in the BOLCB

Mark 15 in the BOLCB2

Mark 15 in the BOMCV

Mark 15 in the BONAV

Mark 15 in the BONCB

Mark 15 in the BONLT

Mark 15 in the BONUT2

Mark 15 in the BOPLNT

Mark 15 in the BOSCB

Mark 15 in the BOSNC

Mark 15 in the BOTLNT

Mark 15 in the BOVCB

Mark 15 in the BOYCB

Mark 15 in the BPBB

Mark 15 in the BPH

Mark 15 in the BSB

Mark 15 in the CCB

Mark 15 in the CUV

Mark 15 in the CUVS

Mark 15 in the DBT

Mark 15 in the DGDNT

Mark 15 in the DHNT

Mark 15 in the DNT

Mark 15 in the ELBE

Mark 15 in the EMTV

Mark 15 in the ESV

Mark 15 in the FBV

Mark 15 in the FEB

Mark 15 in the GGMNT

Mark 15 in the GNT

Mark 15 in the HARY

Mark 15 in the HNT

Mark 15 in the IRVA

Mark 15 in the IRVB

Mark 15 in the IRVG

Mark 15 in the IRVH

Mark 15 in the IRVK

Mark 15 in the IRVM

Mark 15 in the IRVM2

Mark 15 in the IRVO

Mark 15 in the IRVP

Mark 15 in the IRVT

Mark 15 in the IRVT2

Mark 15 in the IRVU

Mark 15 in the ISVN

Mark 15 in the JSNT

Mark 15 in the KAPI

Mark 15 in the KBT1ETNIK

Mark 15 in the KBV

Mark 15 in the KJV

Mark 15 in the KNFD

Mark 15 in the LBA

Mark 15 in the LBLA

Mark 15 in the LNT

Mark 15 in the LSV

Mark 15 in the MAAL

Mark 15 in the MBV

Mark 15 in the MBV2

Mark 15 in the MHNT

Mark 15 in the MKNFD

Mark 15 in the MNG

Mark 15 in the MNT

Mark 15 in the MNT2

Mark 15 in the MRS1T

Mark 15 in the NAA

Mark 15 in the NASB

Mark 15 in the NBLA

Mark 15 in the NBS

Mark 15 in the NBVTP

Mark 15 in the NET2

Mark 15 in the NIV11

Mark 15 in the NNT

Mark 15 in the NNT2

Mark 15 in the NNT3

Mark 15 in the PDDPT

Mark 15 in the PFNT

Mark 15 in the RMNT

Mark 15 in the SBIAS

Mark 15 in the SBIBS

Mark 15 in the SBIBS2

Mark 15 in the SBICS

Mark 15 in the SBIDS

Mark 15 in the SBIGS

Mark 15 in the SBIHS

Mark 15 in the SBIIS

Mark 15 in the SBIIS2

Mark 15 in the SBIIS3

Mark 15 in the SBIKS

Mark 15 in the SBIKS2

Mark 15 in the SBIMS

Mark 15 in the SBIOS

Mark 15 in the SBIPS

Mark 15 in the SBISS

Mark 15 in the SBITS

Mark 15 in the SBITS2

Mark 15 in the SBITS3

Mark 15 in the SBITS4

Mark 15 in the SBIUS

Mark 15 in the SBIVS

Mark 15 in the SBT

Mark 15 in the SBT1E

Mark 15 in the SCHL

Mark 15 in the SNT

Mark 15 in the SUSU

Mark 15 in the SUSU2

Mark 15 in the SYNO

Mark 15 in the TBIAOTANT

Mark 15 in the TBT1E

Mark 15 in the TBT1E2

Mark 15 in the TFTIP

Mark 15 in the TFTU

Mark 15 in the TGNTATF3T

Mark 15 in the THAI

Mark 15 in the TNFD

Mark 15 in the TNT

Mark 15 in the TNTIK

Mark 15 in the TNTIL

Mark 15 in the TNTIN

Mark 15 in the TNTIP

Mark 15 in the TNTIZ

Mark 15 in the TOMA

Mark 15 in the TTENT

Mark 15 in the UBG

Mark 15 in the UGV

Mark 15 in the UGV2

Mark 15 in the UGV3

Mark 15 in the VBL

Mark 15 in the VDCC

Mark 15 in the YALU

Mark 15 in the YAPE

Mark 15 in the YBVTP

Mark 15 in the ZBP